Azibaola Robert

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Azibaola Robert
Born (1969-02-13) 13 Febụwarị 1969 (age 55)
NationalityNigerian
OccupationEntrepreneur, Lawyer, human rights and environmental advocate.
Known forEnvironmental advocate

a

Azibaola Robert (amụrụ na 13 Febụwarị 1969) bụ onye ọchụnta ego Naijiria, Fellow nke Nigerian Society of Engineers (NSE), onye mmepụta ihe, onye ọka iwu, onye na-akwado ikike mmadụ na gburugburu ya, onye guzobere Zeetin Engineering Limited, onye isi nchịkwa nke Kakatar Group na onye natara onyinye Vanguard Personality nke afọ ahụ.[1][2][3][4] Robert gụrụ ihe ọmụmụ iwu na Rivers State University of Science and Technology, Portharcourt, (nke bụzi Mahadum Rivers State ) ma a kpọọ ya ka ọ bụrụ onye ọka iwu Naijiria n'afọ 1995.

Mbido ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Robert n'obodo Otakeme, Bayelsa, n'afọ 1969.[5] Ọ gụrụ ihe ọmụmu gbasara iwu na Mahadum Sayensị naTeknụzụ nke Rivas Steet tupu a kpọọ ya n'ụlọikpe Naijiria n'afọ 1995.[6] N'afọ 1999, Robert guzobere Mangrovetech Limited, ụlọ ọrụ injinia nke gbanwere ma bụrụzie Kakatar.[7] N'afọ 2018, Azibaola guzobere Zeetin Engineering iji mepụta teknụzụ dị elu na ngwá ọrụ dị arọ iji mepụta ụgbọala eletrik mbụ na Naịjirịa.[8] Mgbe e mesịrị, Nigerian Society of Engineers nyere ya Fellow nke otu ahụ.[9] N'afọ 2021, ọ malitere mkpọsa iji chekwaa oké ọhịa na anụ ọhịa ha na mba ya.[10] Ọ duziri Niger Delta Human and Environmental Rescue Organisation (ND-HERO) iji kwado udo na ikpe ziri ezi nke gburugburu na mpaghara Niger Delta. N' afọ 1993, Robert jere ozi dị ka osote onye isi oche NANS. Ọ bụ nwa nwanne nne Goodluck Jonathan, onye bụbu onye isi ala nke mba Naịjirịa.[11]

Njem ịbanye n'ọhịa Niger-delta[dezie | dezie ebe o si]

Azibaola napụtara Nile Monitor Lizard n'oge njem ụbọchị 14 ya n'ime oké ọhịa dị omimi

Azibaola na ndị otu ya gara njem ụbọchị iri na anọ n'ime otu oké ọhịa miri emi nke Niger Delta iji gosipụta ihe ndekọ ọdịdị, nchekwa, na mmetụta nke mgbanwe ihu igwe n'ihe ekere eke n'ihi omume ọjọọ ndị bi n'ogbe ahụ na-eme na gburugburu site n'ịchọ imekọ ihe ọnụ ya na ndị ihe gbasara gburugburu na ndụ na-anụ ọkụ n'obi ,ndị gọọmentị, na òtù ndị na-arụkọ ọrụ. Ihe nkiri e mekọbara awa abụọ gosipụtara akụkọ ndị be ya na ibi na iyi ha. Njem nchọpụta ahụ bụ njem kilomita 25 site na mmepeanya mmadụ, ebe ndị otu ahụ gara ihe karịrị kilomita 400 iji nyochaa ọhịa ahụ.[12][13]

Arụmụka/Ndọrọndọrọ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2016, Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Robert na ụlọ ọrụ ya One Plus Holding Limited ụlọ ikpe n' ebubo asaa maka ịnata na ijide ego nde $ 40 site n'Ọfịs nke onye bụbu onye ndụmọdụ nchekwa mba [NSA], Col. Sambo Dasuki ma tụgharị ego a maka iji gboo mkpa onwe. E mechara ụlọ ikpe dị elu nke gọọmentị etiti n' Abuja tọhapụrụ ya ma sị ya laa,.[14][15]

Dị ka Nigerian Tribune si kwuo, Justice Nnamdi Dimgba nke Ụlọikpe gọvmentị etiti n' Abuja, bụ onye kwupụtara ikpe ahụ sị, na EFCC enyeghị ihe akaebe zuru ezu maka ebubo ịnata ego site n'aka Sambo Mohammed Dasuki na-enweghị nkwekọrịta ọrụ ọ bụla.[16] E mechara wega ikpe ahụ n'ụlọ mkpegharị ikpe nke Naijiria, ebe otu mmadụ atọ nke Ọkaikpe Stephen Adah duziri, kpebiri na amamikpe ahụ ezipụtaghị ihe akaebe iji maa ndi sị na ikpe amaghị ha ikpe.[17]

Ebe nrụọrụ weebụ gọọmentị

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Bankole (2022-05-20). [Vanguard Awards Azibaola Robert: Lawyer with engineer’s DNA paves way for Nigeria’s dream vehicles] (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-10-15.
  2. Robert Azibaola: Saving Bayelsa’s rainforests (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-06-26). Retrieved on 2022-12-30.
  3. Africa (2022-07-28). Environmentalist Azibaola Robert calls for the protection of wildlife and climate change (en-US). Ventures Africa. Retrieved on 2022-10-15.
  4. Nwafor (2022-02-27). Vanguard’s award means a lot to us as a company- Azibaola Robert, ZEETIN founder (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-10-15.
  5. Azibaola Robert: from Lawyer to Inventor – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-10-15.
  6. Azibaola becomes fellow of Nigeria Society of Engineers (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-01-04). Retrieved on 2022-10-15.
  7. Rapheal (2022-06-04). Robert Azibaola, Chairman, Kakatar Group Limited: Why I want to produce first Nigerian excavator (en-us). The Sun Nigeria. Retrieved on 2022-10-15.
  8. Rapheal (2021-09-06). Azibaola Robert: From Bar to electric car manufacturing (en-us). The Sun Nigeria. Retrieved on 2022-10-15.
  9. Why NSE Honoured Azibaola Robert – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-10-15.
  10. Impact of non-renewable energy on health and the ecosystem. IPPMedia. Retrieved on 19 July 2022.
  11. Jonathan’s Cousin Opens Defence in Alleged $40m Fraud Suit – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-10-15.
  12. Robert Azibaola: Saving Bayelsa’s rainforests (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-06-26). Retrieved on 2022-12-30.
  13. Azibaola Robert’s Expedition into Niger Delta Forests – THISDAYLIVE. www.thisdaylive.com. Retrieved on 2022-12-30.
  14. Yahaya (2019-05-27). Court acquits ex-President Jonathan’s cousin of $40 million fraud (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2022-10-15.
  15. Daniels (2019-03-28). Alleged $40m fraud: Azibola, Jonathan’s cousin knows fate May 27 (en-us). The Sun Nigeria. Retrieved on 2022-10-15.
  16. Online (2019-05-27). Court frees Jonathan's cousin, Azibaola of FG's $40m contract scam charge (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2023-02-06.
  17. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. www.premiumtimesng.com. Retrieved on 2023-02-06.