Azza Soliman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Azza Soliman
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Aha enyereAzza Dezie
aha ezinụlọ yaSoliman Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1968 Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, onye na-akwado ikike mmadụ Dezie

Azza Soliman (Arabic; amụrụ n'afọ 1966) bụ onye ọka iwu Ijipt n' onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru ụmụ nwanyị. O guzobere Centre for Egyptian Women's Legal Assistance (CEWLA), otu na-eme mkpọsa maka ịha nhata nke ụmụ nwanyị, na-ekwusi ike n' ikpe ziri ezi na mmezigharị nke iwu ịkpa ókè. E jidere ya ma kpụpụ ya ọtụtụ ugboro. N' afọ 2015, ọ gbara akaebe banyere ọnwụ nke onye na-eme ngagharị iwe, Shaimaa al-Sabbagh (onye ndị uwe ojii Ijipt gburu). Soliman enweela mmegwara, gụnyere usoro ego.

Soliman bụ akụkụ nke Amnesty International's Brave Campaign, nke na-akpọ maka nkwenye na nchebe nke ndị na-agbachitere ikike mmadụ gburugburu ụwa.

A mụrụ ya na 1966, n' ezinụlọ ụmụnne nwanyị ise n' ụmụnne nwoke atọ, nna Soliman gbara ya ume ịmụ ihe. Ọ ghọrọ onye ọka iwu n' onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na Egypt.[1] N' afọ 1995, o guzobere Centre for Egyptian Women's Legal Assistance (CEWLA).[2] Site na 1997, CEWLA mejupụtara mmemme ọzụzụ na mmata iwu n' okwu nke ịha nhata nwoke na nwanyị. Òtù a na-abụghị nke gọọmentị na-emekwa ọmụmụ ihe ma na-ahazi nkwukọrịta na isiokwu ndị dị ka ime ihe ike megide ụmụ nwanyị, igbu ọchụ nsọpụrụ, igbu ọkpụkpụ akụkụ ahụ nwanyị, khul (usoro nke nwanyị nwere ike ịgba di ya alụkwaghịm na Islam), nkọwa iwu nke iwu Sharia, wdg.[3][4][5]

N' afọ 2010, ọnọdụ mmekọrịta mmadụ n'

ibe ya na ndọrọ ndọrọ ọchị chị n'Ijipt gbanwere ngwa ngwa na-esote mgbanwe ọchịchị Ijipt nke afọ 2011. Soliman katọrọ ihe isi ike ụmụ nwanyị na-achọ isonye na ngagharị iwe na- eme n'okporo ámá na ogige. O kwuru banyere mmegbu ụmụ nwanyị na-e nye n'ime nnupụisi ahụ.[6]

Na Jenụwarị 2015, mgbe ọ nọ n' elu ụlọ oriri na ọṅụṅụ, Soliman hụrụ mwakpo nke ndị uwe ojii kpuchiri ihu ha na ngagharị iwe udo na-echeta ncheta afọ nke anọ nke nnupụisi nke Jenụwarụwarị 25, 2011 ("The Day of Anger"). Ọ hụrụ onye na-eme ngagharị iwe, Shaimaa al-Sabbagh, nke ndị uwe ojii gbara egbe nwụọ.[7][8][9] Mgbe ọdachi a gasịrị, Soliman ji aka ya gaa n' Ọfịs onye ọkàiwu iji gbaa akaebe banyere ọnwụ Shaimaa El Sabbagh n'oge ndị uwe ojii gbasara ngagharị iwe ahụ. O kwusiri ike na ndị uwe ojii na-arụ ọrụ, ma tinye mkpesa megide Minista nke Interior na ndị ọrụ nchekwa. Onye ọkàiwu gbara ya ajụjụ ọnụ wee gwa ya na e tinyere mkpesa megide ya na ndị akaebe anọ ndị ọzọ maka "nzukọ iwu na-akwadoghị" na "ekere òkè na ngagharị iwe nchekwa ọha na eze", n' agbanyeghị n' o sonyeghị na ngagharịiwe ahụ. Na Machị 23, 2015, e boro ya ebubo, ya na mmadụ iri na isii ndị ọzọ, maka "mkpesa na-enweghị ikike" na "mebi nchekwa na usoro ọha na eze". N' abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Mee n'afọ 2015, ụlọ ikpe ahụ wepụrụ ebubo ndị e boro ha, ikpe a kwadoro n'ọnwarị n'otu afọ ahụ site n' ụlọ ikpe mkpegharị ikpe, ebe Crown rịọrọ arịrịọ maka mkpebi mbụ ahụ.[10]

Ihe nrite Allard e nyere Soliman na 2017

N' abalị iri na itoolu n' ọnwa Nọvemba n' afọ 2016, a malitere usoro mmegwara ọhụrụ megide ya. Mgbe ọ na-aga Jọdan iji sonye na 'Musawah', otu zuru ụwa ọnụ maka ịha nhata na ikpe ziri ezi n' ezinụlọ ndị Alakụba, nke ndị inyom "na-achọ iweghachite Islam na kor'an maka onwe ha", ndị uwe ojii ọdụ ụgbọ elu gbochiri Soliman ịhapụ mba ahụ.

N' oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ụlọ akụ ya kwụsịrị akaụntụ ya yana nke ụlọ ọrụ iwu ya. Izu abụọ ka e mesịrị, na mbido Disemba, ndị uwe ojii jidere ya, kpọga ya n' ụlọ ọrụ ndị uwe ojii wee gaa n' ọfịs onye majie na-enyocha maka ajụjụ ọnụ. E boro ya ebubo na ọ dabara n'okpuru iwu ọhụrụ gbasara òtù ndị na-abụghị gọọmentị (NGOs), na-amachibido NGO ịnata enyemaka site na mba ofesi. Ụlọ ikpe kwadoro ebubo ndị a na Disemba 14, 2016, a machibidoro Soliman ịhapụ mba ahụ n' akụ ya. A haziri otu nkwado iji kwado ya.[1][2][11]

E nyere Khadija Ismayilova onyinye Allard maka "obi ike pụrụ iche n' idu ndú n'ịlụso nrụrụ aka ọgụ maọbụ ichebe ikike mmadụ" n' afọ 2017. Soliman bụ onye ikpeazụ ma nata aha nsọpụrụ.[12]

  1. 1.0 1.1 Azza Soliman, le féminisme entravé. Liberation.fr. Retrieved on 29 October 2018.
  2. 2.0 2.1 Feminist activist allegedly taken from her home by security forces in Egypt. Nytlive.nytimes.com (7 December 2016). Archived from the original on 18 October 2017. Retrieved on 29 October 2018.
  3. Center for Egyptian Women's Legal Assistance (CEWLA). Archived from the original on 2016-06-09. Retrieved on 2018-10-29.
  4. Sara Hossain, Honour: Crimes, Paradigms and Violence Against Women (Zed Books, 2005), p. 137-138
  5. Nathalie Bernard-Maugiron, 'Women and marriage breakdown in Egypt' (2007) in African Studies Papers, p. 187-188
  6. Fahim. Egyptian Vigilantes Crack Down on Abuse of Women. Nytimes.com. Retrieved on 29 October 2018.
  7. Kingsley. "Female protester's death prompts rare condemnation in Egyptian state media", The Guardian, 26 January 2015. Retrieved on 29 October 2018.
  8. In Egypt: Human rights lawyer Azza Soliman persecuted for witnessing a crime - Daily News Egypt. Dailynewsegypt.com (30 May 2015). Retrieved on 29 October 2018.
  9. Égypte: Shaimaa al Sabbagh, icône d'une révolution assassinée. Lefigaro.fr (25 January 2015). Retrieved on 29 October 2018.
  10. Egypt: Acquittal of Ms. Azza Soliman, human rights lawyer and founder of the Centre for Egyptian Women Legal Aid (CEWLA). Worldwide Movement for Human Rights. Retrieved on 29 October 2018.
  11. Arrest of leading Egyptian feminist Azza Soliman sparks anger. Archived from the original on 2018-09-26. Retrieved on 2018-10-29.
  12. Dhillon. "Azerbaijani journalist Khadija Ismayilova wins 2017 Allard Prize", The Globe and Mail, September 28, 2017. Retrieved on November 5, 2018.