Badamasi Maccido

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Badamasi Maccido
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1961 Dezie
Ebe ọmụmụSokoto steeti Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya29 Ọktoba 2006 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Federal Government College, Sokoto Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Nigeria People's Party Dezie

Badamasi Maccido (1961 – 29 Ọktoba 2006). A hoputara ya dịka Federal Senator maka Sokoto North constituency nke Sokoto State, Nigeria na April 2003 n'otu pati All Nigeria People's Party (ANPP). Ọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'ọnwa Ọktoba, n'afọ 2006.

A mụrụ Maccido na 1961, nwa Sultan nke Sokoto, Alhaji Muhammadu Maccido, o wee gaa akwụkwọ na Federal Government College, Sokoto . Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello, Zaria ma nwete nzere Bsc na Building Engineering. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye kọmishọna steeti Sokoto n'ọchịchị Gọvanọ Attahiru Bafarawa . [1]

A hoputara Maccido dịka Senator nke Sokoto North, o were oche ya na Mee 2003. [2] N'April 2005 ụlọ ọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) kpụpụrụ Maccido na ndị ọzọ maka itinye aka n'akwụkwọ ebubo nrụrụ aka na mmefu ego nde naịra iri ise na ise. Ebokwara onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu Sineti Adolphus Wabara na onye bụbu minista mmụta Fabian Osuji . [3] Ekwuru na ha chọrọ, nata ma kesaa nde naira iri ise na ise iji kwado nbibi nke akwụkwọ ozi Education Ministry. Ka a gbatịchara ọgụ gbasara iwu, n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun n'afọ 2010 otu zuru oke nke Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja kagburu ebubo niile eboro, wepụta ma tọhapụ onye eboro ebubo. N'ihe banyere Maccido, a tọhapụrụ ya mgbe ọ nwụsịrị. [4]

Maccido nwụrụ n'ihe mberede ụgbọ elu ADC Airlines Flight 53 ya na nna ya na nwa ya nwoke, Umaru, na 29 Ọktoba 2006. [5] Ụgbọelu a, nke e kwuru na ọnọghị n'ọnọdụ dị mma, dara n'oké ifufe obere oge ka ọ fepụchara. [6]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Joseph Ushigiale (2005-03-23). The Indicted Men. ThisDay. Retrieved on 2010-06-26.
  2. Senators. Dawodu. Archived from the original on 20 July 2010. Retrieved on 2010-06-26.
  3. ICPC arraigns Wabara, Osuji, others•As Obasanjo picks replacements for sacked ministers. Daily Champion (April 13, 2005). Retrieved on 2010-06-26.
  4. AHURAKA YUSUF (13 June 2010). Wabara's Seven Years To Recovery. Leadership. Archived from the original on 13 July 2011. Retrieved on 2010-06-26.
  5. Yet Another Air Tragedy. Nigerian Newsday. Archived from the original on 2011-07-27. Retrieved on 2010-06-26.
  6. Nigerian sultan among crash dead. BBC News (29 October 2006). Retrieved on 2010-06-26.