Baladi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Baladi (Arabic: بلدي baladī; nnọchiaha 'nke obodo', 'ọnụmara', "ime ime obodo", nke a pụrụ iji tụnyere ndị Bekee, nke nwere nkọwa dị ala) nwere ịna akọwa maka ụdị egwu ndị Ijipt, ụdị egwu akụkọ nke ndị Egypt (Raqs Balad), maọbụ Masmoudi Sogheir rhythm, bụ nke e jiri ya mee ihe ugboro na egwu baladi. A na-asụkwa ya mgbe ụfọdụ n'asụsụ Bekee dịka 'beledi' maọbụ 'baladee'.

N'Ijipt, okwu baladi anaghị emetụta naanị egwu na ịgba egwú, ọ pụkwara imetụta ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-ewere dịka obodo, ime obodo maọbụ ọdịnala, dịka achịcha baladi' maọbụ 'Aish Baladi'. A na-etinyekwa ya n'ụdị nri na ọkachasị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị si n'ime ime obodo.

Egwú na ịgba egwú Baladi[dezie | dezie ebe o si]

Baladi pụtara 'nke mba' ma bụrụ ụdị ịgba egwú ọdịnala ndị Ijipt site na mmalite narị afọ nke 20 nke ka na-ewu ewu. Ya mere, Ijipt Beledi pụtara nke mba Ijipti'.[1] O mere mgbe ndị ọrụ ugbo kwagara n'obodo ahụ wee malite ịgba egwú na obere oghere. Ndị Ijipt nwere ndị Baladi, achịcha Balada, rhythms Balad, egwu Balati na ịgba egwu baladi.[2][3]

Baladi nwere ike iwere ụdị abụ ọdịnala, ọtụtụ mgbe na-enwe usoro ngalaba-abụ . ụfọdụ na ihe atụ ndị a ma ama gụnyere "That il Shibbak" na "Hassan ya Koulli". E nwekwara ụdị egwu a na-akpọ improvised n'ụdị baladi.

Nri Baladi[dezie | dezie ebe o si]

Na ụfọdụ mba ndị dị n'Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a na-ere ụfọdụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ma kpọsaa ha dịka ngwaahịa "baladi", ya bụ, nke sitere n'okike, ọhụrụ, ndị a zụlitere na ndị abụghị aghawuru aghawu, nke a naghị ere mkpụrụ va na nke a ma na ya na ahịa ndị ọrụ ugbo ma nwee ihe ngosi ma ọ bụ ihe oriri pụrụ iche, dịka fan-like baladi eggplant, maọbụ obere balad cucumber nke nwere ntutu nke ejiri maka pickling. Eish baladi ma ọ bụ aish bladi bụ achịcha dị larịị nke Ijipt nke yiri pita.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Egwú ndị Ijipt
  • Egwú afọ
  • Egwú nke Ijipt
  • Rhythm na egwu Arabic

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Overview of Belly Dance: Egyptian Folkloric style belly dancing. www.atlantabellydance.com. Retrieved on 2017-12-27.
  2. "Learn Bellydance Styles: Egyptian Baladi - Bellydance U", Bellydance U, 2015-08-01. Retrieved on 2017-12-27. (in en-US)
  3. Elliot. "Baladi" by Hossam Ramzy. www.shira.net. Retrieved on 2017-12-27.