Bethlehem Tilahun Alemu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bethlehem Tilahun Alemu
Bethlehem Tilahun Alemu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEthiopia Dezie
Aha enyereBethlehem Dezie
aha ezinụlọ yaAlemu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980 Dezie
Ebe ọmụmụAddis Ababa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego Dezie
onye were ọrụSoleRebels Dezie
ebe agụmakwụkwọUnity University Dezie
affiliation stringsoleRebels Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ájá ájá Dezie
so naFII 6th Edition in Riyadh Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Bethlehem Tilahun Alemu (amụrụ n'afọ 1980) bụ onye ọchụnta ego Etiopia, onye guzobere bụrụkwa onye isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ SoleRebels, "ụlọ ọrụ akpụkpọ ụkwụ na-eto ngwa ngwa n'Africa". Betlehem enwetala nsọpụrụ na otuto maka amamihe azụmahịa o nwere, yana mbọ ọ na-agba iji gbanwee okwu gbasara Afrịka site na ịda ogbenye gaa na mmụọ ọchụnta ego nke kọntinent ahụ, isi obodo, na ikike akụ na ụba.[1] Bethlehem malitere "The Republic of Leather", na-emepụta ihe ndị dị oké ọnụ ahịa na-adịgide adịgide eji akpụkpọ anụ mee, ya na ụlọ ahịa "Garden of Coffee" iji kwalite kọfị ndị Etiopia.[2][3]

Mbido Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Betlehem na mpaghara Zenebework nke Addis Ababa. Nne na nna ya rụrụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ dị n'ógbè ahụ. Alemu gara ụlọ akwụkwọ ọtaakara na sekọndrị nke gọọmenti nwoe, wee gaa n'ihu gụọ mgbakọ na mwepụ ego na Mahadum Unity, gụsịa akwụkwọ n'afọ 2004.[4]

Bethlehem bụ nwanyị ọchụnta ego Afrịka mbụ kwuru okwu na Clinton Global Initiative nke African Business Awards nyekwara nturu ugo, kpọọ ya Outstanding African Business Woman n'afọ 2011.[5]

Na mbido afọ 2005, Bethlehem guzobere soleRebels iji nye ndị obodo ya ọrụ na-adịgide adịgide. Ebe Ọ hụrụ na ọtụtụ ndị omenkà nwere nkà na obere obodo ya bụ Zenebework enweghị ọrụ, ọ chọzie ka O gosipụta nkà ha ma sikwa òtù a nye ha ọrụ.










ya ọrụ.

A na-eji ụ́kwụ́ ụgbọ ala a rụgharịrị arụgharị eme okpuru akpụkpọ ụkwụ ndị ha na-arụ. Taa, ụlọ ọrụ ahụ nwere ọtụtụ ụlọ ahịa n'ụwa gbaa gburugburu nke gụnyere na Ethiopia, Singapore, Switzerland na Taiwan.[6]

Afọ juru Betlehem ikwu na O mechara hiwe ụlọ azụmahịa gazuru ụwa ọnụ dịka soleRebels na Garden of Coffee.

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ ahụ malitere site na ụlọ ọrụ dị na ótù nkewapúta ala nke nne nne Betlehem nwere na Zenebework.

Taya maka akpụkpọ ụkwụ

SoleRebels enweela ọganihu, ma tolite nke inwe ndị ọrụ dị narị atọ n'ọnụ ọgụ na Ethiopia, na arụpụta ngwa ahịa a na-ekesa na mba iri atọ n'ụwa niile, na-eresi ndị na-eme ngwá nri Whole Foods, Urban Outfitters na Amazon.[7] Ha nwekwara atụmatụ imeghe ụlọ ahịa ndị ụlọ ọrụ ya nwe na mba ndị dika Austria, Switzerland, Taiwan, na UK.[8] Betlehem chọrọ ịmepụta ọrụ a na-akwụ ụgwọ nke ọma nke nwere ike ịmepụta ọganihu site na iji nkà ndị ọrụ aka na ihe ndị sitere n'ọnatarachi nke Etiopia. Echiche ịhọrọ akpụkpọ ụkwụ dị ka ngwaahịa mmalite nke ụlọ ọrụ ahụ bịara mgbe e mesịrị. Ihe cheere Bethlehem aka mgba mgbamume bụ seleate maọbụ ị kpọọ ya barabasso, nke bụ akpụkpọ ụkwụ e si na taya emegharịrị emegharị wee mepụta, nke a na-ejighi ngwá ọrụ ọgbaraọhụrụ mepụta na Etiopia, nke gụziri ya agụụ ime ka ihe ọ ga-arụpụta bụrụ nke ga-esi na akpụkpọ anụ.[8]

N'afọ 2016, ụlọ ọrụ ahụ rere akpụkpọ ụkwụ dị puku otu narị na iri abụo na ise n'ọnụ ọgụ ma kepụta ọrụ dị ótù puku na narị abụọ.[3]

N'afọ 2014, Bethlehem kwupụtara aha ọhụrụ ọ ga-akpọ ụlọ azụmahịa ya nke bụ The Republic of Leather, site na ihe O deputara na websaịt ụlọ ọrụ ya bụ Rebels. Bethlehem kọwapụtara ngalaba nke iji akpụkpọ anụ mepụta ngwá ahịa dị oké ọnụ ahịa dịka "ndị tozuru etozu maọbu nke oge ya rurula maka imezigharị n'ozuzu oke," sikwa n'otu aka ahụ kwupụta ihe ndị dị iche iche O jirila soleRebels mepụta n'ịrụ akpụkpọ ụkwụ. E wezụga ịgbaso ụkpụrụ nke emeputaghị ihe ndị ga-emebi gburugburu ebe obibi ma a na-arụ ọrụ dịka soleRebels, The Republic of Leather weere ọchịchọ maọbu nhọrọ ndị ahịa bute ụzọ - nhọrọ ndị ahịa gbasara ọdị̀dị́, na iwepụ pasentị ise n'ego ọbụla ndị ahịa ya kwụrụ dosa n'akụkụ iji nyere ndị mmadụ aka.


, onye na-emepụta na ịnata ọrụ ebere nke 5% nke ọnụahịa ha na-akwụ.[8]

N'afọ 2017, agbakwunyere "Garden of Coffee" na ụlọ ọrụ ndị O nwere. Ọ

sre te na ụlọ ahịa dị na Addis Ab maliteaba.[3]

Ụkpụrụ Mgbaso[dezie | dezie ebe o si]

Betlehem na-achọ ịma nkwenye ọjọọ onye ọbụla bụrụla n'obi banyere ndị Africa, ọkachasị, Etiopia, nke bụ na ndị Afrịka amaghị otu esi ekepụta ụzọ ha ga-esi nwee ọganihu aka mgba".[9] Betlehem kwenyere na ndị Etiopia ga-agbarịrị mbọ "ikepụta akụkọ na ọdịdị nke ha pụọ na ndị chọrọ enyemaka' bátá na ndi nwe enyemaka ndị ọzọ na-achọ", dịka Betlehem si kọwaa n'ajụjụ ọnụ 'The Next Woman' gbara ya. Ọganihu zuru ụwa ọnụ nke ụlọ ọrụ ndị dịka soleRebels na-enye aka iwepụ nkwenye ochie ndị a ma na-enye ndị Etiopia ohere ịkpụzi ọdịdị mba ụwa nke ha.[9]

Ihe Nturu ugo na otuto[dezie | dezie ebe o si]

  • N'afọ 2011, World Economic Forum họọrọ Betlehem dị ka onye ndu ụwa ka dị n'obere nwa.[10]
  • E depụtara aha Betlehem na magazin Forbes n'afọ 2011 dika otu n'ime ụmụ nwanyị nwe ike pụrụ iche na Afrịka (Youngest Power Women in Africa)[5]
  • N'afọ 2012, Forbes denyere aha Alemu na otu n'ime mmadụ ótù narị kacha ike n'uwa (100 Most Powerful) ma kọwaa ya dị ka "Nwanyị a ga-eñomi".[11]
  • N'afọ 2012, Business Insider kpọrọ Bethlehem aha dị ka otu n'ime "Ndị Ọchụnta ego ise kachasị elu n'Africa (Top 5 Female Entrepreneurs)".[12]
  • N'afọ 2012, onye isi obodo Bloomberg họpụtara Bethlehem dị ka NYC Venture Fellow.[13]
  • N'afọ 2012, a họọrọ Betlehem dị ka otu n'ime ụmụ nwanyị ótù narị bụ ọpụrụiche (100 Dynamic Women)9 nke Arise Magazine bụ ndị na-akpụzi Africa nke oge a.[14]
  • N'afọ 2013, Fast Company depụtara aha Betlehem dịka onye nke iri isii na abụọ n'aha ndị kacha nwee ihe ntinye ọhụrụ na ngalaba azụmahịa (100 Most Creative People in Business 2013).[15]
  • N'afọ 2013 Bethlehem bụ otu onye n'ime ndị ndụmọdụ na One Young World Summit nke afọ ahụ.[16]
  • N'afọ 2013, Madam Figaro depụtara aha Betlehem dịka otu n'ime "Ndị inyom Africa iri na ise kachasị ike (15 Most Powerful African Women)[17]
  • N'afọ 2013, a họpụtara Bethlehem ka ọ sonye na kọmitii ndụmọdụ nke Green Industry Platform, nke United Nations Industrial Development Organization na UN Environment Program kpọrọ.[18]
  • N'afọ 2013, ndị na-agụ akwụkwọ mgbasa ozi The Guardian họọrọ Betlehem dị ka otu n'ime "Ndị inyom kachasị nwee ihe ha mepụtara n'Africa".[19]
  • N'afọ 2014, CNN kpọrọ Bethlehem aha dị ka otu n'ime Umu Nwanyị Ndị Ọchụnta ego iri na abụọ hiwere ụlọ azụmahịa nke ha, bụ ndị gbanwere ụzọ anyị si eme azụmahịa".[20]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Bethlehem Tilahun Alemu. www.solerebels.com. soleRebels Footwear. Retrieved on 10 June 2014.
  2. Alemu (April 9, 2014). Exclusive: Introducing Republic of Leather. www.solerebels.com. Retrieved on 24 June 2014.
  3. 3.0 3.1 3.2 Britton (2017-01-31). Ethiopian shoe designer hopes for repeat success with coffee. CNNMoney. Retrieved on 2017-07-03. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  4. Bethlehem Tilahun Alemu. Ethiopian Woman Unleashed. Archived from the original on 24 September 2014. Retrieved on 10 June 2014.
  5. 5.0 5.1 Bethlehem Tilahun Alemu (en). World Economic Forum. Retrieved on 2022-03-28. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Bethlehem Tilahun Alemu" defined multiple times with different content
  6. The journey so far: Bethlehem Tilahun Alemu, founder, soleRebels (en-US). How we made it in Africa (2018-01-15). Retrieved on 2022-03-28.
  7. SoleRebels: An Ethiopian success story (en-GB). Africa M.E. (2016-05-13). Retrieved on 2021-02-01.
  8. 8.0 8.1 8.2 Pitts. Bethlehem Tilahun Alemu, a Forbes 'World's 100 Most Powerful' Woman. thenextwomen.com. Archived from the original on 1 September 2014. Retrieved on 16 June 2014. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "thenextwomen.com" defined multiple times with different content
  9. 9.0 9.1 Pitts (February 21, 2013). Bethlehem Tilahun Alemu, a Forbes 'World's 100 Most Powerful' Woman. www.thenextwoman.com. The Next Woman. Archived from the original on 1 September 2014. Retrieved on 26 June 2014.
  10. Bethlehem Tilahun Alemu. www.thenextwoman.com. The Next Woman. Archived from the original on 2 September 2014. Retrieved on 25 June 2014.
  11. Women to Watch: Bethlehem Tilahun Alemu. ww.forbes.com. Retrieved on 24 June 2014.
  12. Voakes (June 29, 2012). Africa's Top 5 Women Entrepreneurs. www.businessinsider.com. Business Insider. Retrieved on 24 June 2014.
  13. 2012 Fellows. www.nycventurefellows.org (2012). Archived from the original on 19 May 2014. Retrieved on 25 June 2014.
  14. Arise 100: Dynamic Women. www.ariselive.com. Arise Magazine (2012). Archived from the original on 2014-07-24. Retrieved on 24 June 2014.
  15. Rockwood. 62. Bethlehem Tilahun Alemu. www.fastcompany.com. Fast Company. Retrieved on 24 June 2014.
  16. Bethlehem Tilahun Alemu. www.oneyoungworld.com. Archived from the original on 24 June 2014. Retrieved on 24 June 2014.
  17. 15 Most Powerful African Women. www.elleafrique.com. Elle Afrique (3 May 2013). Archived from the original on 2014-06-07. Retrieved on 24 June 2014.
  18. soleRebels CEO joins Green Industry Platform Advisory Board. www.unido.org. UNIDO (November 5, 2013). Archived from the original on 2014-10-19. Retrieved on 25 June 2014.
  19. Allen (March 8, 2013). Africa's top women achievers--nominated by you. www.theguardian.com. The Guardian. Retrieved on 25 June 2014.
  20. Davies. 12 Female Entrepreneurs who Changed the Way We do Business. edition.cnn.com. CNN. Retrieved on 24 June 2014.