Biola Alabi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Biola Alabi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoBiola Alabi Dezie
Aha ọmụmụBiola Alabi Dezie
Aha enyereBiola Dezie
aha ezinụlọ yaAlabi Dezie
Ebe ọmụmụNjikota Obodo Amerika Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie
ụdị ọrụ yaonye na-emeputa ihe nkiiri Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science Dezie
isi agụmakwụkwọAhụike ọhanaeze Dezie
Ebe ọrụLagos Dezie
affiliation stringBiola Alabi Media Consulting Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
so naWorld Economic Forum Annual Meeting 2015 Dezie
Onye òtù nkeUnilever Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Biola Alabi bụ nwaafọ Nigerian ji ego achụ egọ. O so onye otu ya wube ụlọ ọrụ a kpọrọ Biola Alabi Media (BAM), [1] Ụlọ ọrụ a na-emepụta ihe nkiri nakwa fim di iche iche ka ndi Nigeria zụrụ , ụfọdụ ihe nkiri ndi a metụtara ụdị nri di iche iche ana esi ebe di iche iche n'obodo Nigeria bụ nke ọ kpọrọ 'Food Travel series Buka and Joint'. Ọ na-egosi ihe nkiri Fim akpọrọ Lara and the Beat. [2] [3] Ọ rụburụ ọrụ dị ka nnukwu Daịrektọ n'ụlọ ọrụ M-Net nke Afrika. [4]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Nne na Nna Biola bụ ndị Nigeria mụrụ Biola na mba America. Biola bụ nwa nke izizi n'afọnne ya, Nna ya bu onye Akure dị na Ondo State, ebe Nne ya si Ilesa otu n'ime obodo di na Osun State. Biola na Ezinaụlọ ya laghachitere na Nigeria. [4] Alabi mechara gaa University of Cincinnati ebe ọ gụrụ maka mgbochị ọria nakwa nchekwa ahụike ọhanaeze. [5] Ọ gara n'ihu ịgụ na Mahadum nke Havard Kennedy School of Government ya na Mahadum nke Yale Jackson Institute of Global Affairs. [6]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Alabi bidorp otu ọ kpọrọ 'Grooming for Greatness' Otu a bụ iji kuziere ndi na-eto eto uzọ dị iche ha ga esi bụ ezigbo onye ndu nke Africa. O ji ọkwa dika Daịrektọ na-achikwata ihe n;ụlọ ọrụ nke M-NET Africa ngalab nke otu Naspers. Tupu ọ nọdụ n'ọkwa a, mgbe ọ nọ mba America o so n'otu ndi isi haziri ihe nkiri ụmụaka wuru ewu akpọrọ a Sesame Street, ọ bụkwa otu ndi otu azumahia ụgbọala ndi Korea . Aha ụgbọala bụ Daewoo nke di na USA. [5]

N'afọ 2018, Alabi so wee malite ngosipụta ọrụ aka nka akpọrọ Remember To Rise . [7]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Banana Island Ghost
  • Lara and the Beat

Ihe onyinye na nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

  • 20 Youngest Power Women in Africa nke ndi 'Forbes Magazine nyere ya n' afọ 2012 [8]
  • World Economic Forum Young Global n'afọ 2012 [9]
  • CNBC Africa's AABLA West African Woman Woman of the Year n'Afọ 2013

Lee kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]