Bolanle Awe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bolanle Awe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya28 Jenụwarị 1933 Dezie
Ebe ọmụmụIlesa Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụuniversity teacher, historian Dezie
ebe agụmakwụkwọStephen Perse Foundation, University of St Andrews, University of Oxford Dezie
Ebe obibiIbadan Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Bolanle Awe ( Yoruba : Bọ́láńlé (Fájẹ́m̄bọ́là) Awẹ́ bụ onye a mụrụ na mkpụrụ ụbọchị iri na asatọ n' ọnwa mbụ (Jenụarị) n' arọ 1933. Ọ bụ ọkammụta akụkọ ihe mere eme nke Naijiria na Yoruba .

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Awe na Jenụwarị 28, 1933 na obodo Ilesa, Nigeria nye Samuel Akindeji Fajembola na Mosebolatan Abede. Nna ya bụ onye Ibadan, bụrụkwa onye na-azụ ahịa koko na onye nlekọta na John Holt & Co., ụlọ ọrụ mbupu na azụmaahịa dị iche iche. Nne ya si n'obodo Ilesa, ma bụrụ onye ezi na ụlọ Abede, ngalaba nke Ụlọ Eze ndị Bilayirere, otu n'ime ụlọ eze 4 nke Ilesa. Nne ya bụ onye nkụzi. Mgbe ebufere nna ya n'otu alaka ụlọ ọrụ John Holt & Co. dị na Ilesa ka a mụrụ Awe. Ọ kọwara na ndụ ya n'Ilesa bụ nke juru afọ n'ihi ịdị n'otu nke dị n'etiti ndị okpukpe Alakuba, Ụka Kraịst, na ndị Yoruba. [1] [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ na Holy Trinity, Omofe- Ilesha, tupu ya na ezinụlọ ya kwaga Ibadan mgbe ọ dị afọ 8, ebe ọ gara akwụkwọ na St James Primary School, Okebola, Ibadan na St Anne's School, Ibadan . [3] Ọ lere ule agba nke A na Ụlq akwụkwọ Perse dị na Cambridge. Ọ gara Mahadum St Andrews dị na Scotland ebe ọ nwetara nzere masters na akụkọ ihe mere eme, tupu ọ nweta nzere doctorate n'akụkọ ihe mere eme na Mahadum Oxford . Awe laghachiri Naijiria, ebe ọ ghọrọ onye nkuzi na mahadum Ibadan .

Ọ bụzi prọfesọ mahadum Ibadan. Ọ bụ otu n'ime ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke kwere ka ihe ha na-achọ rue n'asụsụ ọnụ . Nke a pụtara na ọ na-enwe ike ị nwetaghachi akụkọ ihe mere eme tupu ọbịbịa nke ndị Europe. Ọ chọpụtakwara na mbọ nwaanyị n'akụkọ ihe mere eme bụ nke a na-eleghara anya. Ọ bụ ya mere o jiri nye aka n'iguzobe otu Women's Research and Documentation Centre (WORDOC) iji kwalite nhazi nchọcha ụmụ nwaanyị na na usoro ọhụrụ iji mụọ ụmụnwaanyị Naijiria. [4] N'afọ 1982, e mere ya ka ọ bụrụ Officer of the Order of the Federal Republic of Nigeria. [5]

N'ụbọchị Krismas, 1960, ọ lụrụ Olumuyiwa Awe. Ọ ga-abụkwa prọfesọ ma mụọ ụmụ. Di ya nwụrụ na 2015 mgbe ọ dị afọ 82.

Site na 1990 ruo 1992 ọ jere ozi dịka onye isi oche mbụ nke National Commission for Women (NCW). Otú ọ dị, ọ gbara arụkwaghịm n'ọkwa ahụ n'afọ 1992 ka gọọmenti mezigharịrị Kọkwa ahụ ma tinye ya n'okpuru nlekọta nke First Lady of Nigeria, Maryam Babangida . [6]

Na 1998, ọ lara ezumike nká [5] na n'afọ sochirinụ, ngalaba nke ọmụmụ Afịrịka bipụtara obere akwụkwọ gbasara ya. [7] Mgbe ọ lara ezumike nká, ọ gara n'ihu na-eme nchọpụta nke mere ka ọ ghọọ Pro-Chancellor nke University of Nigeria na Nsukka na 2005. [5]

Ọrụ ndị ọ rụrụ[dezie | dezie ebe o si]

    • Awe, Bolanle Praise Poems as Historical Data: The Example of the Yoruba Oríkì. Africa: Journal of the International African Institute; Vol. 44, No. 4 (Oct., 1974), pp. 331-349
    • Bolanle Awe, ed. Nigerian Women in Historical Perspective. Sankore Publishers; Ibadan: Bookcraft, 1992 (Àtụ:ISBN).
    • Ojetunji Aboyade and Bolanle Awe, editors. Footprints of the Ancestor: The Secret of Being. Special edn. Ibadan, Nigeria: Fountain Publications, c.1999
    • Awe, Bolanle. OBA (DR), Samuel Odulana Odugade I: the 40th Olubadan of Ibadanland: a biography / Bolanle Awe, P. Adedtun Ogundeji S, Ademola Ajayi. 2nd edition, Centenary edition, Mapo, Ibadan: Tafak Publications, [2014].

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Archive copy. Archived from the original on 2022-05-20. Retrieved on 2022-03-06.
  2. https://dawncommission.org/professor-bolanle-awe/
  3. Olujimi. "Nigeria: Founding Fathers Laid Foundation for Under-Development", Vanguard, 2006-05-01. Retrieved on 2016-03-19.
  4. Awe, B., & Mba, N. (1991). "Women's Research and Documentation Center (Nigeria)". Signs, 16(4), 859–864. Retrieved from
  5. 5.0 5.1 5.2 Professor Henry Louis Gates, Jr. (2 February 2012). Dictionary of African Biography. OUP USA, 301–. ISBN 978-0-19-538207-5. 
  6. Amina Mama (1995). "Feminism or Femocracy? State Feminism and Democratisation in Nigeria". Africa Development / Afrique et Développement 20 (1): 37–58. 
  7. (1 January 1999) Bolanle Awe: Portrait of an Academic and Activist. Women's Research and Documentation Centre (WORDOC), Institute of African Studies, University of Ibadan. ISBN 978-978-2213-24-2.