Central African Forest Commission
Central African Forest Commission (French: Commission des Forêts d'Afrique Centrale, maọbụ COMIFAC) bụ òtù na-emekọ ihe ọnụ na Central Afrika. Ebumnuche ya bụ ijikwa ọhịa nke Central Afrika n'ụzọ na-adịgide adịgide ma na-akwado ya site na netwọk nlekota azụmaahịa anụ ọhịa TRAFFIC.[1] Odeakwụkwọ ahụ dị na Obodo Yaoundé, Cameroon. Raymond Mbitikon na-eje ozi dịka onye isi odeakwụkwọ ya.
Asụsụ anọ ya bụ French, English, Spanish ya na Portuguese.
Mba ndị so na ya
[dezie | dezie ebe o si]Mba iri so na Central Afrikan Forest Commission gụnuere:
Akụkọ ihe mere eme
[dezie | dezie ebe o si]E guzobere COMIFAC na Machị n’afo 1999, site na "Nkwupụta nke Yaoundé". N'ọnwa Febụwarị afọ 2005, nzukọ ahụ nabatara "Atụmatụ Nkwekọrịta maka nlekọta na nchekwa nke oké ọhịa na Central Afrika".[2]
OFAC
[dezie | dezie ebe o si]E guzobere n’afo 2007, Central African Forest Observatory (OFAC) bụ ngalaba pụrụ iche nke COMIFAC, nke na-enye data dị ọhụrụ na nke dịkwazi mkpa banyere ọhịa na gburugburu ebe obibi nke mpaghara ahụ, na ebumnuche nke ime iwu na ịkwalite ọchịchị ka mma na njikwa na-adịgide adịgide nke ihe onwunwe okike.
Hụkwazie
[dezie | dezie ebe o si]- Njikọ Ọhịa Congo Basin
- Ebe Nchekwa Pụrụ Iche
- Ndị na-ahụ maka akụ na ụba na ego nke Central Africa
- Ogige Ntụrụndụ Lobéké
- Ogige Ntụrụndụ Nouabalé-Ndoki
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ TRAFFIC - Timber trade (en). www.traffic.org. Retrieved on 2018-03-19.
- ↑ Official website, COMIFAC. Templeeti:Webarchive Accessed: November 5, 2012.