Chaba Fadela

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chaba Fadela
Mmádu
Akụkụ nkeFadela & Sahrawi Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịAlgeria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Febụwarị 1962 Dezie
Ebe ọmụmụOran Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, onye egwu, omee Dezie
Onye òtùCheb Sahraoui Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịrock music, raï Dezie
akara ndekọIsland Records, Rotana Music Group Dezie

Chaba Fadela (amụrụ Fadela Zalmat, na Oran, Algeria, 5 Febụwarị 1962) bụ onye Algeria na-eti egwu na onye na-eme ihe nkiri.

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A zụlitere ya n'ógbè ndi dara ogbenye, ọ pụtara na ihe nkiri Algeria Djalti mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Ọ malitere ọrụ egwu ya dị ka onye na-agụ egwu na Boutiba S'ghir's band wee malite ọrụ ndekọ ya na onye na-emepụta Rachid Baba Ahmed na ngwụcha afọ 1970. Ọ bụ nwanyị mbụ mebiri mmachibido iwu a machibidoro ụmụ nwanyị ịbụ abụ na klọb, ọ nwetakwara nnukwu ihe ịga nke ọma na Algeria ngwa.

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ zutere ma lụọ Cheb Sahraoui, ha abụọ malitekwara idekọ ọnụ dị ka mmadụ abụọ, malite na 1983 na "N'sel Fik (You Are Mine)", nke ghọrọ otu n'ime ndekọ mba ụwa mbụ. Mango/Island/PolyGram Records wepụtara abọm nke egwu sitere na nnọkọ ndị ahụ na 1989. Fadela na Sahraoui gara mba ụwa ma dekọọ egwu n'ọtụtụ ebe n'afọ ndị 1980, na ihe ịga nke ọma. Mgbe ha nọ na New York na 1993 ha dekọrọ abọm Walli na onye na-emepụta ihe na onye na'ọtụtụ ngwá egwu Bill Laswell. Ha si Algeria kwaga France na 1994.

Na ngwụcha afọ ndị 1990, mmekọrịta ọkachamara nke dị n'etiti Fadela na Sahraoui mebiri, ma kemgbe ahụ, Fadela gara n'ihu na-arụ ọrụ dị ka onye na-agụ egwu.

Ihe ọmụma ndị ọzọ na isi mmalite[dezie | dezie ebe o si]