Charles Sumner Duke

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Charles Sumner Duke
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereCharles Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1879 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1952 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-ese ụkpụrụ ụlọ Dezie
agbụrụNdi Afrika nke Amerika Dezie

Charles Sumner Duke (Julaị 21,1879 ruo Jụn 15, 1952) bụ onye na-ese ụkpụrụ ụlọ, injinia, na onye ọrụ ọha na eze nke kwadoro ohere maka ndị Afrịka Amerịka ma nyere aka guzobe National Technical Association (NTA) na 1925.[1] Onye nta akụkọ na onye isi ikike obodo bụ Jesse Duke bụ nna ya.[2]

A mụrụ Duke na Selma, Alabama. Nna ya, Jesse Duke, bụ onye na-ebipụta akwụkwọ akụkọ nke nchịkọta akụkọ ya na-emegide lynching kpatara nzaghachi nke mere ka ezinụlọ ahụ gbaga Pine Bluff, Arkansas.[3]

Duke gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Harvard na Mahadim Wisconsin .[3][4] Ọ kwagara Chicago n'afọ 1908.[3]

O guzobere National Technical Association n'afọ 1925 ma bụrụ onye isi oche mbụ ya.[5][6]

A na-akpọ NTA's Charles S. Duke Distinguished Lecture Series aha ya.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]