Chi-chi Nwanoku

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chi-chi Nwanoku
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaJụn 1956 Dezie
Ebe ọmụmụFulham Dezie
nwanneGus Nwanokwu Dezie
Asụsụ obodoBekee Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie
onye were ọrụClassic FM, Royal Academy of Music, BBC Radio 3 Dezie
ebe agụmakwụkwọKendrick School Dezie
Ihe nriteOnye isi nke Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie
webụsaịtịhttp://www.chi-chinwanoku.com Dezie

Chinyere Eda "Chi-Chi" Nwanoku OBE ( /tʃ ɪ tʃ i N w æ n oʊ k ụ / ; amuru ya na ọnwa June n'afọ 1956) bu onye obodo Britian na aku ngwa egwu na akpọ bass na asụsụ bekee. Ọ bụkwa onye na ọka nmuta na ihe gbasara ngwa egwu Bass (prọfesọ) na Royal Academy of Music.Nwanoku bụ onye bidoro ma burukwa onye isi ndị ngwa egwu na Orchestra of the Age of Enlightenment, ọkwá ọ nọrọ afọ iri atọ.

Nwanoku bụ onye Naijiria na onye obodo bekee Ireland. Ọ guzobere ma burukwa onye nduzi egwu na otu nzukọ egwu akpọrọ Chineke ! Orchestra. Otu a bu ndị otu ndi okacha mara nke mbu na mba Europe nwere otutu ndi ojii, ndi Eshia na ndi agbụrụ di iche-iche . [1] [2] [3]

Mbido Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Nwanoku bu onye Nigeria ma burukwa onye Irish. Ọ bụ nwa nke mbụ na nke mbụ n’ime ụmụ ise nke nne na nna ya, [4] dibia bekee (Dr) Michael Nwanoku na nwunye ya Margaret ( née Hevey) muru. [5] Ndị nne ya ochie jụrụ nne ya bu Margaret nne n'ihi na ọ nwere mmekọrịta agbụrụ, were lụọ di onye ojii Agbanyeghị nke a, nne Margaret gara na nzuzo na London na ọnwa atọ ka amụrụ Nwanoku ihu nwa nwa ya. [6] A mụrụ Nwanoku na Fulham, London, ma na tupu ya eruo ogo ịmalite ụlọ akwụkwọ ọ nọrọ afọ ole na ole na Imo steeti, Nigeria, ebe ezinaụlọ ya gara afọ abụọ. Nwanoku gara ụlọ akwụkwọ na Kendrick Girls Grammar School na Reading, Berkshire . Mgbe ọ dị afọ asaa, ọ malitere agụmakwụkwọ ya dịka onye na-akụ egwu oge gboo - na mbụ ọ malitere ịmụ ihe gbasara ngwa egwu a'na akpọ piano, mgbe ọ dị afọ iri na asatọ ọ malitere ịmụ ihe maka ngwa egwu bass. Nwanoku mechara gụ akwụkwọ na Royal Academy of Music mgbe ọ na-azụ ọzụzụ dịka onye na-agba ọsọ 100-mita mana ọ kwụsịrị ọrụ egwuregwu igba ọsọ mgbe ọmmerụ ahụ na ikpere.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Nwanoku bu onye hiwere otu egwu Chineke! Orchestra, ìgwè ndị egwu mgbe ochie na mba Europe nwere ọtụtụ ndị egwu ojii na ndị agbụrụ ndị ọzọ dị ọbere , ndị ha na ya na-etikọrita egwu oge niile. [7] Ndi otu ndi egwu a nwere ndi mmadu iri isii na abụọ sitere n’ime obodo iri-ato n’otu di iche iche rụrụ ọrụ ha nke mbụ n’afo 2015 na nnukwu ọnụ ụlọ nke akpọrọ Queen Elizabeth Hall [8] Gbakwunye oru ya na Chineke! Orchestra, Nwanoku arụọla ọrụ dịka onye ngwa egwu bass abụọ nke mkpokọta Endymion, London Mozart Players, Academy nke St Martin na Field, ndị England Baroque Soloists, ndị London Classical Player na Orchester Revolutionnaire et Romantique .

E wezụga ịtị ngwa egwu na ịkụzi bass, ọ nọ na-arụsi ọrụ ike dị ka onye mgbasa ozi, dịka na mmemme BBC Radio 3 Requests na BBC TV Proms na dịka onye so na ndị na ekpebi maka mmemme BBC, Classical jury . Na afọ 2015, Nwanoku gosipụtara mmemme BBC Radio 4 na Search of the Black Mozart, [3] nke gosipụtara ndụ na ọrụ nke ndị na-ede akwụkwọ egwu bu ndị ojii na ndị na abụ abụ site na narị afọ nke iri na asatọ, gụnyere Joseph Bologne, Chevalier de Saint-Georges ; Ignatius Sancho ; na George Bridgetower . [9] Ọnọdụ ndị ọzọ Nwanoku nwere gụnyere ịbụ onye otu Board nke National Youth Orchestra, Tertis Foundation, London Music Fund, Royal Philharmonic Society (Council). Na mbụ Nwanoku nọbu na Board Association British Orchestras. Ọ bụ kwa Patron (onye nlekọta) nke Music Preserved, ndị Cherubim Trust. [10]

Nwanoku bụ onye ọbịa na mmemme nke BBC Radio 4 Desert Island Discs na ụbọchị iri na otu nke ọnwa Febụwarị na afọ 2018. [11] N’afọ 2019, Nwanoku mepere ebe ohuru nke Hackney New Primary School, ụlọ akwụkwọ ọkachamara maka ụmụaka chọrọ ịmụta egwu.

Nwanoku na ụmụ abụọ ya - Jacob Hugh na Phoebe Hugh, yana nwa nwa ya nwanyị, Maya Ekene Hugh, bi na London.

Onyinye na nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2001, a họpụtara Nwanoku dịka onye otu Order nke British Empire (MBE) na 2001 Birthday Honors na Officer nke Order nke British Empire (OBE) na 2017 Birthday Honors, Ihe onyinye na nsọpụrụ abụọ bu maka ọrụ Nwanoku na ihe gbasara egwu. Na mgbakwunye, akwanyere ya ugwu mee ya Fellow nke Royal Academy of Music na Trinity Laban Conservatoire of Music . [1]

Na afọ 2018 BBC Hour Hour tinyere Nwanoku dịka onye nke itoolu na ndepụta nke ụmụ nwanyị kachasị ike n'ụwa na ihe gbasara egwú ma debanyekwa ya na afọ 2019 na 2020 na Powerlist ndepụta nke na egosi ndị isi ojii jibiri na Britain n'afọ ahụ.

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Chi-chi Nwanoku's Chineke! Orchestra Debuts Sept. 13 at Southbank Center", Classicalite, 23 July 2015.
  2. "Chi-chi Nwanoku: 'I want black musicians to walk on to the stage and know they belong'", The Guardian, 2 June 2015.
  3. 3.0 3.1 Jessica Duchen, "Chineke! Europe's first professional orchestra of black and minority ethnic musicians launches", The Independent, 1 September 2015.
  4. "Our founder| Chi-chi Nwanoku MBE", Chineke! Foundation.
  5. Ed Keazor, "Chi-chi Nwanoku: A Classical legacy and an African heritage", Music in Africa Magazine, 25 November 2014.
  6. Chi-Chi tells Tubridy about her Mum's heartbreaking story (en) (13 March 2018). Retrieved on 23 April 2020.
  7. Inside Chineke!, Europe's first black and minority ethnic orchestra (16 August 2017). Retrieved on 23 April 2020.
  8. She Was the Orchestra’s Only Black Musician, Until She Formed Her Own (24 April 2017). Retrieved on 23 April 2020.
  9. In Search of the Black Mozart, BBC Radio 4.
  10. "About Cherubim Music Trust".. Archived from the original on 2016-09-14. Retrieved on 2020-11-09.
  11. "Chi-chi Nwanoku", Desert Island Discs, 11 February 2018.
Kpọpụta njehie: <ref> tag with name "RAM" defined in <references> is not used in prior text.

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]