Christine Amongin Aporu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Christine Amongin Aporu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereChristine Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Mee 1958 Dezie
Ebe ọmụmụKumi District Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University, Kyambogo University Dezie
Ebe obibiKampala Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1980 Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

Christine Hellen Amongin Aporu bụ onye nkuzi na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Uganda. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista Steeti maka Teso Affairs n'ọfịs Praịm Minista na Cabinet nke Uganda. A họpụtara ya n'ọkwa ahụ na 27 Mee na afo 2011.[1] Ọ nọchitere anya Kumi District na Parliament dị ka onye nnọchi anya ụmụ nwanyị.[2]

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Kumi District na 22 Mee na afo 1958. Ọ gara Nabuyanga Primary School na Soroti Secondary School. Ọ gụrụ akwụkwọ na St. Aloysius Teachers College, na Ngora District, gụsịrị akwụkwọ na Grade III Certificate in Teaching, na afo 1979.[3] N'afọ 1986, ọ gụsịrị akwụkwọ na Institute of Teacher Education Kyambogo, nke bụzi akụkụ nke Mahadum Kyambogo. O nwere nzere Bachelor of Education, nke ọ nwetara na Mahadum Makerere na afo 1996. O nwekwara diplọma postgraduate na Management site na Uganda Management Institute (UMI), nke enyere na afo 2005. O nwetara nzere masta ya na Human Resources Management na UMI n'afọ 2009.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Amongin Aporu malitere ọrụ ya dị ka onye nkuzi ụlọ akwụkwọ praịmarị na afo 1980, na-eje ozi na ikike ahụ ruo na afo 1984. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na ITEK na afo 1986, ọ ghọrọ onye nkuzi na kọleji ọzụzụ ndị nkuzi, na-eje ozi na ikike ahụ ruo na afo 1996. A họpụtara ya na mbụ ka ọ nọchite anya Kumi District na afo 1996. N'agbata afọ 2001 na afọ 2006, ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista Steeti. Ọ bụ onye otu Demobilization Resettlement Team nke Amnesty Commission, mgbe ọpụpụ nke LRA si n'ala Uganda. Mgbe ntuli aka mba nke afọ 2011 gasịrị, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Minista nke steeti maka ihe gbasara Teso.[2][4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Kọmitii nke Uganda
  • Nzukọ omeiwu nke Uganda

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Mukasa (28 May 2011). Museveni Names New Cabinet. Archived from the original on 11 December 2014. Retrieved on 15 February 2015.
  2. 2.0 2.1 Amongin Aporu Christine Hellen, Member of Parliament Woman Representative, Kumi District. Parliament of Uganda (2011). Archived from the original on 24 September 2015. Retrieved on 15 February 2015.
  3. Among (7 July 2014). St. Aloysius Core Primary Teachers College Hit by Acute Water Shortage. Uganda Radio Network (URN). Retrieved on 15 February 2015.
  4. Full List of Ugandan Ministers Appointed by President Museveni (28 May 2011). Retrieved on 15 February 2015.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]