Connie Chiume

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Connie Chiume
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha ọmụmụConnie Temweka Gabisile Chiume Dezie
Aha enyereConnie Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Jụn 1952 Dezie
Ebe ọmụmụWelkom Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1989 Dezie

Connie Temweka Gabisile Chiume (amụrụ n'abalị ise nke ọnwa Jun, 1952), bụ onye ome ihe nkiri nke South Africa ma bụrụ agbụrụ Malawi. [1] A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na fiim Black Panther, Black Is King na Blessers yana na telivishọn maka Zone 14 na Rhythm City . Connie na-emekwa ihe na soapie nke South Africa na Mzansi Magic a na-akpọ Gomora .

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya n'abalị ise nke ọnwa Jun n'afọ 1952 na Welkom, South Africa. [2] Nna ya bụ, Wright Tadeyo Chiume, sitere na Usisya, Nkhata Bay, Malawi ma nne ya bụ, MaNdlovu, sitere na KwaZulu-Natal, South Africa. Nna ya nwụrụ na 1983 na Malawi. Ọ nọrọ oge nwata ya na Welkom, bụ́ ebe ọ gakwara akwụkwọ. Ọ kwagara Eastern Cape iji mechaa matrick. Otú ọ dị, ọ gụchaghị akwụkwọ ọmụmụ nọọsụ n'ihi na ọ chọrọ ka a zụọ ya dị ka onye nkụzi. Site na mmasị ahụ, ọ gụsịrị akwụkwọ na mmụta nkuzi na 1976. Mgbe afọ ole na ole nke ịkụzi ihe gasịrị, ọ gbara arụkwaghịm wee gaa Izrel. Mgbe e mesịrị, ọ kwagara Gris ka ọ malite ọrụ ime ihe nkiri. [1] Nne ya nwụrụ na Machị 2020. [3]

Nwa nwanne nna ya, Ephraim Mganda Chiume bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Malawi.

Connie lụrụ di na 1985 wee gbaa alụkwaghịm na 2004. Ọ bụ nne nke ụmụ anọ: ụmụ nwoke abụọ na ụmụ nwanyị abụọ. [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ kwagachara Gris na 1977, ọ malitere ime ihe nkiri n'ọrụ mbụ ya dị ka Porgy na Bess, Ipi Ntombi, na Little Shop of Horrors . [2] N'afọ 1989, ọ pụtara na usoro onyonyo Inkom'Edla Yodwa ka ọ laghachiri na South Africa. Ọ rụrụ ọrụ dị ka 'Thembi' na usoro ahụ. Mgbe usoro ihe omume ahụ gasịrị, a kpọrọ ya òkù ka ọ Sonye na film Warrior from Hell na 1990, nke mere ka ọ pụta ìhè na sinima. N'afọ 2000, ọ meriri ihe nrite Connie the Avanti maka onye na-eme ihe nkiri kacha mma na usoro ihe nkiri n'oge mmemme ihe nkiri South Africa na Television Awards (SAFTA). [1]

Na 2005, o gosipụtara agwa dị ka 'Stella Moloi', na usoro ihe nkiri SABC1 Zone 14, ebe ọ ritere ihe nrite Golden Horn. Site na usoro ihe nrite ahụ ọ ghọrọ onye n'ewu ewu nke ukwuu, ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ ndu ruo 2010. [2] Ọ nwetakwara ihe nrite maka onye na-akwado ihe nkiri kacha mma na ihe nkiri n'oge SAFTA nke atọ. Na 2015, ọ pụtara na soap opera nke Rhythm City gosipụta agwa ọrụ nne dị ka 'Mamokete Khuse'. Ihe ngosi a ghọrọ nke ama ama nke ukwuu na South Africa. [1]

N'afọ 2006, ọ rụrụ ọrụ isi n'ime ihe nkiri nkwago ndị dị ka You Strike the Woman and you Strike the Rock . [2] N'afọ 2020, ọ gbara n'usoro ihe nkiri telivishọn Gomora na ngosipụta agwa dị ka'Mam'Sonto Molefe'. N'otu afọ ahụ, ọ pụtakwara na usoro telivishọn ọzọ bụ Black Is King . N'ime usoro ahụ, ọ n'egosiputa n'ihe nkiri dị ka nne na-enweghị isi. [4] N’ọnwa Ọktoba 2020, e nyere ya onyinye nhọpụta First Feather [5]

N'afọ 2018, ọ pụtara na ihe nkiri Hollywood blockbuster Black Panther Onye ama ama South Africa bụ omee John Kani . [6] Ọ rụrụ ọrụ dị ka okenye n'ami mmanụ nụ Mining Tribe Elder n'ihe nkiri ahụ. [7]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe nkiri Ọrụ Ụdị Ref.
1989 Inkom' Edla Yodwa Thembi Ihe nkiri Igwe onyonyo
1990 Warriors from Hell Marita Ihe nkiri
1994 The Air up There Oriakụ Urudu Ihe nkiri
1994 The Line Rosie Ihe nkiri TV
1997 A Woman of Colour Onye ọrụ gọọmentị Ihe nkiri TV
1998 Tierärztin Christine III: Abenteuer na Südafrika Onye nduzi Ihe nkiri TV
1999 Chikin Bizniz The Whole Story Thoko Ihe nkiri
2000 I Dreamed of Afrika Wanjiku Ihe nkiri
2004 In my country Virginia Tabata Ihe nkiri
2004 Mazinyo Dot Q Ma Mavuso Ihe nkiri Igwe onyonyo
2005-2015 Zone 14 Stella Moloi Ihe nkiri Igwe onyonyo
2013 Fanie Fourie's Lobola Zinzi Ihe nkiri
2015 Lerato Ụkọchukwu Ihe nkiri dị mkpirikpi
2015 Rhythm City Mamokete Khuse Ihe nkiri Igwe onyonyo
2017 Thula's Vine Ọbụghị Ihe nkiri Igwe onyonyo
2018 Black Panther Okenye ebo Ngwuputa Ihe nkiri
2019 Losing Lerato Gogo na ụgbọ ala Ihe nkiri
2019 Blessers Ma-Lerato Ihe nkiri
2020 What did you Dream Koko Ihe nkiri dị mkpirikpi
2020 Queen Sono Nana Rakau Ihe nkiri Igwe onyonyo
2020 Gomora Mam'Sonto Molefe Ihe nkiri Igwe onyonyo
2020 BLack is king Connie Chiume Ihe nkiri
2020 Choices Ihe nkiri Igwe onyonyo [8]
2020 Seriously Single Mama Dineo Ihe nkiri [9]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Connie Chiume biography. briefly. Retrieved on 8 November 2020.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Connie Chiume career. studentroom. Retrieved on 8 November 2020.
  3. Former 'Rhythm City' actress Connie Chiume mourns the death of mother. news24. Retrieved on 8 November 2020.
  4. Connie Chiume on Black is King and her role as a fussy mother in Netflix's Seriously Single. news24. Retrieved on 8 November 2020.
  5. Actress Connie Chiume honoured with first Feather Award nomination. news24. Retrieved on 8 November 2020.
  6. South Africa’s film industry needs to reach for the stars. news24. Retrieved on 8 November 2020.
  7. Local actress Connie Chiume 'ready to meet co-stars’ at Black Panther premiere. news24. Retrieved on 8 November 2020.
  8. Mamokete back to South Africa. times. Archived from the original on 30 August 2021. Retrieved on 8 November 2020.
  9. ‘Seriously Single’ Review: Netflix’s South African Rom-Com Brings Fresh Energy to Genre. Indie Wire. Retrieved on July 31, 2020.