Connie Galiwango Nakayenze

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Connie Galiwango Nakayenze
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Ọgọọst 1967 Dezie
Ebe ọmụmụMbale District Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jimember of parliament Dezie
Mpaghara ntuli akaMbale Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement, independent politician Dezie

Connie Galiwango Nakayenze (amụrụ na 31 Ọgọst a afọ 1967) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda na nwanyị na-anọchite anya Mbale District na Nzukọ nke iri na otu nke Uganda.[1][2][3] Connie jere ozi dị ka onye omeiwu na nke itoolu nke Uganda.[4][5][6] Ọ nwere njikọ na pati na-achị achị, National Resistance Movement.[1][7]

Agụmakwụkwọ na ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ nwanyị lụrụ di.[1] Connie nọdụrụ maka ule Primary Leaving Examinations (PLE) na afọ 1981 na Gangama Primary School. O mechara nweta asambodo ndị nkuzi nke Grade III na afọ 1989 site na Kabwangasi Primary Teachers College na Uganda Advanced Certificate of Education (UACE) na 1992 site na Mbale Hall. O nwekwara diplọma na agụmakwụkwọ sekọndrị site na National Teachers College, Nagongera (1995). N'afọ 2001, e nyere Connie nzere Bachelor of Arts na Social Sciences site na Mahadum Islamic dị na Uganda. Nke a sochiri Master of Arts na Education Management na afọ 2008 site n'otu Mahadum ahụ.[1]

Ihe omume ntụrụndụ Connie bụ Volleyball, Music na Net Ball.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Connie bụ onye nkuzi na Nabuyonga Primary School n'etiti afọ 1989 na afọ 1993 tupu ọ bụrụ onye nkuzi n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị Mbale S.S (1995), na Mbale High School (20032011). N'agbata afọ 2011 na 2016, ọ sonyeere ndị omeiwu nke Uganda dị ka onye otu ndị omeiwu. A họpụtakwara Connie maka ndị omeiwu nke iri na otu nke Uganda n'oge ntuli aka Jenụwarị, na afọ 2021 na Uganda.[1]

Na Nzukọ Ndị Omeiwu nke iri nke Uganda, ọ na-eje ozi dị ka Onye isi oche nke Kọmitii na Education & Sports. Tụkwasị na nke a, ọ na-eje ozi dị ka onye otu Kọmitii na HIV / AIDS & Related Disease na onye otu Kọمitii Azụmaahịa.[1]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Mbale District
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda.
  • Ndepụta nke ndị otu nke itoolu nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda.
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 29 April 2021. Retrieved on 16 March 2021.
  2. Connie Nakayenze Galiwango Archives (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 16 March 2021.
  3. Connie Galiwango Nakayenze Archives (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 16 March 2021.
  4. “My Life is Under Threat” – MP Nzoghu Tells Parliament - SoftPower News (en-US) (2018-09-13). Archived from the original on 2022-01-23. Retrieved on 2022-03-26.
  5. EveryPolitician: Uganda - Parliament - 9th Parliament. EveryPolitician. Retrieved on 2022-03-26.
  6. Members of 9th Parliament (en-US). Fortune Of Africa - Uganda (2013-06-07). Archived from the original on 2018-08-15. Retrieved on 2022-03-26.
  7. Wanyoto handed NRM flag for Mbale City, Galiwango to contest as Independent (en). Daily Monitor. Retrieved on 16 March 2021.