Didi Akinyelure

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Didi Akinyelure
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
onye were ọrụCNBC Africa Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Nottingham Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2011 Dezie
Ihe nriteKomla Dumor Award Dezie

Didi Akinyelure bụ onye nta akụkọ nwetara ihe nrite bụ nwaafọ Briten na Naijiria. Ọ bụ onye nwetara nzere bachelọ na kemịkal injinịarịn na Mahadum nke Nottingham . N’ọnwa Julaị afọ 2016, o nwetara ihe nrite BBC World News Komla Dumor . N'afọ 2018, Didi natara Special Excellence Alumni Laureate Award nke Mahadum nke Nottingham . Didi bụ ihu nke ihe ngosi ụtụtụ nke CNBC Africa a kpọrọ Open Exchange, West Africa.

Ihe ndabere, agụmakwụkwọ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Didi Akinyelure bụ onye nta akụkọ nwetara ihe nrite bụ nwaafọ Briten na Naijiria. N’afọ 2016, ọ nwetara ihe nrite BBC World News Komla Dumor. N'ọnwa Disemba afọ 2018, Didi natara Special Excellence Alumni Laureate Award nke Mahadum nke Nottingham .

Didi bu onye oru nta akuko nke nwere otutu ihe omuma na aru oru na telivishọn, redio, ederede na dijitalụ na BBC, CNBC na Reuters News Agency.

O gosipụtara iheomume usoro nke CNBC Europe na mgbanwe dijitalụ nke akpọrọ 'I.O.T: Powering the Digital Economy' na ihe omume usoro nke BBC World Service banyere mgbanwe ihu igwe 'Living on the Edge'.

O gosiputara, meputa ma dezie ihe onyonyo, redio na ihe dijitalụ nke BBC News n'elekere 10, BBC World News, BBC World Service, BBC Focus on Africa, BBC Business Daily, BBC Newsday, na BBC Radio 4 .

E depụtara akụkọ ya banyere azụmaahịa ụmụ nwanyị na ndepụta nke World Bank Women Entrepreneurship reporting category mmemme nrite One World Media n'afọ 2018.

E dere maka ya na magazin Forbes Africa ma tinye ya na ndepụta nke ndị nta akụkọ azụmahịa kachasị nwee mmetụta n'ụwa.

Ọ bụ onye ọchụnta ego Midia, mepụtara ihe omume nke telivishọn ya, nke a kpọrọ A Place in Africa, ihe ngosi TV nke Afrịka gbaa gburugburu. Akinyelure malitekwara ụlọ ọrụ REAP, na-emepụta ihe gbasara mgbasa ozi, njikwa aha na usoro nkwukọrịta.

Didi ewuola ọmarịcha ọrụ dịka Onye Nlekọta Ihe Omume na Ọkà Okwu. N'ọnwa Mee afọ 2019, ọ chịrị mkparịta ụka dị elu ya na ndị oke uche na United Nations na Geneva. Ndị a gụnyere Dame Wendy Hall, Nobel Laureate, Prof. Carlo Rubbia na Prof. Jurgen Schmidhuber . N'afọ 2018, ọ chịrị mkparịta ụka nke United Nations na Sir Roger Penrose na Nobel Laureate Jacques Dubochet .

O dozikwara otu paneel n'ọgbakọ ndị isi ala Afrịka, ma hazikwaa oriri abalị ihe onyinye nrite ndị Africa CEO . O lebara anya na ndị na - ahụ maka achụmnta ego na London Business School Africa Summit na ihe ngosi Future Energy Africa na ọgbakọ na Cape Town, Saụt Afrịka.

Onye isi oche nke Africa Construction Week na Munik,Jamini, haziri ndi otu paneel minista na Africa Oil Week na Cape Town, otu paneel na Access Bank International Women Day Conference, WimBiz, na Africa Women Innovation and Entrepreneurship Forum.

Tupu ihe a, o wepụtara arụmarụka BBC Africa na Fake News in Malawi na BBC Women in Digital Journalism panel na Social Media Week na Legos .

O hazikwara Africa Summit nke Mahadum nke Nottingham, Future Energy Exhibition and Conference, West Africa Property Investment Summit, the ‘Lagos at 50’ International Conference nakwazị ‘Lagos Kano Economic Summit’

N'ọnwa Septemba afọ 2017, United Nations kpọrọ Didi ka ọ gbaa ndị bịara nnọkọ mkparịta ụka na UN Convention to Combat Desertification in Ordos, China ajụjụ ọnụ.

Didi a gbala ndị a ma ama n’ọchịchị na ndị isi azụmaahịa ụwa ajụjụ ọnụ.

Tupu ọ bido ọrụ nta akụkọ, Akinyelure rụrụ ọrụ na Barclays Wealth na Lọndọn. [1] [2] [3] [4] [5] [6] [7]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Editor. Didi Akinyelure: Driven by dreams. The Guardian. Retrieved on 6 August 2016.
  2. BBC - Didi Akinyelure Awarded the Second BBC World News Komla Dumor Award - Media Centre. www.bbc.co.uk. Retrieved on 30 July 2016.
  3. Who is Komla Dumor Award winner Didi Akinyelure? - BBC News. BBC News. Retrieved on 30 July 2016.
  4. "Nigeria’s Didi Akinyelure wins BBC World News Komla Dumor Award", Bella Naija, 19 July 2016.
  5. "Nigerian journalist Didi Akinyelure wins Komla Dumor Award", Focus on Africa, BBC World Service, 19 July 2016.
  6. "Be Inspired! CNBC Africa’s Entrepreneur of the Week Show Features Inspiring Nigerian Women in Business", Bella Naija, 17 April 2016}}
  7. About Didi. www.didiakin.com. Retrieved on 27 July 2018.