Dindga McCannon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dindga McCannon
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
aha ezinụlọ yaMcCannon Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Julaị 1947 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-ahu maka ihe nkiri Dezie
agbụrụNdi Afrika nke Amerika Dezie
Onye òtù nkeWeusi Artist Collective Dezie
Ihe nriteAnonymous Was A Woman Award Dezie
webụsaịtịhttp://www.dindgamccannon.world Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaStudio Museum in Harlem Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
omenkà faịlụ naSmithsonian American Art and Portrait Gallery Library, Schomburg Center for Research in Black Culture Dezie

Dindga McCannon, amụrụ na Julaị 31, 1947, bụ ónyé Africa-America na-ese ihe, onye na-ese eriri, ónyé na'ahụ màkà mgbidi, ónyé nkụzi na ónyé na-eme ihe osise.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ McCannon ma zụlite ya na Harlem ma bụrụ ónyé na-ese ihe mgbè ọ dị afọ iri. Ọ na-akụziri onwe ya ma na-arụ ọrụ n'ụzọ doro anya. Ọ na-akpọ onwe ya onye na-ese ihe na mgbasa ozi, ónyé na-eme ihe nkírí mgbasa ozi, ọ na-arụ ọrụ na "ịgwakọta nka m dị mma 'ọzụzụ' na ọrụ ọdịnala ụmụ nwanyị nke nne m, Lottie K. Porter na nne nne ya Hattie Kilgo kụziiri m ịkwa akwa, beading, embroidery na quilting n'ime ihe a maara ugbu a dị ka ArtQuilts".

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Dindga McCannon abụwo onye na-ese ihe ruo afọ 55. Na mgbakwunye na ọrụ ya dị ka ónyé na-ede akwụkwọ, na onye na-ese ihe osise, Dindga na-ewere onwe ya dị ka ihe na-emepụta ejiji na ónyé na'ahụ maka mgbidi na onye na na-ebi akwụkwọ. Ọrụ ya gụnyere ndụ ụmụ nwanyị, foto, na akụkọ ihe mere eme.

N'ịzaghachi ịkpa ókè nwoke na nwanyị na ịkpa ókè agbụrụ n'ụwa nka, ndị na-ese ihe na 1960s na 1970s mepụtara otu dị ka ụzọ isi lụso mmegbu ọgụ. N'afọ 1960, McCannon bụ ónyé otu Weusi Artist Collective. Nke a bụ otu McCannon si nwee mmasị na Black Arts Movement.[2] Weusi Collective nwèrè mmasị n'ịmepụta nka nke na-akpali isiokwu na akara ndị Afrịka, yana igosi mpako ojii nke oge a.[3] N'afọ 1971, ọ kwadoro nzukọ mbụ nke Where We At nke ụmụ nwanyị ojii na-ese ihe n'ụlọ ya, nke tolitere n'otu n'ime ihe ngosi mbụ nke ụmụ nwanyị isi ojii na-eme ihe nkírí na New York City.[4]

N'afọ 2015 ọ bụ ónyé ngosi na Art of Justice: Articulating an Ethos and Aesthetic of the Movement conference na Mahadum New York nke Caribbean Cultural Center African Diaspora Institute gosipụtara na mmekorita ya na Ngalaba nke Art na Public Policy, Mahadum Nueva York; Institute of African American Affairs, Mahadim New York; na Institute for Research in African American Studies, Mahaduma Columbia.[5]

A na-etinye onyinyo ya na ihe ngosi 1972 Some Living American Women Artists nkè Mary Beth Edelson.[6]

Ihe osise[dezie | dezie ebe o si]

McCannon nwèrè akwa (nke akpọrọ "Yekk's Song") na nchịkọta na-adịgide adịgide nke Schomburg Center for Research in Black Culture.[7] N'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, e rere ihe osise mmanụ McCannon, "The Last Farewell" maka $ 161,000 dị ka akụkụ nke usoro mmebi ego nke Johnson Publishing Company. Ọrụ a bụ akụkụ nke nchịkọta onwe ha, nke gụnyekwara ọrụ Henry Ossawa Tanner na Carrie Mae Weems.[8]

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

  • 2005 N. Y. F. A. Fellowship Crafts
  • 2007 Urban Artists Initiative, Harlem Arts Alliance
  • 2008 Northern Manhattan Arts Alliance Onye na-ese ihe n'otu n'otu Grant 2009 Northern Manhattan Arts League Onye na-eme ihe n'ọkwa Grant

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Cotter. "To Be Black, Female and Fed Up With the Mainstream", The New York Times, 2017-04-20. Retrieved on 2019-04-05. (in en-US)
  2. Articulate — Dindga McCannon (en-US). Articulate. Retrieved on 2020-02-18.
  3. Brown (2012-07-11). "The Weusi Artists" (in en). Nka: Journal of Contemporary African Art 30 (1): 60–67. ISSN 2152-7792. 
  4. Curator Catherine Morris runs us through Brooklyn Museum’s show, We Wanted a Revolution: Black Radical Women (en). www.itsnicethat.com. Retrieved on 2020-02-18.
  5. Nov. 7th | The Art of Justice Conference. cccadi.org. Archived from the original on 2015-11-09. Retrieved on 2015-11-11.
  6. Some Living American Women Artists/Last Supper. Smithsonian American Art Museum. Retrieved on 22 January 2022.
  7. Black Threads: An African American Quilting Sourcebook by Kyra E. Hicks, page 158.
  8. Dudek (2020-02-04). Johnson Publishing Co. art auction fetches nearly $3 million, doubling expectations (en). Chicago Sun-Times. Retrieved on 2020-02-08.