Dolly Unachukwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Dolly Unachukwu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereDolly Dezie
aha ezinụlọ yaUnachukwu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Novemba 1969 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ȯra Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1986 Dezie

Dolly Unachukwu (a mụrụ n'ọbọchị nke 1 n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1969) bụ nwaafọ Naijiria na-eme, na-arụputa, na-ede, ma na-ahazi ihe nkiri. Otu n'ime ndị ọsụ ụzọ nke Nollywood, o nwetara aha n'obodo dịka Fadake Akin-Thomas n'ihe nkiri ahụ a kpọrọ Fortunes . [1]

Dolly Unachukwu bu otu n’ime ndi bidoro Nollywood,ezigbo onye omee, odee, na-arụpụta ihe nkiri. Unachukwu a mụrụ n’afọ 1969 n’ezinaụlọ dị asaa, bidoro ọrụ ihe nkiri mgbe ọ dị afọ iri na isii. Nwaafọ Amichi n'Anambra steeti, bụ onye pụtara n'ihe nkiri mbụ nke obere n’afọ 1985 dịka odeakwụkwọ. Ka oge na-aga n'afọ ahụ, a họpụtara ya i sonye n'ihe nkiri kachasị mma oge ahụ bụ Mirror in the Sun dịka Prisca, mana ọ bụ ọrụ ya na Fortunes mere ka ọ bụrụ aha a ma n'ezinụlọ n'afọ 1993, ebe ọ zara 'Fadeke', nwanyị di ya ji ezigbo egoa na-emegbu emegbu, ezigbo nwanyị Naijiria. Unachukwu mere onyeihe nkiri izizi ya n’ime Deadly Affair na Deadly Affair II, ebe ya na ndi aka ochie nollywood dika; Emeka Ike, Sandra Achums na Jide Kosoko pụtakọrọ. Ịsu asusu atọ Naijiria di iche na ihe nkiri a, Unachukwu pụtara n'ihe nkiri na-ese okwu bụ Glamour Girls dị ka onye ahịa mgbere nwanyị, ihe nkiri mechara nweta nrite ihe nkiri Naịjirịa kachasị ewu ewu n'America n'afọ 1995.

N’afọ 1997, Unachukwu meputara akuko ndu ya bu “ Wildest Dream” . N'ihe nkiri ahụ, ọ kọrọ akụkọ nhụjuanya nke alụmdi na nwunye mbụ ya, nke dara n'afo 1994, mere ya nne enweghị di. Di ya yiri egwu ịgba ya akwụkwọ n'ihi iji ezigbo aha ya eme ihe nkiri ahụ. Unachukwu lụrụ ọzọ n’afọ 2000 ma n’ọnwa asatọ nke afọ ahụ ọ gawara isonyere di ya n’Ingland, ma ya na ya kewara n’ọdụ ụgbọelu mgbe ọ matara na ọ bụghị eziokwu ka o kwuru. Ugbu a na Ingland, Unachukwu nwetakwara ihe ọmụma ka ọ nwetara European Computer Driving License n'afọ 2002 ma bido mmụta n'afọ na-eso ya n'ihe nkiri na Mahadum nke East London, na-ewe afọ abụọ i ji lekọta nwa ọhụrụ ya bịara n'afọ 2004. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Juunu afọ 2008. Unachukwu mepụtara ma duzie ihe nkiri nke ya nke a kpọrọ The Empire n'afọ 2005, mgbe ọ na-ahapụ mahadum.

Unachukwu gara Television College na Jọs dị na Plateau Steeti, ebe ọ natara diplọma na Television Production n'afọ 1988. O mechara gaa ọmụmụ fọnetik n'afọ 1989 na FRCN Training School Legos ma mechaa gaa Lagos State University n'afọ 1990 were nweta diplọma na Iwu.

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • Mirror in the Sun (TV) 1986
  • Fortunes (TV) 1993
  • Deadly Affair 1995 1 & 2 1994
  • Glamour Girls 2 1995
  • Tears for Love 1996
  • Deadly Affair II 1997
  • Deadly Passion 1997
  • Wildest Dream 1997
  • Love without Language 1998
  • Brotherhood of Darkness 1998
  • Father Moses 1999
  • Full Moon 1 & 2 1999
  • War of Roses 2000
  • The Empire 2005
  • Sisters Love 2007

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. ukwu

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Dolly Unachukwu on IMDb