Dorothy Hyuha
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Uganda |
aha enyere | Dorothy |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1962 |
Ebe ọmụmụ | Uganda |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the Parliament of Uganda |
ebe agụmakwụkwọ | Makerere University |
Ebe obibi | Butaleja |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
Dorothy Samali Hyuha bụ onye nnọchi anya mba Uganda, onye nkuzi, na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ Kọmishọna Ukwu (Ambassador) nke Uganda na Malaysia.[1] Ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-enweghị ọfịs na Cabinet nke Uganda.[2] Site na afọ 2006 ruo na afọ 2011, Hyuha jere ozi dị ka Butaleja District Woman MP na Nzukọ Ndị Omeiwu Ugandan. N'otu oge ahụ, ọ rụrụ ọrụ dịka osote odeakwụkwọ ukwu nke National Resistance Movement (NRM) ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[3]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A họpụtara Hyuha na mbụ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda na afọ 1996 dị ka onye nnọchi anya Tororo District, ọfịs ọ nọrọ ruo na afọ 2006. Mgbe e wepụrụ Butaleja District na Tororo District na afọ 2006, ọ meriri oche ndị omeiwu nke onye nnọchi anya ụmụ nwanyị maka Butalehja District na tiketi NRM. Ọ nọ n'ọkwa ahụ ruo mgbe Cerinah Nebanda meriri ya n'afọ 2011.[3] Site na afọ 2009 ruo 2011 ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-enweghị Portfolio.[2] N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2012, a họpụtara Hyuha ka ọ bụrụ Kọmishọna Ukwu nke Uganda na Tanzania, ebe ọ jere ozi ruo n'ọnwa Agọstụ n'afọ 2017 wee kwaga Malaysia n'otu ọrụ ahụ.[4] Ọ na-eje ozi ugbu a na High Commission nke Republic of Uganda na Malaysia.[5]
Nkọwa nke onwe
[dezie | dezie ebe o si]Ọ bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị NRM na-achị. Ọ lụrụ Daniel Hyuha, onye nwụrụ na Disemba 2014 mgbe ọ dị afọ 68.[6] Ha nwere ụlọ atọ na Butalja District.[3]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Ógbè Butaleja
- National Resistance Movement
- Kọmitii nke Uganda
Ebenside
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ webadmin. Uganda High Commission to Malaysia. kualalumpur.mofa.go.ug. Archived from the original on 10 October 2017. Retrieved on 10 October 2017.
- ↑ 2.0 2.1 Uganda State House (19 January 2015). President Pays tribute to late Danny Hyuha. Uganda Media Centre. Archived from the original on 10 October 2017. Retrieved on 2 November 2016.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 Olaka (15 December 2012). Police Deploy At Dorothy Hyuha's Homes After MP Nebanda's Death. Uganda Radio Network. Retrieved on 2 November 2016.
- ↑ Administrator (18 August 2012). M7 Reshuffles Envoys, Ssebagala Appointed Presidential Advisor. Chimpreports.com. Retrieved on 2 November 2016.
- ↑ Bwire (27 January 2017). Museveni appoints 37 new ambassadors. www.monitor.co.ug. Retrieved on 10 October 2017.
- ↑ Nampala (14 December 2014). Dan Hyuha has been laid to rest. Retrieved on 2 November 2016.