Edmund Daukoru

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Edmund Daukoru
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEdmund Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Ọktoba 1943 Dezie
Ebe ọmụmụNembe Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiNembe Kingdom, Secretary General of OPEC, Minister of State for Energy Dezie
ebe agụmakwụkwọImperial College London, gọọmentị kọleji Umuahia Dezie

Ndabere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Daukoru na 13 Ọktoba 1943 na Bayelsa Steeti nwere mmanụ.[1] O nwetara Ph.D na Geology na Imperial College, London. Shell International Petroleum Company were ya n'ọrụ site n'afọ 1970, ebe o si na Chief Geologist ruo General Manager of Exploration na Nigeria.[2] N'afọ 1992, ọ ghọrọ onye isi nchịkwa nke Nigerian National Petroleum Corporation .[3]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2003, Daukoru ghọrọ onye ndụmọdụ onye isi ala na mmanụ ala na ike, na Julaị afọ 2005, a họpụtara ya dịka Mịnịsta nke steeti maka ike na kabinet nke onye isi ala Olusegun Obasanjo.[3] A họpụtara ya ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu nke OPEC na 1 Jenụwarị 2006 maka otu afọ.[4]

Onye ọchịchị ọdịnala[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Daukoru ka ọ bụrụ Amayanabo, ma ọ bụ onye ọchịchị ọdịnala nke Alaeze Nembe na Bayelsa steeti, were aha Mingi XIII.[5] Esemokwu dị n'etiti obodo Bassambiri na Ogbolomabiri nke alaeze Nembe ochie malitere ihe karịrị afọ 200. N'ọnwa Eprel afọ 2010, gọọmentị Bayelsa Steeti nwara ọzọ idozi nsogbu ndị a, na-akpọkọta Daukoru na Ralph Iwowari, Amanyanabo nke Nembe Bassambiri, na ndị isi ndị ọzọ iji chọta ngwọta.[6] Mgbe nzukọ ahụ gasịrị, ndị eze abụọ ahụ kwuru na ha nwere nchekwube na enwere ike idozi ọdịiche dị n'etiti obodo abụọ ahụ na-ese okwu.[7] N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2010, ndị ntorobịa bu ngwá agha n'ụgbọ mmiri na-agba ọsọ wakporo obí Daukoru bụ ndị kekọtara ndị nche, zuo uwe ọdịnala ma bibie obí eze ahụ.[8]

Ndetu[dezie | dezie ebe o si]

  1. Edmund Daukoru: From oil to royalty (en-US). Vanguard News (2022-01-13). Retrieved on 2022-03-18.
  2. HRM King Dr. Edmund M. Daukoru. Niger Delta Affairs. Archived from the original on 2017-03-22. Retrieved on 22 September 2020.
  3. 3.0 3.1 NIGERIA - Profile - Edmund Daukoru.. APS Review Downstream Trends (August 22, 2005). Retrieved on 2010-09-18.
  4. Secretaries General of OPEC 1961–2008. OPEC. Retrieved on 16 January 2016.
  5. Hector Igbikiowubo (November 16, 2009). Daukoru harps on optimising returns on petroleum. Vanguard. Retrieved on 2010-09-18.
  6. Bayelsa promotes peace in Nembe. 234Next (2010-04-19). Archived from the original on 2011-07-28. Retrieved on 2010-09-17.
  7. Femi Folaranmi (May 5, 2010). At Nembe, it's a new, peaceful dawn. Nigeria Best Forum. Retrieved on 2010-09-17.
  8. Samuel Oyadongha (August 11, 2010). Daukoru's Nembe palace attacked, artifacts stolen. Vanguard. Retrieved on 2010-09-18.

 Àtụ:Cabinet of President Olusegun Obasanjo 2003-2007