Efunroye Tinubu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Efunroye Tinubu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaTinubu Dezie
aha ọmaIyalode Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1805 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1887 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, slave trader Dezie
nhazi nke ọhaslave owner Dezie

Efunroye Tinubu (c. 1810 ̊ 1887), a mụrụ Ẹfúnpọ̀róyè Ọ̀ṣuntinúbú, [1] bụ nwanyị Yoruba nke dị ike, onye a maara nke ọma n'ịzụ ahịa, nakwa onye n'ere ndị ohu n'ala Naịjirịa tupu enwee ọchịchị ndị ọcha nakwa oge enwere ọchịchị ndị ọcha.[1][2][3] Ọ bụ onye amaara ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ihe gbasara akụ n'ụba na Lagos n'oge ọchịchị nke ndị Ọba (ndị eze) Adele, Dosunmu, Oluwole, nakwa Akitoye, nyekwara ndị Ọba abụọ ikpeazụ aka inweta ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ lụrụ Oba Adele nke Lagos, ma jirikwa njikọ di ya nwere guzobe netwọk azụmahịa na-aga nke ọma n'etiti ndị ahịa Europe ndị n'ere ohu, ụtaba, nnu, ogho, mmanụ nkwụ, mmanụ akị bekee, na égbè. A na-ekwu na o nwere ihe karịrị ndị ohu narị atọ na iri isii.[4]

Ọ resịrị ndị ahịa Brazil nakwa Europe ndị ohu were mebie nkwekọrịta nke afọ 1852 ya na ndị Great Britain kwekọritara ịmachibido ahia ohu na Lagos.[4] Ọchịchị akụ na ụba ya na Lagos na ahia ohu nzuzo mere ka ya na ndị Britain, yana ndị ahịa Lagos ndị ọzọ nwee esemokwu. A chụgara ya na Abeokuta n'okpuru nrụgide ndị Britain mgbe ọ kpara nkata aghụghọ na-enweghị isi iji wepụ mmetụta ndị Britain na Lagos. Mgbe ọ nọ na Abeokuta, o nyere aka nye obodo ahụ mgbọ n'oge agha mmeri ya megide Alaeze Dahomey, si otú a nye ya utu aha isi nke Iyalode iji sọpụrụ ya.

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Bonnie G. Smith (2004). Women's History in Global Perspective, Volume 3. University of California, Berkeley (University of Illinois Press). ISBN 9780252072345. 
  2. "Madam Tinubu: Inside the political and business empire of a 19th century heroine", The Nation. Retrieved on July 29, 2016.
  3. Judybee (2011). Madam Tinubu: Queens of Africa. MX Publishing. ISBN 978-1-908-2185-82. 
  4. 4.0 4.1 Madam Efunroye Tinubu (ca. 1805-1887) •. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "bp" defined multiple times with different content