Ekanem Ikpi Braide

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ekanem Ikpi Braide
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Maachị 1946 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Cross River Dezie
Ọrụ ọ na-arụosote onyeisi mahadum Dezie
onye were ọrụFederal University of Lafia, Cross River University of Technology, Arthur Jarvis University Dezie
ebe agụmakwụkwọCornell University, Mahadum Obafemi Awolowo Dezie
Onye òtù nkeNigerian Academy of Science Dezie
Ihe nriteFellow of the Nigerian Academy of Science Dezie

Ekanem Ikpi Braide ( OFR ) amụrụ ya n' ụbọchị isii nke ọnwa Maachị 1946, bụ nwanyị onye Naijiria Parasitologist. Ọ bụ osote onye isi oche nke Cross River University of Technology (CRUTECH), Calabar.[1] Ọ bụ kwa onye oso ụzọ Vice-Chancellor nke Federal University of Technology, Lafia . [2] Ekwuru na ọ bụ onye nyere aka na mkpochapụ guiworm na Naịjirịa. N'afọ puku abụọ na iri abụọ (2020), e mere ya nwanyị mbụ onye isi oche-ahọpụtara nke ụlọ akwụkwọ sayensị nke Naijiria . [3] [4] Braide bụ onyeisi oche nke Board of Trustees, The Leprosy Mission (TLM) Nigeria. Ọ bụ Pro-Chancellor nke Mahadum Arthur Jarvis, Akpabuyo, Nigeria. Ọ bụ nwanyị mbụ onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ sayensị nke Naijiria.

A mụrụ Braide na


Cross R steeti,iverafo na 1946, wee gaa ụlọ akwụ na kwọ St Anne's Ibanke nọ na Oyo steeti dan mụgumalọ akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gụrụ zoology na Mahanke dum Ife tupu ọ nwkwe ata akara ugo mmụta Master na Parasito na afo logy (1973), na akDra doctorate na Epedimiolosite na gy, Mahadum Cornedị n' obodo ll, New Yna afọ ork (1978). O ji akwụkwọ asambodo na usoro ọrịa na-efe efe sitere na Mahadum Southampton (Agụmakwụkwọ Council Britain). Ọòbụ onye otu na ngalaba-nchoputa, Nigerian Society of Parasitology; Onye otu, Ụlọ Nzukọ Ọmụmụ Salzburg 319; Onye otu (President họpụtara) Ụlọ akwụkwọ sayensị nke Naijiria

N'oge mmalite nke ọrụ ya, Braide kụziri na Community Secondary School, Ugep site na afọ 1966 ruo afọ 1968, tupu ọ gafere na College of Education, Port Harcourt, River steeti n afọ (1973), ma mesịa gaaMahadum Nigeria, Nsukka ebe ọ gụrụ nkuzi n'etiti n' afọ 1973 na 1976. N' ime afọ 1978, a họpụtara ya Officer/Researcher (ọsụ ụzọ) na-elekọta ngalaba Onchocerciasis Control Unit nke Nigerian Institute for Trypanosomiasis Research, Kaduna ruo n' afo 1979. Braide rụkwara ọrụ na Mahadum Calabar kemgbe n' afọ 1979. Ebuliitere ya ịbụ Prọfesọ na 1991. [5]

Mmasị nyocha Braide na-elekwasị anya na njikwa ọrịa karịsịa nyocha ọrụ, nyocha mmetụta nke ntinye aka, ụzọ nyocha ngwa ngwa na ọrịa nke eserese na atụmatụ obodo na njikwa ọrịa. N'agbata afọ 1988 na 1998, Braide bụ Zonal Facilitator, Nigerian Guinea worm Eradication Programme (South East) , wee sonye na World Health Organisation / Federal Government of Nigeria Guinea worm Eradication Certification Committee ruo n ' afọ 2013 mgbe Nigeria nwetara asambodo nke nnwere onwe pụọ na Guinea worm . [3] Braide achikọtala ndị otu Anglophone maka emume nke Africa na njikwa Onchocerciasis (APOC), ntule mmetụta mba dị iche iche nke emume nchịkwa onchocerciasis na Sudan, Ethiopia, Uganda, Tanzania na Nigeria . [6] Ọ bụ onye otu TDR / APOC nke mepụtara RAPLOA, ngwá ọrụ nyocha ngwa ngwa iji achọpụta oke Loa loa maka njirimara ngwa ngwa nke obodo na mpaghara ndị na-ejikọta maka onchocerciasis na loaisis bụ ndị nwere nnukwu ihe ize ndụ nke mmeghachi omume ọjọọ na ọgwụgwọ Ivermectin. N' afọ 2001, Braide bụ onye otu WHO/APOC Technical Consultative Committee (TCC), na na afọ 2003, ọ were ọnọdụ onye isi oche nke kọmitii ahụ ruo afọ 2006.

N'agbata afọ 2003 na 2006, Braide jere ozi dị ka onye so na kọmitii Mectizan Expert. Site na afọ 2007 ruo 2018, ọ jere ozi dị ka onye otu (Onye isi oche ọzọ) nke National Steering Committee, Nigerian Leglected Tropical Diseases Programme. N'afọ 2018, a họpụtara Braide ka ọ bụrụ onyeisi oche, kọmitii ndụmọdụ nka na ụzụ, emume ọrịa na-efe efe nke steeti Cross River. Ọ bụ onye otu Board of Trustees of Sightsavers afọ asatọ, ma bụrụ onye isi oche nke Technical Advisory Group (TAG) (afọ 4 Sightsavers) DFID kwadoro ọrụ NTD UNITED nke kwụsịrị na 2019. 

Ọ bụ Vice Chancellor nke mbụ nke Federal University of Technology, Lafia malite n' afọ 2011 rue n 'afọ 2016 na Vice-Chancellor Cross River University of Technology (CRUTECH), Calabar (2004 - 2009). Ọ bụkwa otu n'ime ndị isi oche nke ụlọ ọrụ na-abụghị gọọmentị nke Nigeria, Society for Family Health, Nigeria. [7]

Braide bụ onye nnata nke Jimmy/Roslynn Carter Award maka nraranye pụtara ìhè na mmezu ya na mkpochapụ guinea worm na Nigeria. N'afọ 2000, ọ nwetara ihe nrite Cross River State 2000 Millennium Award. [7] N'ọnwa Julaị afọ 2010, Braide nwetara ihe nrite ugwu mba Naijiria nke Officer of the Order of the Federal Republic (OFR), maka ntinye aka ya n'ịchịkwa ọrịa na Naijiria nke onye isi ala Naijiria nyere ya. 

N'afọ 2020, e mere ya onyeisi oche nke ụlọ akwụkwọ sayensị nke Naijiria . Ọ ga-abụ nwanyị mbụ ga-abụ onye isi oche nke agụmakwụkwọ na Jenụwarị 2021 mgbe ọ nọchiri Prọfesọ Kalu Mosto Onuoha . Braide abụrụla onye osote onye isi oche nke Academy. [8]

  1. "Nigeria: Goes Tough On Sorting".
  2. Activist. Ex CRUTECH, FULafia VC, Professor Braide Is First Academy Of Science Female President (en-US). Retrieved on 2020-04-29.
  3. 3.0 3.1 Nigerian Academy of Science elects first female president (en-GB) (2020-02-12). Retrieved on 2020-04-29.
  4. NIGERIAN ACADEMY OF SCIENCE ELECTS ITS FIRST FEMALE PRESIDENT (en-US). Flourish Africa (2020-02-17). Archived from the original on 2020-08-15. Retrieved on 2020-04-29.
  5. :: University Of Calabar ::. www.unical.edu.ng. Retrieved on 2020-12-09.
  6. Professor Ekanem Ikpi Braide | Society for Family Health, Nigeria. www.sfhnigeria.org. Archived from the original on 2020-02-29. Retrieved on 2020-04-29.
  7. 7.0 7.1 Professor Ekanem Ikpi Braide | Society for Family Health, Nigeria. www.sfhnigeria.org. Archived from the original on 2020-02-29. Retrieved on 2020-02-29.
  8. 1st female President-elect of Nigerian Academy of Science (en-US). Vanguard News (2020-02-19). Retrieved on 2020-02-29.

Edensibịa