Eme Ufot Ekaette

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Eme Ufot Ekaette
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Julaị 1945 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Akwa Ibom Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Eme Ufot Ekaette ( amuru na abali iri abuó na otu na onwa nke asaa na afo 1945) onye a hoputara Senator maka ndi ala Akwa Ibom South no na steeti Akwa Ibom State n'obodo Nigeria. Obanyere okwa ahu abali iri abuó na itolu na onwa May na afor 2007. Eme so na njiko ndi People's Democratic Party (PDP).[1]

Ekaette natara asambodo nke anakpo B.Pharm (Hons) na mahadum nke Obafemi Awolowo University, Ife n'afo 1970. Ojiri okwa ndi a dika onye isi n'ahu maka mmeputa ogwu n'ulo oru NNPC, onye isi n'ulo ogwu ndi agha. Onye isi n'ulo oru Safi Pharm, onye otu ndi n'ahu maka UBEC na onye so achikwa oba ego nke a n'akpo Union Bank. Di ya, Ufot Ekaette, bu onye nnukwu olu oyibo onye nke n'achi obodo Nigeria by Olusegun Obasanjo nyere okwa ode awkwukwo nke obodo Nigeria (SGF) n'abali iri abuó na itolu na onwa ise, na afo 1999. O mechara ruo oru dika minista n'ahu maka Niger Delta na ndi isi obodo nke onye isi ala Umaru Yar'Adua.[2][3]

Mgbe o nyesịrị oche ya na Senate na June 2007, a họpụtara Ekaette ka ọ nonye n'otu kọmitii nke umu nwaanyi na ndi Ntorobịa, Mmekọrịta obodo na nke mba ọzọ, Ahụike na gburugburu ebe obibi. N'ime nnyocha onwa oge nke ndị Senators na May 2009, Akwukwo ozi 'ThisDay' kwuru na ọ kwadobeghị aro ọbụla mana o gosipụtara idu ndú ya na Kọmitii Mmepe Ụmụanyị. Mgbe e mesịrị, ọ kwadoro aro banyere uwe mgbokwasị, nke a maara dị ka aro ịgba ọtọ. Iwu ahụ e nyere kwadoro umu nwaanyi ije nga onwa ato maka ndị nke na-egosipụta bọtịnụ afọ ha, ara ma ọ bụ na-eyi uwe mwụda n'èzí. Ndị nnọchiteanya nke ndị Naijiria gosipụtara aro ahụ na nke a n'akpo United Nations General Assembly, bụ ebe ọ dọtara ụfọdụ nnyocha, ọ bụkwa isiokwu nke nnukwu esemokwu na Nigeria..[4]

Nrutuaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sen. Eme Ufot Ekaette. National Assembly of Nigeria. Retrieved on 2010-06-15.
  2. JOE EFFIONG (1 May 2007). WAR OF WORDS: SGF, Ufot Ekaette and kinsmen trade blames over each other’s usefulness. Daily Sun. Archived from the original on 9 October 2007. Retrieved on 2010-04-16.
  3. LUCKY NWANKWERE (24 December 2008). Yar’Adua swears in four new ministers, tasks them on corruption. Daily Sun. Retrieved on 2010-04-16.
  4. Chioma Gabriel (19 July 2008). Nudity Bill: How Govt Officials Embarrassed Country With a 73-man Delegation at the UN. Vanguard. Retrieved on 2010-06-15.