Emeka Ilechukwu
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 11 Ọgọọst 1975 |
| Ebe ọmụmụ | Nnewi |
| Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ, onye ese, onye na-ahu maka ihe nkiri |
| Ebe agụmakwụkwọ | Institute of Management and Technology |
| Isi agụmakwụkwọ | visual arts |
| Ụcha ime anya | agba aja aja |
| Ọrụ ama ama | Wikimedia Commons, Wikimedia Commons, Wikimedia Commons |
| Ihe nrite | class of award |
| Nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Emeka Ilechukwu (amụrụ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1975) bụ onye na-ese ma na-emepụta nka na Naijiria nke na-eji ọtụtụ ihe emepụta nka akụkụ atọ (3D).[1]Ọtụtụ oge na nka akpụrakpụ ma nke eserese.[2]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]Ilechukwu si Nnewi, obodo dị na Anambra steeti, Naịjirịa. Ọ gara Institute of Management and Technology (IMT) Enugu, Enugu State, Nigeria. Ilechukwu nwere Higher National Diploma (HND) na Fine Arts ma ọ bụ ọkachamara na ihe ọkpụkpụ.
Ihe ngosi
[dezie | dezie ebe o si]N'afọ 2016, Ilechukwu sonyere na ihe ngosi Art, the Retro Africa Way nke akpọrọ Africa Modernism . Ilechukwu sonyere ndị ọzọ na-emepụta nka mgbe a mere mmemme a, n'etiti ha bụ Duke Asidere, Anthea Epelle, Tyna Adebowale, Joe Essien, Joseph Eze, Anthonia Nneji, Bob-Nosa Uwagboe, Khenye Gager, Chika Idu, Chukz Oknokwo, Karen Gager, Terna Iwar, Tolu Aliki, Frank Enebeli, Uchay Joel Chima, na ndị ọzọ.[3]Ilechukwu ahazila ihe ngosi ise naanị ya mere, salons iri ise ma mekọta ihe ngosi ya na ndị omenka ndị ọzọ nọ na mpaghara à na mba ụwa.[4]
Ọrụ ńká
[dezie | dezie ebe o si]Ihe osise Ilechukwu sitere na ahụmịhe na ihe omume na-eme gburugburu ya. Ụfọdụ n'ime ihe osise ya sitere n'ihe omume dị kà Mother's Day, ụwa ịntanetị nkè ugbu à na-agbanwe agbanwe, wdg[4]
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- Emeka Ilechukwu na Google Knowledge Panel
Edensibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Emeka Ilechukwu (en). Aworanka. Archived from the original on 2022-02-12. Retrieved on 2022-06-09.
- ↑ Rapheal (2022-07-01). Ilechukwu’s inspirational painting, welded metal (en-us).
- ↑ Akinwale (2016-10-08). Art, the Retro Africa Way (en-US). THISDAYLIVE. Retrieved on 2022-06-09.
- ↑ 4.0 4.1 Ilechukwu’s art dissecting opposing forces of life (en-GB) (2022-07-02).