Emilia Broomé

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Emilia Broomé

  Emilia Augusta Clementina Broomé, née Lothigius (13 Jenụwarị 1866 - 2 Juun 1925), bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Sweden (nke nnwere onwe), onye na-ahụ maka ụmụnwanyị na onye na-eme udo. Ọ bụ nwanyị mbụ na nzukọ omeiwu Sweden (1914).

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Emilia Broomé na 13 Ọktoba n'afọ 1866 na Jönköping. A zụlitere ya na Jön köping, ebe ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ ụmụnwanyị dị n'ógbè ahụ.[1] E nyere ya akara ugo mmụta ọkachamara na Wallinska skolan n'afọ 1883 ma gụsịrị akwụkwọ na nkà ihe ọmụma na ọgwụ na Uppsala n'afọ 1884. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi na ụlọ akwụkwọ Anna Whitlock na Stockholm.[2]

Ọ bụ onye isi oche nke Stockholmsföreningen för kvinnans négoci rösträtt (The Stockholm Branch of the National Association for Women's Suffrage) site na ntọala ya n'afọ 1902 ruo 1906.[2] Ọ bụ onye otu ndị nduzi nke Centralförbundet för Socialt Arbete [sv] (The Society for Social Welfare) na 1904-1925, na onye otu Stockholm Direction of Education.[1]

Ọ bụkwa onye isi oche nke Peace union of the women of Sweden, site n'afọ o guzobere ya n'afọ 1898 ruo mgbe ọ jikọtara ya na Swedish peace union n'afọ 1911, ma rụọ ọrụ dị ka onye nnọchi anya Sweden na nzukọ udo mba ụwa na Haag na 1899.[3][4]

A họpụtara Emilia Broomé maka ntuli aka na Stockholm City Council n'afọ 1910 na afọ 1911. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye kansụl obodo n'oge ntuli aka ikpeazụ ma jee ozi n'afọ 1911 na afọ 1924. Ọ bụ onye isi oche nke ụmụnwanyị nwere nnwere onwe 1917-1920.[1]

Emilia Broomé bụ nwanyị Sweden mbụ so na kọmitii iwu steeti Sweden (Lagberedningen), nke kwadebere maka iwu ọhụrụ na nke o jere ozi dị ka onye otu na 1914-1918. O sonyere n'ide iwu alụmdi na nwunye a gbanwere agbanwe na 1920, nke e mere ka ndị ikom na ndị inyom hara nhata ma kwupụta na nwanyị lụrụ di nwere ọtụtụ n'ime iwu; na iwu nke ụgwọ ọrụ hà nhata maka ndị ikom na ụmụnwanyị na 1921; na iwu (Behörighetslagen) nke nyere ụmụnwanyị ikike ịrụ ọrụ niile na 1923.[2]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Hanna Lindberg
  • Ndepụta nke ndị na-eme udo

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Steinrud. Emilia Augusta Clementina Broomé. Svenskt kvinnobiografiskt lexikon. Retrieved on 7 June 2019.
  2. 2.0 2.1 2.2 Emilia Broomé. Göteborgs universitetsbibliotek. Retrieved on 7 June 2019.
  3. Emilia Broomé. Women In Peace. Retrieved on 7 June 2019.
  4. Rosengren. Emilia A C Broomé (f. Lothigius). Riksarkivet. Retrieved on 7 June 2019.

Ebe e si nweta ya[dezie | dezie ebe o si]

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Emilia Broomé at Svenskt kvinnobiografiskt lexikon