Eno Ebenso

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Eno Ebenso
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoEbenso Dezie
Aha enyereEno Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya18 Novemba 1964 Dezie
Ebe ọmụmụOkobo Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụresearcher Dezie
ụdị ọrụ yaresearcher Dezie
onye were ọrụNorth-West University, North-West University - Mafikeng Campus Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, University of Calabar Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuArsenal F.C. Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
kọntinentEluàlà Dezie
otu egwuregwuPremier League Dezie
Ihe nriteMember of the Academy of Science of South Africa Dezie

Eno E. Ebenso (amụrụ 18 Nọvemba 1964) bụ ọkammụta n'isi ọmụmụ Physical Chemistry bụ ọkachamara na mgbochi ihe ịta nchara.

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Eno Ebenso na 18 Novemba 1964 n'okpuru ọchịchị Okobo, Steeti Akwa Ibom, Naijiria.[1] Ebenso nwetara nzere BSc n'isi ọmụmụ Chemistry site na Mahadum Calabar, Naijiria n'afọ 1986, nzere MSc n'isi ọmụmụ Physical Chemistry na Mahadum Ibadan, Naijiria n'afọ 1990, na nzere PhD n'isi ọmụmụ Physical Chemistry sitere na Mahadum Calabar, Naijiria n'afọ 2004.[2][3]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Eno Ebenso malitere ọrụ nkuzi ya na Mahadum Calabar dị na Naijiria n'afọ 1990, na-ewere ọrụ nke onye nkuzi enyemaka.[4] Ka afọ nọ n'agafe, ọ nwetara mbuli n'ọ́kwá na ọganihu site n'ọkwa ndị gụrụ akwụkwọ, malite n'ịbụ Lecturer II n'afọ 1993, Lecturer I n'afọ 1997, na onye nkuzi ndị isi ya n'afọ 2001.[1] N'afọ 2005, ọ gbasoro ịbụ onye òtù ọkankuzi na Institute of Materials Research, Technical University nke Darmstadt na Germany. Ọzọkwa, n'afọ 2006, ọ gara ezumike na ngalaba Chemistry, Mahadum Uyo, Naijiria.[5] N'ikpeazụ, Ebenso gafere na Ngalaba Chemistry na Teknụzụ kemịkalụ na National University of Lesotho na South Africa. Otú ọ dị, njem mmụta ya dugara ya na mpaghara ụlọ ọmụmụ Mahadum North-West dị na Mafikeng na South Africa, bụ ebe o sonyere dị ka ọkammụta zuru oke na ngalaba Physical Chemistry na Ngalaba Chemistry n'afọ 2009.[6] N'oge ọ nọ n'ọchịchị na mahadum, ọ weere ọrụ nchịkwa dị iche iche, gụnyere onye isi oche isiokwu na Chemistry, onye nduzi nke Ụlọ Akwụkwọ Mathematical na Physical Sciences, Executive Dean, Faculty of Agriculture, Science and Technology, and onye nduzi nwa mgbe nke Material Science Innovation and Modelling Research Focus Area (MaSIM). Ọzọkwa, ọ rụrụ ọrụ nwa oge dị ka onye osote onye isi oche (nyocha na atụmatụ) na Mahadum Mafikeng nke North-West. Ruo 31 Disemba 2019, ọ nọ n'ọkwá Executive Dean nke ngalaba Natural and Agricultural Sciences na Mahadum North-West niile.[3]

Nnyocha ndị O Mere[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Scholia Mmasị nnyocha Ebenso gụnyere ịta nchara, adsorption, inorganic chemistry, electrochemistry, na Langmuir adsorption model.[7] Ebenso bụ onye ama ama na chemistry nke ihe ịta nchara onye bipụtarala ihe nke ukwuu na mpaghara Kemịstrị igbochi ihe ịta nchara. N'ihe dị ka ebe Jun 2023, O nwere H-Index n'ógó nke iri itoolu na asatọ na ihe karịrị ikpọtu ihe ndị o dere aha karịrị ugboro puku iri atọ na otu.[8] O nwere mmetụta ntụaka nke 1% karịa nkezi ụwa; ọ bụ onye na-ede akwụkwọ kachasị mma na ngalaba nke mgbochi ihe ịta nchara n'ụwa nile ma ọ bụ akwụkwọ ya bụ nke ise akacha ebudata n'ụwa nile na ngalaba nke mgbochi ihe ịta nchara.[8]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 {{Cite web|title= Eno Ebenso | North-West University - Academia.edu|url=https://nwu.academia.edu/EnoEbenso/CurriculumVitae%7Caccess-date=2021-12-14%7Cwebsite=nwu.academia.edu} }
  2. Eno Ebenso (15 December 2021).
  3. 3.0 3.1 Ebenso | Akwụkwọ ndekọ aha ndị ọkà mmụta sayensị Africa Ebenso | Akwụkwọ ndekọ aha ndị ọkà mmụta sayensị Africa Ebenso | Akwụkwọ ndekọ aha ndị ọkà mmụta sayensị Afrịka Ebenso (en-US).
  4. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named : 0
  5. frontiersin.org/people/114312/overview Loop | Eno E Ebenso.
  6. Àtụ:Cite webụ
  7. [https: //research.com/u/eno-e-ebenso Eno E. Ebenso: H-index & Awards - Profile Academic] (en).
  8. 8.0 8.1 {{Cite web|title=Eno E Ebenso | news.nwu.ac.za|url=https://news.nwu.ac.za/experts/eno-e-ebenso%7Caccess-date=2021-12-14%7Cwebsite=news.nwu.ac.za} }