Jump to content

Ernest Azudialu Obiejesi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ernest Azudialu Obiejesi
Born (1960-04-17) 17 Eprelụ 1960 (age 64)
Nigeria
OccupationEntrepreneur, investor, philanthropist
Spouse(s)Nnenna Obiejesi

Ernest Nnaemeka Azudialu Obiejesi (amụrụ ya n'ubochi nke iri na asaa nke Onwa Eprel , na afo1960) bụ onye ọchụnta ego na onye ọrụ ebere na Naijiria. Ọ bụ onye isi oche na onye isi nchịkwa nke Nestoil na onye guzobere ntọala Obijackson.[1]

A mụrụ ya na Okija, nke Anambra steeti di na Nigeria, Azudialu Obiejesi buru uzo sonyeere azụmaahịa ezinụlọ nna ya na afo1978 tupu o guzobe ụlọ ọrụ mbụ ya, Obijackson West Africa Limited, nke na-ere ahịa gaa mpaghara West Africa. Ulo oru Nestiol nke Azudialu Obiejesi bụ ụlọ ọrụ di na Nigeria nke Injinia, Ịzụ ahịa, Iwu na inye Ikike na-emezi ụlọ ọrụ ndi na ahu maka mmanụ na gasi.[2][3]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

Obiejesi gara colegi gooment nke di na Owerri n'Imo Stati maka agụmakwụkwọ dị elu. Mgbe nke ahụ gasịrị, ya na nna ya rụkọrọ ọrụ na azụmaahịa nke ezinụlọ ha nke akporo ulo oru azumahia DA Ifeanyi na umunne ndi nwoke.[1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1983, o guzobere ụlọ ọrụ azụmaahịa mbụ ya bụ Obijackson na ọdịda anyanwụ oke Africa, nke nwere isi ụlọ ọrụ ya na Lagos.[1][4]

N'afọ 1991, Obiejesi webatara Nestoil, ụlọ ọrụ Injinia, Ịzụta, Ịrụ & Nchịkwa maka iwu paịpụ, nrụzi na mmezi ya ihe ndị metụtara ya maka ịdọrọ mmiri, ịgafe osimiri na nchebe osimiri.[5][6][7]

Neconde, otu n'ime ụlọ ọrụ ozọ Azudialu Obiejesi nwere, bụ ọkachamara na nyocha na mmepe nke mmanụ na gasi maka mmepụta na ire ngwaahịa si na mmanụ n'ala Naịjirịa.[8][9][10]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Obiejesi bụ onye guzobere na onye isi oche nke ulo ntoala Obijackson, ntọala ọrụ ebere nke onwe ya nke dị na Anambra n'ndịda Ọwụwa Anyanwụ Nijiria. Ebumnobi bụ isi nke ulo ntọala ahụ bụ imeziwanye ọdịmma mmekọrịta mmadụ na ibe ya site na ịnweta agụmakwụkwọ dị mma, ike, inweta nkà, mmepe akụrụngwa na nlekọta ahụike. Iba ọgaranya na omenala, ọkachasị na omenala Igbo, bụkwa isi ihe ana-elekwasị anya maka ulo ntọala ya site na ihu nke ememe omenala Okija.[11][12][13][14]

Ebemside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Garlands for Ernest Azudialu-Obiejesi, Oil & Gas Icon, at 60 (en-US). THISDAYLIVE (2020-04-12). Retrieved on 2020-06-27.
  2. Obijackson GMD, Ernest Azudialu-Obiejesi, speaks at LSE Africa Summit (en-US). Businessday NG (2016-04-21). Retrieved on 2020-06-27.
  3. PHOTOS: Akiolu, Dangote, 2baba grace wedding of Obijesi's daughter (en-US). TheCable Lifestyle (2017-02-13). Retrieved on 2020-06-27.
  4. TBY PRESENTS OBIKACKSON GROUP MD DR. ERNEST AZUDIALU-OBIEJESI WITH THE "AFRICAN GROUP OF THE YEAR" AWARD. The Business Year. Retrieved on June 27, 2020.
  5. Benson (2018-09-20). Nestoil's CEO demands FG to increase gas pipeline in Nigeria (en-GB). Nairametrics. Retrieved on 2020-06-27.
  6. Adamolekun (2019-07-05). Again, Nestoil Group calls on FG to completely deregulate oil sector (en-GB). Nairametrics. Retrieved on 2020-06-27.
  7. Confidential (2018-09-20). Nigeria Needs More Pipeline Construction To Enchance Gas Supply – Nestoil (en-US). Economic Confidential. Retrieved on 2020-06-27.
  8. JBERGER.NG Company Profile & Executives - Julius Berger Nigeria PLC - Wall Street Journal. www.wsj.com. Archived from the original on 2020-06-28. Retrieved on 2020-06-27.
  9. OB3-"We'd Complete Our Own Section By End of March", Nestoil Declares (en-US). Africa’s premier report on the oil, gas and energy landscape. (2019-03-15). Retrieved on 2020-06-27.
  10. It's all in the Details. The Business Year. Archived from the original on 2020-06-29. Retrieved on 2020-06-27.
  11. Ernest Azudialu-Obiejesi adds a year (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2017-04-21). Retrieved on 2020-06-27.
  12. Obijackson Foundation Fetes Children, Calls for more Attention to Primary Healthcare (en-US). THISDAYLIVE (2019-05-28). Retrieved on 2020-06-27.
  13. Obijackson Foundation rejuvenates Igbo culture with Face of Okija (en-US). Vanguard News (2017-01-07). Retrieved on 2020-06-27.
  14. Winners dish on pageant scandals, dreams & winning competition (en-US). Pulse Nigeria (2017-01-12). Retrieved on 2020-06-27.