Esther Banda

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Esther Banda
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịZambia Dezie
Aha enyereEsther Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Novemba 1958 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the National Assembly of Zambia Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPatriotic Front Dezie

Esther Mwila Banda (amụrụ na 4 Nọvemba na afo 1958) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zambia. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu National Assembly maka Chililabombwe site na 2006 ruo 2016, ọ bụkwa osote minista n'etiti afọ 2011 na afo 2016.

Akụkọ ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Banda gụrụ maka BA na sociology ma rụọ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[1] O sonyere na ntuli aka nke afọ 2001 dị ka onye otu United Party for National Development na Chililabombwe, mana ọ bụ onye nke abụọ na onye otu Movement for Multi-Party Democracy Wamundila Muliokela.[2] Na ntuli aka na afọ 2006, Banda bụ onye na-azọ ọkwa Patriotic Front ma merie Muliokela (onye bụ Minista na-ahụ maka nchekwa n'oge ahụ), na-aghọ onye omeiwu nke mpaghara ahụ.[2] A họpụtara ya ọzọ na afo 2011, mgbe nke ahụ gasịrị, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote minista nke Gọọmentị Obodo, Ụlọ, Mmụta Mbido na Nchebe Gburugburu Ebe Obibi.[2][3] N'afọ sochirinụ, ọ ghọrọ osote minista na Ministry of Gender and Child Development nke e guzobere ọhụrụ. N'ọnwa Febụwarị na afọ 2015 ọ ghọrọ osote minista na-ahụ maka njem nleta na nka mgbe Edgar Lungu ghọrọ onye isi ala.[4] O jikwa ọkwa onye isi oche ụmụ nwanyị nke mba n'ime Patriotic Front.[5]

Banda agbaghị ọsọ na ntuli aka nke afọ 2016, onye na-azọ ọkwa onye omeiwu nke PF bụ Richard Musukwa nọchiri ya dị ka onye omeiwu Chililabombwe.[6]

Ebesidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ester Mwila Banda National Assembly of Zambia
  2. 2.0 2.1 2.2 Zambia Election Passport
  3. List of newly appointed Cabinet and Deputy ministers Lusaka Times, 29 September 2011
  4. Lungu maintains almost all deputy ministers Zambia Watchdog, 16 February 2015
  5. PF here to stay, says Banda Zambia Daily Nation, 15 February 2016
  6. List of PF MPs that won’t be adopted for 2016 Zambia Watchdog, 24 August 2015