Esther Farinde

| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha n'asụsụ obodo | Esther Farinde |
| Aha ọmụmụ | Esther Farinde |
| Aha enyere | Esther |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Febụwarị 1984 |
| Ebe ọmụmụ | Naijiria |
| Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Northampton, Islington Green School |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2006 |
| Ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
| Ụcha ime anya | brown |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Ụdị | gospel music |
| Webụsaịtị | http://www.cofieldmundi.com/ |
| Nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Esther Farinde | |
|---|---|
Esther Farinde on winning Time2Shine Talent Search October 2014 | |
| Background information | |
| Birth name | Esther Toluwase |
| Born | 19 Febụwarị 1984 Nigeria |
| Genres | Gospel, Urban contemporary gospel, R&B, soul |
| Occupation | Singer, songwriter |
| Years active | 2006–present |
| Labels | T2S Records, Black Grape Records |
Esther Farinde (amụrụ ya na abali iri na itolu n’ime ọnwa abụọ n’afọ 1984) bụ onye na-agụ egwu na edekwa egwu uka nke eji British gospel were mara. A makwaara ya dị ka onye na-ahụ maka nkuzi olu ukwe, onye na-eduzi ndị na-eto eto nwere mmasi igụ egwu na ndị ukwe ụka, yana site na ọrụ RM 19, [1] nke nọ n'okpuru nlekọta ulọ The Royal Opera. Esther tinyekwara aka na igbasa egwu nke gbadoro ukwu na ọrụ dika otu onye n'ime ndi otu Barbican Learning na Development.
Biography
[dezie | dezie ebe o si]Esther bụ nwa nke asaa n’ime ụmụ iri ndi nne na nna sitere na Efon-Alaiye, na Ekiti State, di na ọdida anyanwụ Nigeria. Esther tolitere na England, ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ Islington Green School, na City and Islington College, (dịka onye ọmenka ibe ya bụ Paloma Faith).[2]). N'agbata 2003 na 2006, Esther gara akwụkwọ na mahadum nke anakpọ University of Northampton ebe ọ nwetara nzere BA na Music na Media.
Esther malitere ịbụ abụ mgbe ọ dị afọ anọ na ụlọ uka nke nne na nna ya; ebe ha abụọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ nke Chineke Christ Apostolic Church (CAC). Kemgbe afọ iri na asatọ gara aga, o duru ndi ukwe nọ na ụka.
A họpụtara Esther Farinde ka ọ bụrụ onye mmeri nke oge 2014 nke Time2shine Gospel Talent na UK. Emere emume nhọpụta nke ikpeazụ na ịhe nkiri onyonyo nke na-eme eme sitere na Hackney Empire na 25 Ọktoba 2014. [3]
N’afọ 2018 ọ wepụtara egwu izizi ya bụ ‘Song Cry’ mgbe ndị otu Time2Shine bidoro gbaziwere ya itnyebere ya anya. [4]
Ntughari
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ RM19 Youth Singing Group. Royal Opera House (21 February 2015).
- ↑ Tom Marshall. "My Islington school made me a star, says Paloma Faith", islingtongazette.co.uk, 19 October 2010.
- ↑ Sarah McAllister (27 October 2014). Esther Farinde wins Time2Shine live final. premiergospel.org.uk.
- ↑ Dennis, O'Neil (2018-09-11). Time2Shine winner Esther Farinde release Afrobeat hit ‘Song Cry’ (en-GB).