Ethnic minorities in China

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ethnic minorities in China
obere ụdị nkeethnic minority Dezie
mba/obodoChina Dezie

Ndị agbụrụ pere mpe na China bụ ndị na-abụghị Han ndị China na n'ọnụ ọgụgụ ndị Mba nke China (PRC).

PRC mara ndị otu agbụrụ dị iri ise na ise na usoro ọchịchị nke China na mgbakwunye ndị Han dị ọtụtụ . [1] Ka ọ na-eru afọ 2010, ọnụ ọgụgụ e jikọtara n'usoro ọchịchị ndị otu pere mpe gụnyere pacentị 8.49 ọnụ ọgụgụ ndị bi na isi obodo China . [2] Na mgbakwunye ndị obere agbụrụ a n'usoro ọchịchị, enwere ụmụ amaala China na-ekewa onwe na mkpuchi dị ka ndị otu agbụrụ amatabeghị, dị ka obere ndị Juu China, Tuvan, na Ili Turki, yana obodo Oirat na ndị Japan buru ibu..

N'asụsụ China, 'agbụrụ pere mpe ka a na-atụgharị dịka shǎoshù mínzú (少數民族), ebe mínzú (民族) pụtara ' mba ' ma ọ bụ ' mba ' (dị ka agbụrụ) na nkwekọrịta n'echiche ndị Soviet make agbụrụ na shǎoshù (少數 ) pụtara ' mpe '. [3] [4] [5] Ebe echiche mmụta gbasara mmadụ maka agbụrụ adabaghị na echiche ndị China ma ọ bụ ndị Soviet (nke steeti kọwara ma chịkwaa), ụfọdụ ndị ọkà mmụta na -eji mkpụrụ okwu e mepụtara ọhụrụ zúqún (族群, 'agbụrụ') iji mkpụrụokwu n'enweghị nanị otu nkọwa iji kọwaa agbụrụ. [6] Gụnyere shaoshu mínzu, Sun Yat-sen ji okwu <i id="mwNw">zhōnghuá mínzú</i> (中華民族, 'mba China' ma ọ bụ 'mba China') gosipụta nkwenye ya na agbụrụ China niile bụ akụkụ nke otu mba China.

Agbụrụ ndị pere mpe nke ndị PRC nabatara n'usoro ọchịchị gụnyere ndị bi n'isi obodo China yana ụmụ afọ ala Taiwan . Agbanyeghị, PRC anabataghị okwu ụmụ afọ ma ọ bụ ọdịiche ya, ebe ọ nwere ike tụọ aro na ndị Han abụghị ụmụ amaala Taiwan, ma ọ bụ na Taiwan abụghị isi mpaghara China . Ọzọkwa, ebe gọọmentị Republic of China (ROC) na Taiwan, n'afọ 2020, matara agbụrụ iri na isii n'usoro ọchịchị dịka ụmụ afọ ala Taiwan, PRC tinyere ha niile n'okpuru otu agbụrụ, ndị Gāoshān (高山, 'ugwu dị elu') ndị dị obere n'enweghị mmasị ịmata nkewa agbụrụ sitere na ọrụ ndị ọkà mmụta gbasara mmadụ Japan n'oge ọchịchị ndị Japan . (Nke a bụ na agbanyeghị na ọ bụghị ndị ụmụ afọ niile nke Taiwan nwere mpaghara ọdịnala n'ugwu; dịka ọmụmaatụ, ndị Tao n'ebi n'agwaetiti Lanyu.) Gọọmentị mpaghara Hong Kong na Macau anaghị eji usoro nkewa agbụrụ a, yabụ na ọnụ ọgụgụ gọọmentị PRC wepụrụ ókèala abụọ a.

Akụkọ banyere agbụrụ na China[dezie | dezie ebe o si]

 

Akụkọ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

Ọchịchị ndị eze Tang nke narị afọ nke 8, ihe atụ ụrọ nke nwoke Sogdian (onye Iran Iran ) nke nwere okpu mkpuchi na mkpuchi ihu, ikekwe onye na-agba kamel ma ọ bụ ọbụna onye ụkọchukwu Zoroastrian na-eme emume n'ụlọ nsọ ọkụ, ebe ọ bụ na ejiri mkpuchi ihu. iji zere iji ume ma ọ bụ asọ metọọ ọkụ dị nsọ; Ihe ngosi nka nke Oriental Art (Turin), Italy. [7]

N'ime ọtụtụ akụkọ ihe mere eme nke China edere, ndị ode akwụkwọ China gbara mbọ ikewapụta echiche nke mba, ọdịbendị na agbụrụ. [8] Ndị nọ na mpụga ebe njikwa alaeze ukwu na ụkpụrụ kacha n'usoro ọdịnala China nke e ahụrụ dị ka otu dị iche iche n'agbanyeghị ma a ga-ewere ha taa dị ka agbụrụ dị iche. Echiche onwe nke Han gbara gburu gburu n'etiti isi nkewa ọdịbendị. Ya mere, usoro nke ndị n'abughi ndị China biara n'okpuru mmetụta ọdịbendị China dịka akụkọ ihe mere eme si kwuo nwere ihe jikọrọ ya na mgbasa nke ọchịchị na ọdịbendị obodo dịka o siri mee na mbugharị agbụrụ n'ezie. 

Nghọta a gara n'ihu (yana mgbanwe ụfọdụ na Qing n'okpuru mbubata nke echiche ndị obodo ndị ọzọ mepere emepe di na mpaghara ọdịda anyanwụ) ruo mgbe ndị Kọmunist weghaara ọchịchị n'afọ 1949. Nlereanya Soviet nke Joseph Stalin emetụtala nghọta ha banyere ndị pere mpe - dị ka ọ dị maka ọchịchị Kọmunist agbata obi nke Vietnam na Laos [9] - na nkọwa Soviet maka ndị agbụrụ pere mpe enweghị eserese ọma na nghọta akụkọ ihe mere eme nke China. Echiche ndị Soviet banyere ndị agbụrụ pere mpe bụ na otu mba mejupụtara ndị nwere otu asụsụ, ọdịbendị akụkọ ihe mere eme na ókèala. Mba ọ bụla nke ndị a nwere ikike ikewapụ na gọọmentị etiti nke ha chọrọ. [10] Nke a dị iche na ụzọ iche echiche gara aga n'ihi na kama ịkọwapụta ndị niile nọ n'okpuru ọchịchị alaeze ukwu dị ka ndị China, mba ahụ (dị ka akọwapụtara dị ka oghere a na -atụ anya ike) na agbụrụ (njirimara nke ndị a na-achị) dị iche ugbu a; ịnọ n'okpuru ọchịchị etiti apụtaghị na akọwapụtara ya dị ka Chinese. Nlereanya Soviet dị ka etinyere na China mere ka ụfọdụ mpaghara kwụrụ onwe ya na China; Echere na mpaghara ndị a bụ mba nke ha nwere nnwere onwe usoro iwu sitere n'aka gọọmentị etiti.

N'oge Agha mba ụwa nke Abụọ, ndị Nzukọ Amerịka na Eshia bipụtara ntinye na mpịakọta iri na anọ nke akwụkwọ akụkọ agụmakwụkwọ ha, Asia, gbasara nsogbu nke ma ndị Alakụba China a bụ ndị China ma ọ bụ 'agbụrụ pere mpe' dị iche, yana ihe butere nkewa abụọ. [11] Ọ jụrụ ajụjụ nke ihe kpatara eji ewere ndị Alakụba bụ ndị China dị ka agbụrụ dị iche na ndị China ndị ọzọ, yana ajụjụ dị iche ma ndị Alakụba niile nọ na China e jikọtara ọnụ n'otu agbụrụ. Esemokwu nke mbụ bụ ntụnyere ndị Buddha China, ndị a na -ewereghị dị ka agbụrụ dị iche. [12] O kwubiri na ihe kpatara eji were ndị Alakụba China ka ndị dị iche bụ n'ihi ihe dị iche iche dịka okpukperechi, ọdịbendị, esemokwu ndị agha, na ị were ha dịka "obere agbụrụ" adịghị mma. Ọ bịakwara na nkwubi okwu na onye n'ekwuchitere ndị agha Japan bụ naanị onye na-agbasa nkwupụta ụgha na ndị Alakụba China nwere " ịdị n'otu agbụrụ ", nke anabataghị n'ihi eziokwu bụ na ndị Alakụba nọ na China nwere ọtụtụ agbụrụ dị iche iche n'ibe ha dịka "ndị German na Ndị Bekee", dịka Mongol Hui nke Hezhou, Salar Hui nke Qinghai, na Chan Tou Hui nke Turkistan. Ndị Japan nọ na-agbalị ịgbasa ụgha bụ na ndị Alakụba China bụ otu agbụrụ, ka ha wee gbasaa mgbarakwa na e kwesịrị ka ekewapụ ha na China ka ha bụrụ "otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwụụrụ onwe ya." [11]

Ndị mba dị iche na PRC[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ mbido nke ndị mba nke China (PRC), dị ka iwu obodo nke afọ 1982, gbasoro omume Soviet nke ịchọpụta ' mba ' n'echiche agbụrụ (echiche a agaghị agbagwoju anya na ịbụ nwa amaala steeti). [3] [5] Okwu ndị China bụ mínzú (民族), nke e bitere site na Japan oge Repụbliki, na -atụgharị echiche Soviet a. Nsụgharị Bekee (nke a na -ahụkarị na akwụkwọ gọọmentị) nke 'mba' ọzọ na -eso omume Soviet; iji zere ọgba aghara, agbanyeghị, a na-ejikarị okwu akparamagwa ọzọ dịka 'agbụrụ' ma ọ bụ 'agbụrụ'. Ebe echiche mmụta ndụ mmadụ nke agbụrụ adabaghị na echiche ndị China ma ọ bụ Soviet (nke, ka emechara kọwaa ma chịkwaa ya na steeti), ụfọdụ ndị ọkà mmụta na -eji mkpụrụokwu ọhụrụ zuqun (族群, 'agbụrụ') nke nkọwa karịrị otu ihe iji kọwaa agbụrụ. [6]

Mgbe afọ 1949 gachara, otu ndị ọkà mmụta mmekọrịta ọha mmadụ gbakọtara ka ha depụta mínzú dị iche iche. Ihe isi ike ozugbo bụ na njirimara '' nọ n'ala '' esoghị n'ụzọ ezi uche sitere na ihe ndị dị ka asụsụ ma ọ bụ ọdịbendị ndị ọzọ so nwere; mpaghara abụọ gbara agbata obi nwere ike inwe oyiyi na mmekọrịta omenala, ma na-ekwusi ike na ndị iche njirimara ha. [13] Ebe ọ bụ na nke a ga-ebute nsonaazụ nzuzu -obodo ọ bụla enweghị ike iziga onye ga annọchi anya ya na Ọgbakọ Mba - ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya nwara iwu otu dakọtara pere mpe na-eji asụsụ dị ka isi ihe dị iche maka ịkpa oke. Ya mere, obodo ụfọdụ nwere usoro omenala na akụkọ ihe mere eme dị iche iche jikọtara ọnụ n'okpuru otu aha. Dịka ọmụmaatụ, agbụrụ " Zhuang " rụrụ ọrụ nke ukwuu ijide ihe nile maka obodo ugwu dị iche iche na mpaghara Guangxi. [14]

Ọnụọgụgụ nke onye bụ na onye na-abụghị onye pere mpe gara n'ihu ikpochapụ ahịrị dị iche iche nke ndị ọkà mmụta sayensị na-elekọta mmadụ wepụtara. A na -enyekarị ọnọdụ agbụrụ n'otu n'otu dabere na akụkọ osisi ezinụlọ. Ọ bụrụ na mmadụ nwere nna (ma ọ bụ nne, maka agbụrụ ndị e weere na ọ bụ ikwu site na nne ) nke nwere aha nna nke a na-ewere na ọ bụ nke otu agbụrụ, mgbe ahụ, a ga-enye onye ahụ ọkwa pere mpe. Nke a rụpụtara na obodo ndị na -echebu na ha bụ otu na isi otu/ agbụrụ Han kewara ugbua n'etiti ndị nwere agbụrụ na ndị na -enweghị. [15]

Otu ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ nke chịkọtara ndepụta nke agbụrụ niile kọwakwara ihe ha were dị ka isi ihe dị iche n'etiti otu ọ bụla, gụnyere omenala, ọdịbendị na asụsụ. Etiti ahụ ji ndepụta njirimara ahụ họrọ ndị nnọchi anya otu ọ bụla ga-eme ihe ngosi na igwe onyonyo telivishọn na redio iji mee ka akụkọ gọọmentị China dị ka obodo nwere agbụrụ dị iche iche wee gbochie ọdịbendị nke obere agbụrụ ị gbakọ site na Han na ụwa ndị ọzọ. [16] Agbanyeghị, site na mmepe nke teknụzụ ọgbara ọhụrụ, mbọ ndị a wetara obere mmetụta. N'ezie, ọtụtụ n'ime ndị akpọrọ dị ka ndị pere mpe enweghị mmekọrịta na ụdị egwu, uwe na omume ndị ọzọ nke e gosipụtara site na onyonyo na ihe nnọchianya nke "ndị ha" na mgbasa ozi.

N'okpuru usoro a, a matara agbụrụ iri itoolu na iteghete site na ọnụ ọgụgụ mba nke mbụ n'afọ 1954. Nke bawanyere site ruo iri ise na anọ site na ọnụ ọgụgụ mba nke abụọ n'afo 1964, ya na ndị otu Lhoba agbakwunyere n'afọ 1965. Mgbanwe ikpeazụ bụ mgbakwunye nke ndị Jino n'afọ 1979, nke butere ọnụ ọgụgụ agbụrụ amaara na Iri ise na isii.

Mgbanwe na Mmepe[dezie | dezie ebe o si]

Maapụ Ethnolinguistic nke China na 1983. [17]

Agbanyeghị, ka China mepere ma mezigharị mgbe afọ 1979, gasịrị, ọtụtụ Han nwetara ego zuru ezu iji malite njem. Otu n'ime ahụmịhe njem kacha amasị ndị ọgaranya bụ nleta mpaghara ndị pere mpe, ịhụ emume pụrụ iche nke ndị agbụrụ pere mpe. [18] [19] N'ịzaghachi mmasị a, ọtụtụ ndị ọchụnta ego nke agbụrụ pere mpe, n'agbanyeghị na ha nwere ike ha etolitebeghị n'ịgba egwu, emume, ma ọ bụ egwu n'onwe ha, malitere ilebara ndị njem a anya site n'ịrụ ọrụ yiri ihe ndị ọgbọ ochie ma ọ bụ ndị bi ebe ahụ kwuru. N'ụzọ dị otu a, otu ndị mmadụ akpọrọ Zhuang ma ọ bụ otu pere mpe ndị ọzọ amalitela ị nwekọ ọnụ ha na ndị otu agbụrụ ibe ha, ebe ha nabatara echiche nke onwe ha na nzaghachi maka mkpa akụ na ụba nke ndị na-azụ ahịa maka arụmọrụ ha. 

Nhazi nke ndị otu pere mpe iri ise na ise bụ nnukwu ọganihu site na ngọnarị ịdị adị nke agbụrụ dị iche iche na China nke bụ amụma ọchịchị Sun Yet-Sen Gọọmenti ndị kwenyesiri ike n'obodo ahụ nke batara n'ọchịchị n'afo 1911, nke tinyekwara onwe ha n'ọrụ efu iji aha mkparị kpọọ ndị pere mpe (omume nke a kagburu n'afọ 1951). [3] Agbanyeghị, a katọkwara ịkpa oke nke ndị Kọmunist ebe ọ belatara ọnụ ọgụgụ agbụrụ a site n'ụzọ asatọ, taa wei shibie menzu (Pụtara 'agbụrụ ndị N'enweghị ihe eji mara ha') nwere ngụkọta karịa mmadụ puku nari asaa na puku iri atọ. Ndị otu a gụnyere Geija, Khmu, Kucong, Mang, Deng, Sherpas, Bajia, Yi na Youtai (Juu). 

Mgbe ndakpọ nke Yugoslavia na mgbasa nke ọgbakọ Soviet, enwere mgbanwe na echiche gọọmentị na nghọta agbụrụ ndị pere mpe na China: kama ịkọwapụta ha dị ka 'mba', ha bụrụ 'agbụrụ'. Ọdịiche dị n'etiti 'mba' na 'agbụrụ', dị ka Uradyn Erden-Bulag kọwara ya, bụ na onye nke mbụ na-emeso ndị pere mpe China dịka obodo nwere "oke ọrụ na-arụ ọrụ nke ọma," akụkọ ihe mere eme, na ókèala, ebe nke ikpeazụ na-emeso ndị pere mpe. dị ka "otu" ma gbado anya na nhazi oke ha yana nkọwa onwe ha n'ihe metụtara ọtụtụ ndị. Mgbanwe ndị a na-egosipụta n'ojiji nke okwu ahụ mínzú (民族) na ntụgharị ya. Akwụkwọ akụkọ gọọmentị Minzu Tuanjie gbanwere aha Bekee ya site na ịdị n'otu mba bụrụ idi n'otu agbụrụ n'afọ 1995. N'otu aka ahụ Mahadum etit maka mba gbanwekwara aha ya zawaMahadum Minzu nke China . Ndị ọkà mmụta bidoro họrọ okwu ahụ zuqun (族群, 'agbụrụ') karịa minzu . [20] Ihe atụ ndị China maka ịchọpụta na ịkọwa agbụrụ dị iche iche guzobere na ntọala PRC soro usoro Soviet, na -enweta mkpali site na ụkpụrụ Joseph Stalin '195 commons' iji mata agbụrụ: "(1) asụsụ dị iche; (2) onye ama ala nna ma ọ bụ ókèala; (3) ndụ akụ na ụba nkịtị; na (4) mmetụta siri ike nke njirimara na omenala pụrụ iche, gụnyere uwe, okpukpe na nri. " 

Mgbe ntiwa nke diị amamihe Ọgbakọ Soviet na ndị na-eme iwu n'ime China malitere ịrụ ụka na nhọpụta ndị otu pere mpe nwere ike ibutere obodo a nsogbu. Ime ihe ike na Xinjiang na Tibet nyere ihe akaebe maka arụmụka a. Onye prọfesọ Mahadum Beijing Ma Rong rụrụ ụka na ndị Kọmunist China ewepụtala “usoro abụọ” nke ọchịchị nke nnọchite anya na njirimara e nyere agbụrụ ndị a ma ama ga-amụba ọdịiche ọdịbendị na ịkpata esemokwu ọha. Ọ kwadoro amụma ọhụrụ nke njikọta na ịkpa oke agbụrụ. Amụma ndị a nke Ma na ndị ọzọ mere bụ arụmụka n'oge ahụ mana ha ga-achọta ebe dị n'etiti amụma ọchịchị Xi Jinping. Xi agbanweela iwu steeti gaa n'ijikọta na ihe ọ kpọrọ "nnukwu njikọta minzu" ma ọ bụ "ịjikọta ọbara na uche." [21]

N'afọ 2020, a họpụtara otu onye Han China dịka onye nduzi nke Kọmitii Na -ahụ Maka Ọdịbendị Steeti na nke mbụ kemgbe afọ 1954. [21]

Ndị Pati kọmunist China (CCP) gara n'ihu ịtụ ọha nke Uyghyrs na Xinjiang omumu oru n'ogige, n'okpuru CCP onyeisi odeakwụkwọ ọchịchị XI Jinping mkpọrọ . [22]

Otu agbụrụ[dezie | dezie ebe o si]

 

Agbụrụ Long-mpi, obere alaka nke agbụrụ Miao na mpaghara ọdịda anyanwụ nke Guizhou Province

Ndị otu China bụ ndị agbụrụ iri ise na isii (aguụrụ ndị pere mpe iri ise na ise gbakwunyere Han kachasị). Agbanyeghị, ụfọdụ agbụrụ dị ka gọọmentị PRC nwere, n'ime onwe ha, otu ndị mmadụ dị iche iche. Otu dị iche iche nke obere ndị Miao, dịka ọmụmaatụ, na-asụ olumba dị iche iche nke asụsụ Hmong -Mien, asụsụ Tai -Kadai, na Chinese, ma na-eme omenala dị iche iche. [23] Ọ bụ ezie na n'ọtụtụ mba, a na-akọwa ọkwa pere mpe nke nwa amaala site na njirimara onwe ha dị ka agbụrụ pere mpe, na mba China pere mpe (xiaoshu minzu ) ka etinyere mgbe amụrụ ya, omume nwere ike ịtọ ntọala nke PRC, mgbe ndị Kọmunist nyere iwu ka ewepụta ma kọwaa otu dị iche iche dabere na nyocha ndị otu nyocha nke akụkọ ntolite nke ndị pere mpe, ndụ akụ na ụba, asụsụ na okpukpe na mpaghara China dị iche iche.

Ogo mgbanwe dị n'etiti agbụrụ adịghị agbanwe agbanwe. A kọwara n'ọtụtụ agbụrụ dị ka ndị nwere njirimara pụrụ iche site na ndị otu pere mpe sitere na Han, mana e nwekwara ụfọdụ ndị yitụrụ otu ukwu nke ndị Han. Imirikiti ndị Hui China enweghị ike ịpụ iche na Han China belụsọ maka na ha na -ekpe okpukpe Alakụba, na Manchu ọtụtụ nke ekwenyere ka ọ bụrụ nke ukwuu ka ọ banye n'ime ọha Han. 

Ndị ọrụ gọọmentị iri ise na ise nke China nọ na ndịda, ọdịda anyanwụ, na ugwu China. Naanị mpaghara Tibet kwụụrụ onwe ya na Xinjiang Uygur Autonomous Region nwere ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ọchịchị pere mpe, ebe mpaghara, obodo na mpaghara China niile nwere ọtụtụ ndị Han. N'ime Beijing n'onwe ya, ihe mejupụtara agbụrụ Han bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pacent iri itoolu na isii nke ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ, ebe mkpokọta agbụrụ pere mpe bụ pacent anọ na nkeji iri atọ na otu, ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ puku nari ise na iri asato na-anọ, narị isii na iri itoolu n'abụọ (n'afọ 2008).

Ọtụtụ n'ime mkparịta ụka dị na China gbasara ndị pere mpe egosila ndị pere mpe ka ha nọ n'oke azụ Han n'ọganihu mmeziwanye na ọgbara ọhụrụ. A na-egosipụtakarị ìgwè ndị pere mpe dị ka ime ime ọhịa, na ochie. Dika gọọmentị na -egosipụtakarị onwe ya dị ka onye na-enyere ndị pere mpe aka, ndị na-adịchaghị njikere ịkpakọ ọnụ (n'agbanyeghị onyinye enyemaka) dị ka nwoke, ime ihe ike, na enweghị ezi uche. Otu ndị egosiri n'ụzọ dị otu a gụnyere ndị Tibet, Uyghurs na ndị Mongols . [24] A na-egosipụtakarị otu dị njikere ịkpa oke (ma nabata enyemaka gọọmentị) dị ka nwanyị na mmekọahụ, gụnyere Miao, Tujia na Dai . [16]

Ndị mmadụ[dezie | dezie ebe o si]

Agbụrụ kacha buru ibu, Han, dị ka ihe nlele aoọ 2005 mere, bụ ihe dịka pacent iri itoolu n'otu na nkeji itoolu nke ọnụ ọgụgụ mmadụ niile. Agbụrụ ọzọ kacha n'ọnụ ọgụgụ gụnyere Zhuang (nde iri asato), Manchu (nde iri), Hui (nde iri), Miao (nde itoolu), Uyghur (nde asatọ), Yi (nde asaa na puku nari asaa), Tujia (nde asatọ), ndị Mongol (nde ise na puku nari asatọ) ndị Tibet (nde ise na puku nari anọ), Buyei (nde atọ), Yao (nde ato na puku otu narị), na ndị Korea (nde abụọ na puku narị ise). Ọnụ ọgụgụ ndị pere mpe etoola ngwa ngwa n'ihi na enweghị mmetụta iwu otu nwa. [25]

Ndepụta agbụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Echeghị maka agbụrụ pere mpe nke nwere ọnụ ọgụgụ dị ala (ihe na -erughị puku otu narị ) ebe a. [26]Àtụ:Col-begin Àtụ:Col-3 Ethnic Hans

  • Beijing Hans
  • Chonqing Hans
  • Gan Hans
  • Gansu Hans
  • Guizhou Hans
  • Hainan Hans
  • Hakka Hans
  • Hebei Hans
  • Heilongjian Hans
  • Henan Hans
  • Hubei Hans
  • Jiaoliao Hans
  • Jilin & Liaoning Hans
  • Lower Yangtze Hans
  • Min Hans
  • Shaanxi Hans
  • Shandong Hans
  • Shanxi Hans
  • Sichuan Hans
  • Taiwan Hans
  • Tianjin Hans
  • Wu Hans
  • Xiang Hans
  • Yue Hans
  • Yunnan Hans

Àtụ:Col-3 Ethnic minorities

Àtụ:Col-3

Àtụ:Col-end

Agbụrụ ndị n'enweghị ndiiche pụrụ iche[dezie | dezie ebe o si]

  Ndị agbụrụ "ndị n'enweghị ndiiche" bụ agbụrụ ndị gọọmentị etiti amataghị ma ọ bụ kewaa. Otu a karịrị Mmadụ puku narị asaa na puku iri ato, ọ ga -abụkwa agbụrụ iri abụọ nke ọnụ ọgụgụ mmadụ kacha buo ibu na China ma ọ bụrụ na ewere ya dịka otu. Imirikiti ndị otu a dị na mpaghara Guizhou .

Ndị '' agbụrụ ndị a na-amatabeghị'' agunyeghi otu ndị nke eji arụmụka tinye n'ime otu dị adị. Dịka ọmụmaatụ, Ekewara Mosuo dị ka Naxi, a na -ekewa Chuanqing dị ka Han Chinese, n'usoro ọchịchị mana ha na-ajụ nkewa ndị a were onwe ha dị ka agbụrụ dị iche iche.

A na -ekewa ụmụ amaala nke isi ala China nke sitere na mba ọzọ site na iji akara ọzọ dị iche: "ndị ala ọzọ banyere ịbụ nwa amaala China" (外国人入中国籍). Agbanyeghị, ọ bụrụ na nwa amaala ọhụrụ esonyelarịị bụrụ onye otu ama ama n'ime agbụrụ iri isii na isii, mgbe ahụ, a ga-ekewa ya na agbụrụ ahụ karịa aha pụrụ iche a.

Nkwa nke ikike na ọdịmma[dezie | dezie ebe o si]

Isi mpaghara kwụụrụ onwe n'ime Yunnan. (ewepu Hui )
Isi mpaghara kwụụrụ onwe n'ime Guizhou. (ewepu Hui )

  Iwu nke PRC na-ekwe nkwa agbụrụ niile dị na China ikike nha ma na-enyere aka ịkwalite mmepe akụ na ụba na ọdịbendị nke obere agbụrụ [27] Otu ọpụrụiche amara agbụrụ pere mpe nke agbụrụ dị iche iche na-enwe bụ mwepụ ha na njikwa mmụba nke ndị mmadụ nke amụma otu nwa . Mana dị ka akụkọ nyocha nke Associated Press bipụtara n'abali iri abụọ na asatọ nke onwa Juun afọ 2020, gọọmentị China na-eme ihe siri ike iji belata ọnụ ọgụgụ ọmụmụ n'etiti ndị Uighurs na ndị pere mpe ndị ọzọ dị ka akụkụ nke mkpọsa zuru oke iji gbochie ọnụ ọgụgụ ndị Alakụba ya, ọbụlagodi na ọ na-agba ụfọdụ ndị ume ihe ka ọtụtụ n'ime ndị obodo Han ịmụ ụmụ. [28] Ọ bụ ezie na ụmụ nwanyị dị iche iche ekwuola N'oge gara aga maka mgbochi ịmụ nwa n'ike, omume a gbasawanyere ebe niile na usoro karịa ka amaara na mbụ, dịka nyocha AP siri dabere na ọnụ ọgụgụ gọọmentị, akwụkwọ steeti na ajụjụ ọnụ ya na mmadụ iri atọ ndị ejideburu, ndị ezinaụlọ na onye nkuzi kampu. Mgbasa ozi ahụ n'ime afọ anọ gara aga na mpaghara ọdịda anyanwụ nke Xinjiang na -eduga n'ihe ụfọdụ ndị ọkachamara na -akpọ ụdị "mgbukpọ mmadụ". [28] Tụkwasị na nke a, agbụrụ pere mpe na-enwe nnwere onwe ndị ọzọ pụrụ iche nke na-adịgasị iche site na mpaghara- ndị a gụnyere obere ụzọ ụtụ isi yana obere akara achọrọ maka ịbanye mahadum. Ojiji usoro ndị a bulie isi obodo mmadụ pere mpe bụ nke gọọmentị etiti na -ahụta dị ka ihe dị mkpa iji meziwanye mmepe akụ na ụba nke obere agbụrụ. A na -anọchite anya ndị agbụrụ pere mpe na Nzukọ Mba yana gọọmentị na ọkwa mpaghara na mpaghara . Ụfọdụ agbụrụ pere mpe na China na -ebi ebe akọwara dị ka mpaghara nwere onwe nke agbụrụ . Ndị '' mpaghara kwụụrụ onwe ha '' na -ekwe ka agbụrụ dị iche iche nweere onwe ha iji n'azụlite asụsụ agbụrụ ha, na idebe omenala na omenala obodo ha. Tụkwasị na nke a, gọọmentị PRC enyela mmepe akụ na ụba ọkacha mmasị na mpaghara ebe agbụrụ pere mpe bi. Ọzọkwa, gọọmentị China nyere ohere ma gbaa ume itinye aka nke ndị obere agbụrụ isonye na pati ahụ. Agbanyeghị na enyere agbụrụ pere mpe na China ikike na nnwere onwe, ọtụtụ agbụrụ pere mpe ka na -aga ndụ obodo ukwu iji nweta ọrụ na -akwụ ezigbo ụgwọ. [29]

Ndi pere mpe eritela uru nke ukwuu na mmemme nkwa ndụ kacha nta nke China (nke a maara dị ka dibao) mmemme ewepụtara na mba niile n'afọ 1999 nke ọnụ ọgụgụ ndị sonyere erutela ihe ruru nde iri abụọ ka ọ na -eru afọ 2012. Ọdịdị nke usoro nhọpụta gụnyere na ndị na-enye mmemme a na -eme ngwa ngwa ma dị njikere n'ịchọpụta ndị dara ogbenye, na -emegide atụmatụ ọdịmma zuru oke dị ka Urban Resident Basic Medical Insurance Scheme (URBMI), nke etinyere n'ụwa niile. Dị ka nke a, usoro nhọpụta maka ndị sonyere na mmemme dibao ewepụtala echiche n'etiti ndị na-ahụ maka atụmatụ a ejirila mmemme a belata mwepụ ma wezuga ihe egwu ọ bụla na gọọmentị nwere ike ibute ọgba aghara- gụnyere nyocha arụmọrụ adịghị mma nke ndị ọrụ mpaghara. .

Okpukpe na njikọ ha na -adịkarị[dezie | dezie ebe o si]

  • Okpukpe Buddha / Taoism - ndị Miao (ndị pere mpe ), Lisu (ndị pere mpe), Bai, Bulang, Dai, Jinuo, Jing, Jingpo, Mongol, Manchu, Naxi (gụnyere Mosuo ), Nu, Tai, Tibetan, Zhuang (obere), Yi ( ndị pere mpe), na Yugur ("Yellow Uyghurs"). [30]
  • Eastern Orthodox Christianity - ndị Russia
  • Islam - ndị Hui, Uyghurs, Kazakhs, ndị Dongxiang, ndị Kyrgyz, Salar, Tajiks, Uzbeks, Bonans, na Tatars . [31]
  • Okpukpe ndị Juu - ndị Juu Kaifeng
  • Okpukpe Protestant - Lisu (70%; lee Chọọchị Lisu )
  • Shamanism / Animism - Daur, Ewenkis, Oroqen, Hezhen, na Derung .

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ihe edeturu[dezie | dezie ebe o si]

 

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Ethnic Groups in China. English.gov.cn (26 August 2014).
  2. Wang Guanqun:Han Chinese proportion in China's population drops: census data. English.news.cn (2011-04-28). Archived from the original on 2 May 2011.
  3. 3.0 3.1 3.2 Binggao, Jin. [1987] 1988. "When Does The Word 'Minority Nationality' [Shaoshu Minzu] [First] Appear in Our Country?," translated by Tibet Information Network. Bulletin of the History of the Tibet Communist Party 1(19). p. 45 ff.
  4. Chang, Ntxheb. "Conclusion: Splendid China and Being Minzu." Being Shaoshu Minzu in Contemporary China. US: Boston College. via Mediakron.
  5. 5.0 5.1 Moseley, George. "China's Fresh Approach to the National Minority Question." The China Quarterly.
  6. 6.0 6.1 Bulag (2010). "Alter/native Mongolian identity", in Perry: Chinese Society: Change, Conflict, and Resistance. Taylor & Francis. 
  7. Lee Lawrence. (3 September 2011). "A Mysterious Stranger in China". The Wall Street Journal. Retrieved 31 August 2016.
  8. Harrell (1996). Cultural encounters on China's ethnic frontiers. Seattle: University of Washington Press. ISBN 978-0-295-97380-7. 
  9. Michaud J., 2009 Handling Mountain Minorities in China, Vietnam and Laos : From History to Current Issues. Asian Ethnicity 10(1): 25–49.
  10. Blaut (1987). "The Theory of National Minorities", The National Question: Decolonizing the Theory of Nationalism. London: Zed Books. ISBN 978-0-86232-439-1. 
  11. 11.0 11.1 American Asiatic Association (1940). Asia: journal of the American Asiatic Association, Volume 40. Asia Pub. Co.. Retrieved on 8 May 2011. 
  12. Hartford Seminary Foundation (1941). The Moslem World, Volumes 31–34. Hartford Seminary Foundation. Retrieved on 8 May 2011. 
  13. Mullaney (2010). "Seeing for the State: The Role of Social Scientists in China's Ethnic Classification Project". Asian Ethnicity 11 (3): 325–342. DOI:10.1080/14631369.2010.510874. 
  14. Kaup (2002). "Regionalism versus Ethnic nationalism". The China Quarterly 172: 863–884. DOI:10.1017/s0009443902000530. 
  15. Mullaney (2004). "Ethnic Classification Writ Large: The 1954 Yunnan Province Ethnic Classification Project and its Foundations in Republican-Era Taxonomic Thought". China Information 18 (2): 207–241. DOI:10.1177/0920203X04044685. 
  16. 16.0 16.1 Gladney (1994). "Representing Nationality in China: Refiguring Majority/Minority Identities". The Journal of Asian Studies 53 (1): 92–123. DOI:10.2307/2059528. 
  17. China - Ethnolinguistic Groups 1983. University of Texas Libraries (1983). Retrieved on 20 September 2019.
  18. Oakes (1997). "Ethnic tourism in rural Guizhou: Sense of place and the commerce of authenticity", in Picard: Tourism, ethnicity, and the state in Asian and Pacific societies. Honolulu: University of Hawai'i Press. ISBN 978-0-8248-1863-0. 
  19. Hillman (2003). "Paradise under Construction: Minorities, Myths and Modernity in Northwest Yunnan". Asian Ethnicity 4 (2): 177–190. DOI:10.1080/14631360301654. 
  20. Perry. "Alter/native Mongolian identity: From nationality to ethnic group", Chinese Society: Change, conflict and resistance. Routledge, 261–287. ISBN 978-0-203-85631-4. 
  21. 21.0 21.1 Leibold. Beyond Xinjiang: Xi Jinping’s Ethnic Crackdown. thediplomat.com. The Diplomat. Retrieved on 5 May 2021.
  22. "Dismantling China's Muslim gulag in Xinjiang is not enough", The Economist, 2020-01-09. Retrieved on 2020-11-16.
  23. Xiaobing Li, and Patrick Fuliang Shan, Ethnic China: Identity, Assimilation and Resistance, Lexington and Rowman & Littlefield, 2015.
  24. Hillman (2006). "Macho Minority: Masculinity and Ethnicity on the Edge of Tibet". Modern China 32 (2): 251–272. DOI:10.1177/0097700405286186. 
  25. MINORITIES IN CHINA | Facts and Details. Factsanddetails.com.
  26. China & Mongolia Regional DNA Project. Eupedia.
  27. Constitution of the People's Republic of China.
  28. 28.0 28.1 AP’s global investigative team. "China cuts Uighur births with IUDs, abortion, sterilization", 28 June 2020. Retrieved on 1 August 2020.
  29. Yardley. "China Sticking With One-Child Policy", The New York Times, 11 May 2008. Retrieved on 20 November 2008.
  30. Ethnic Groups. China.org.cn. Retrieved on 7 March 2019.
  31. Jackie Armijo (Winter 2006). "Islamic Education in China". Harvard Asia Quarterly 10 (1). 

Ịgụ n'ihu[dezie | dezie ebe o si]