Gaa na ọdịnaya

Eucharia Anunobi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Eucharia Anunobi
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEucharia Dezie
Aha ezinụlọ yaAnunobi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Mee 1965 Dezie
Ebe ọmụmụOwẹrrẹ Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie
Ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Nigeria Dezie
Ogo mmụtaBachelor of Arts Dezie
Oge ọrụ ya (mmalite)1995 Dezie
Okpukpere chi/echiche ụwaChristianity Dezie
Ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
Nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Eucharia Anunobi, (onye a mụrụ na abali iri abụọ na ise na ọnwa nke ise n'afọ 1965) bụ nwa afo Nigeria, na-eme ihe nkiri, na emeputa ihe nkiri, ma bụrụ kwa onye ukọ chụkwụ ụka agbara ọhụrụ akpọrọ pastọ na olu bekee. A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na ihe nkiri Abuja Connection. [1] A hoputara ya na 2020 Africa Magic Viewers' Choice Awards maka Onye ihe nkiri nwanyi kacha mma kwado na ihe nkiri ma ọ bụ ihe nkiri Igwe onyonyo na ga n'ihu na usoro nke bekee kpọrọ Best Supporting Actress in a Movie or TV Series. [2]

Mmalite ndụ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Eucharia na Owerri, Imo Steeti, n'ebe bi wee gụchaa ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị tupu ọ gawa Institute of Management Technology, Enugu ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nke diplọma National na Mass Communication. [3] Ọ nwekwara nzere bachelọ nke nka mgbe ọ mụsịrị Asụsụ Bekee na Mahadum nke Nigeria, Nsukka . Eucharia bịara pụta ìhè dị ka onye na-eme ihe nkiri maka ọrụ ya na usoro ihe nkiri Glamor Girls na afọ 1994. Ọ gaa n'ihu na ime ihe nkiri dị iche iche karịa iri itoolu gụnyere Abuja Connection na Letters to a Stranger . [4] Ọ na-eje ozi ugbu a dịka onye nkwusa ozioma n'otu ụka dị na Egbeda, Lagos Steeti . [5] Otu nwa nwoke Eucharia mụtara, Raymond, onye ọ kọwara dị ka ezigbo enyi ya nwuru [6] n'ihi nsogbu sitere na ọrịa sickle cell anemia na ọnwa August, n'ụbọchị iri abụọ na abụọ na afọ 2017. Ọ dị afọ 15 wee la n'mụọ. [7]

Ntụrụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. "Why I'm missing on social scene – Eucharia Anunobi".
  2. "AMVCA 2020" (in Bekee).
  3. "How actress, Eucharia Anunobi snubbed her mother". Information Nigeria. 15 August 2012. Retrieved 25 July 2015.
  4. "How actress, Eucharia Anunobi snubbed her mother". Information Nigeria. 15 August 2012. Retrieved 25 July 2015.
  5. "Nollywood Actress, Eucharia Ordained Pastor". P.M. News. 7 February 2012. Retrieved 25 July 2015.
  6. "My late son was my best friend –Eucharia Anunobi".
  7. "Eucharia Anunobi loses only son".

Njikọ dị na mpụga

[dezie | dezie ebe o si]

Eucharia Anunobi on IMDb