Farouk al-Fishawy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Farouk al-Fishawy
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịKingdom of Egypt, Republic of Egypt, United Arab Republic, Egypt Dezie
aha n'asụsụ obodoفاروق الفيشاوي Dezie
Aha ọmụmụمحمد فاروق فهيم الفيشاوي Dezie
Aha enyereMohamed Dezie
aha ezinụlọ yaFarouk, Fahim, Al-Fishawy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya5 Febụwarị 1952 Dezie
Ebe ọmụmụSirs El-Layan Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya25 Julaị 2019 Dezie
Ebe ọ nwụrụCairo Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
ihe kpatara ọnwụọrịa kansa Dezie
Dị/nwunyeSomaya El Alfy, Soheir Ramzi Dezie
nwaAhmed El-Fishawy Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee, omee ihe nkiri Dezie
ebe agụmakwụkwọAin Shams University Dezie

Farouk al-Fishawy (Arabic; 5 Febụwarị 1952 - 25 Julaị 2019) bụ onye Egypt na-eme ihe nkiri na telivishọn.[1] A maara ya maka Al-Mashbouh (1981).

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya dịka Mohamed Farouk al-Fishawy na Sirs El-Layan, Monufia Governorate n'abalị 5 ọnwa February afọ 1952. Ọ bụ otu n'ime ụmụnne ya nwoke atọ na ụmụnne ya nwanyị abụọ.[2] Nna ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri na otu na nwanne ya nwoke nke okenye Rashad al-Fishawy lekọtara ya ma zụlite ya. Ọ nwetara nzere bachelọ ya na ọgwụ n'ozuzu ma tupu nke ahụ ọ natara nzere bachelụ nke nka na Mahadum Ain Shams.[3][4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ malitere ọrụ nka ya n'afọ ndị 1970 ma mee ọtụtụ ihe nkiri na usoro telivishọn. Ọ rụrụ ọrụ na ihe karịrị nkiri 130, gụnyere al-Qatila (1991), al-Tufan (1985), al-Rasif (1993), Mutarada Fi al-Mamnu (1993), Ghadan Sa'antaqem (1980), Hanafy al-Obaha (1990), La Tasalni Man Ana (1984), Siriyun Lilghaya (1986), Nessa Khalf al-Qodban (1986), Qahwat al-Muaridi (1981), el-Mar'a el-Hadeya (1987), Fatat Israel al-Hade (19999), Makhacitation (1992) na Hebir.[5]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Al-Fishawy lụrụ nwanyị ugboro atọ. Nwunye mbụ ya bụ onye na-eme ihe nkiri Samia al-Alfi, site n'afọ 1972 ruo mgbe ha gbara alụkwaghịm n'afọ 1992. Ha nwere ụmụ nwoke abụọ, Omar na Ahmed.[6] Nwunye ya nke abụọ bụ onye na-eme ihe nkiri Soheir Ramzi; ha lụrụ n'afọ 1992 ma kewaa mgbe afọ ise gasịrị, wee gbaa alụkwaghịm.[7] Nwunye ya nke atọ bụ onye na-abụghị onye a ma ama, Nouran Mansor ma kewaa n'afọ 1998.[8] Ya na onye na-eme ihe nkiri Laila Elwi nwekwara mmekọrịta, mana ọ lụghị ya.[7]

Ọrịa na ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị 3 ọnwa Ọktoba afọ 2018, Farouk al-Fishawy, mgbe ọ natasịrị ọta site na Alexandria International Film Festival, mara ọkwa na ya nwere kansa.[4]

Al-Fishawy nwụrụ n'ọrịa kansa imeju n'abalị 25 ọnwa Julaị afọ 2019 mgbe ọ dị afọ 67.[4]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]