Fikile Magadlela

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Fikile Magadlela
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Disemba 1952 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2003 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie
ụdịlandscape art Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

A mụrụ Fikile Patrick Magadlela (ubochí irí àtó n'ọnwa Disemba 1952 nà Newclare, Johannesburg South Africa. Ọ bịdọrọ ise ihe na mgbidi ndị mụrụ ya site na mgbè ọ chetara. Nne na nna ya Arthur Magadlela na Mavis Magadlela zụlitere ya n'ụlọ ịhụnanya.

Ịgụ akwụkwọ nna ya zụrụ ma nweta ihe ọmụma site n'aka ndị agadi. Ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị na ọkọlọtọ asatọ (grade nké irí) iji rụọ ọrụ dị ka ónyé na-ese ihe oge niile. Magadlela bụ ónyé nkuzi onwé ya mànà ya na ndị omenkà ibe ya nọrọ ọtụtụ awa na-agbanwerịta echiche na usoro.

Magadlela ná ndị na-ese ihe dịka Ezrom Legae, Solly Maphiri, Winston Saoli, Percy Sedumedi, Pietro Cuzzolini na Harold Jeppe rụkọrọ ọrụ nkè ọma, na-ewebata ya na ndị na'ihe nkiri na Johannesburg.

Ọrụ ya a mà ámá bụ nke akpọrọ "Birth of The Second Creation" bụ usoro ihe omimi nke ala na-egosi nwoke na nwanyị Afrịka na-agbagharị na ìgwè ojii.

Mgbè e mesịrị, Magadlela ga-eme ihe nkiri ndị siri ike na ihe odide ndị yiri ya na-eji agba na uri. Ihe ngosi mbụ ya bụ na Goodman Gallery nke Linda Givon nwèrè na 1978.

Berman Gallery 1992. Ntụle na UNISA Art Gallery 1995

Magadlela nwụrụ n'afọ 2003, nwa ya nwanyị bụ ónyé na-ese ihe Turiya Magadlela nwụkwara.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  • Fikile Magadlela, Fikile: A Retrospective Art Exhibition : Unisa Art Gallery, May 18-June 14 1995, Unisa Art Gallery, 1995.
  • Ihe ngosi njem ọhụrụ na-anwa ịchọpụta ihe osise "efu efu" nke South Africa nke a na-amaghị n'ụlọ ya, Mail and Guardian, Jeremy Kuper, November 2011.
  • Fikile Magadledla na South Africa History Online, weghachiri na South Africa Story Online, weghaara na 11 Disemba 2013.
  • Fikile Magadledla na Ifa Lethu, natara ma debe ya na 11 Disemba 2013.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Ihe atụ nke nka Magadlela na art.co.za