Folashade Abugan
Ọdịdị
Folashade Abugan
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Folashade Abugan |
ụbọchị ọmụmụ ya | 17 Disemba 1990 |
Ebe ọmụmụ | Akure |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | sprinter |
Ụcha ime anya | agba aja aja |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
so na | 2008 Summer Olympics, 2010 Commonwealth Games, 2006 Commonwealth Games, 2018 Commonwealth Games, 2014 Commonwealth Games |
Folashade Abigeal Abugan (a mụrụ n'ụbọchị 17 n’ime onwa Disemba nke afọ 1990) bu nwanyi Naijiria na-eme egwuregwu ị gba ọsọ nke mita 400. Ọ bụ ya ritere ọla nchara ahụ n'ọsọ nke mita 400 na 2007 All-Africa Games ma kwalite na nrite ọla ọcha na 2008 African Championship, ebe ọ setịpụrụ oge kachasị mma nke 50.89 sekọnsụ. O meriri nrite ọla edo na World Junior Championship nke afọ 2008 ma na asọmpi 2009 African Junior Athletics Championships.
Ọ pụtara na 2010 Commonwealth Games na Delhi were nweta nrite ọla ọcha abụọ nye Naịjirịa n'ọsọ mita 400 ma n'ọsọ mita 4x400. Kosiladị, a chụpụrụ ya ma machibido ya mgbe ọ dachara ule ọgwụ ike were gosi na ọ gbara testosterone prohormone na nlele 'A' ya. Ọ hapụrụ ikike ka e nyochaa nlele B ya. [1]
Mmezu
[dezie | dezie ebe o si]Nnọchite anya Templeeti:NGR | |||||
---|---|---|---|---|---|
2006 | Commonwealth Games | Melbourne, Australia | 2nd | 4 × 400 m relay | 3:31.83 |
World Junior Championships | Beijing, China | 8th | 400 m | 52.87 | |
2nd | 4 × 400 m relay | 3:30.84 AJR | |||
2007 | All-Africa Games | Algiers, Algeria | 3rd | 400 m | 51.44 PB |
1st | 4 × 400 m relay | 3:29.74 | |||
2008 | African Championships | Addis Ababa, Ethiopia | 2nd | 400 m | 50.89 PB |
1st | 4 × 400 m relay | 3:30.07 | |||
World Junior Championships | Bydgoszcz, Poland | 1st | 400 m | 51.84 | |
2009 | African Junior Athletics Championships | Bambous, Mauritius | 1st | 400 m | 52.02 CR |
DQ | 4 × 400 m | ||||
2010 | Commonwealth Games | New Delhi, India | DQ | 400 m | |
DQ | 4 × 400 m |
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Commonwealth Games 2010: Third Nigerian tests positive. BBC Sport (2010-10-15). Retrieved on 2010-11-27.
- Folashade Abugan at World Athletics