Jump to content

Four Beauties

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Four Beauties
quartet

Ụmụ mma anọ ma ọ bụ ụmụ mara oke mma anọ bụ ụmụ nwanyị ndị China anọ ama ama maka ịma oke mma ha. Aha ụmụ nwanyị ndị a bụ Xi Shi, Wang Zhaojun, Diaochan, na Yang Guifei . [1] Ịdị ụkọ na ahuzighị akụkọ ihe mere eme na ezigbo ndekọ banyere ha mere na ihe amara maka ụmụ nwanyị anọ ndị a taa bụ kari akụkọ a na enyefe na ọnụ site n'otu ọgbọ ruo n'ọzọ. Nke a mere na ihe ama gbasara ha bụ eziokwu na akụkọ ifo ejikọtara ọnụ. Ka akụkọ ha si gaa, ekwuru na ha niile dọtara uche nke eze ma ọ bụ onye na achị achị n'oge ha nke dị iche iche. [1] Ha nwetara aha ma bụrụ ndị amara ama site na mmetụta ha metere ndị eze na ndị eze ukwu, yabụ, ụzọ omume ha siri metụta akụkọ ihe mere eme nke China. Atọ n'ime ụmụ mma anọ ahụ mere ihe ndị eze n'oge ha jiri nwetaa ma merie alaeze dị iche iche. Ma'na akụkọ na egosi na ndụ ụmụ mma atọ ahụ kwụsịrị na ihe oke ọdachi.

Ụmụ mma anọ nke China

[dezie | dezie ebe o si]

Ụmụ nwanyị nnukwu mma anọ ahụ biri na oge dị iche iche ma nwee ihe dị ka otu narị afọ n'etiti ha. Ha biri ndụ na usoro eze anọ ndị nke dịkwa iche iche. N'usoro n'usoro, ụmụ nwanyị ndị China ahụ mara mma nke ukwuu nke a na akọ akụkọ ha ruo ugbu a bụ:

  • Xi Shi (onye nke dị ndụ n'ihe dị ka narị afọ nke asaa ruo nke isii BC, oge opupu ihe ubi na mgbụsị akwụkwọ). Ekwuru na ọ mara mma nke ukwuu nke na azụ ga echefu otu esi egwu mmiri ma mikpuo n'okpuru mmiri mgbe ọ hụrụ onyonyo ya n'elu mmiri. Obodo Xi Shi bụ Zhuji, nke dị na Zhejiang Province. Zhuji bụ isi obodo nke Alaeze Yue na oge ochie. Goujian, Eze nke Alaeze Yue, tachiri obi n'ihe isi ike afọ iri (were na ehi ụra na ahịhịa ma na edetụ ire na naanị ihe na adighị ụtọ) iji mezuo ebumnuche ya iji merie Fuchai, Eze nke alaeze Wu ya na ya n'alụ ọgụ. Xi Shi so na ihe Eze Goujian ji mere atụmatụ ya maka oke mma ọmara. N'agbanyeghi na Xi Shi hụrụ Fan Li n'anya, Goujian zigara Xi Shi ka ọ bụrụ onyinye nye Fuchai. N'oge ahụ ịma mma Xi Shi tụrụ Fuchai n'anya nke ukwuu ọ wee hụ ya n'anya. Fuchai chefuru na ọ na alụ ọgụ mgbe ọ zutere Xi Shi. Nke a mere ojiri oge ya niile na mee ka Xi Shi nwee obi ụtọ. N'ihi nke a, Goujian wakporo ma merie Fuchai na agha. Fuchai kwara akwa mmakwaara ịnata onyinye ahụ bụ Xi Shi. Ọ gara n'ihu wee gbuo onwe ya na ike. Enwere akụkọ abụọ banyere ihe mere Xi Shi na oge ahụ. Nke mbụ bụ na Goujian gburu ya site na imikpu ya mmiri n'ihi na ọ na atụ egwu na ọ ga emenye ya ụjọ dịka Fuchai siri mee ya. Akụkọ nke abụọ bụ na ọ mechara bịakwute Fan Li ha na abụọ wee bie ndụ obi ụtọ, ma wezuga ndị ọzọ niile n'ebe di anya.
  • Wang Zhaojun (onye nke dị ndụ n'ihe dị ka narị afọ mbụ BC, na oge usoro ndị eze Han nke dị n'Ebe Ọdịda Anyanwụ), ka ekwuru na ọ mara mma nke ukwuu na ọdịdị ya ga eduhie nnụnụ na efegharị ka ha si na mbara igwe daa. Ekwuru na Wang Zhaojun batara n'ụlọ ebe ana edesa ndị inyom nke Emperor Yun mgbe ọ dị obere. Ọ nọgidere bụrụ onye na ejere ụmụ nwanyị ozi na ebe ahụ ma eze ukwu ahụ eletabeghị ya na ụzọ ọbụla. N’oge ahụ, a na eji ihe osise ahọrọ nwanyị ndị eze ki akwasa iko. Nke a mere na ọtụtụ ụmụ nwanyị na enye ndị na ese ihe ego ka ha were mee ka eserese ha dị oke mma. Ma'na, Wang Zhaojun jụrụ ime nke a ma see ihe osise ya ka ọjọ njọ. Na afọ 33 BC, Hu Hanye gara nleta ma rịọ maka ọmarịcha nwa agbọghọ onye Han ịbụ nwunye ya. Ya mere, e nyere ya Wang Zhaojun otu ụmụ nwanyị oke mma ahụ. Mgbe Eze Ukwu ahụ hụrụ Wang Zhaojun mma ya juru ya anya. E mechara egbuo onye ihe eserese ahụ maka ihe osise ya nke ọjọ ọsere Wang Zhaojun n'ihi na ọ ghagha ụgha na ihe eserese ahụ .
  • Diaochan (onye nke dị ndụ n'ihe dị ka narị afọ nke atọ, oge mbu nke Eastern Han / oge alaeze atọ). Ekwuru na ọ mara mma nke ukwuu na ọnwa n'onwe ya na eme ihere ma e jiri ya tụnyere ihu ya. Enwere akụkọ ifo na nna ya gosipụtara ya nye onye agha Lu Bu wee kwuo n'otu ụbọchị ọ nwere ike ịlụ ya. Mgbe ahụ ọ kpọbatakwara Dong Zhuo wee mee otu ihe ahụ site na ikwe nkwa inye ya ka Diaochan ka ọ bụrụ nwunye ya. Onye nke ahụ siri ọnwụ ma ga kpọrọ ya bụ Diaochan otu nwanyị oke mma China ozugbo ozugbo ma wee lụọ ya. Mgbe Lu Bu chọpụtara nke a, o gburu ma gbaa Dong Zhuo ọkụ, ma merie Diaochan maka nke a.
  • Yang Guifei (719–756, usoro ndị eze Tang ), ekwuru na ọ nwere ihu na emenye okooko osisi niile ihere n'ihi oke mma ya.

Mkpaala okwu

[dezie | dezie ebe o si]

Mkpaala okwu amaara nke ọma nke na akọwa Ụmụ nwanyị nnukwu mma anọ ahụ na obodo China. A na arụrịta ụka kpọmkwem maka mmalite ụdị akpaala okwu ndị a.

Asụsụ Chaịna Bekee
西施沉魚



昭君落雁



貂蟬閉月



貴妃羞花
Xi Shi na -emikpu azụ



</br> Wang Zhaojun na arapụta nnụnụ ka osi n'elu daa



</br> Diaochan na -ekpuchi ọnwa



</br> Yang Guifei na -emenye okooko osisi ihere

A na ejikọ akpaala okwu ndị a mgbe ụfọdụ iji kọwaa ọkachasị ụmụ nwanyị mara mma ma ọ bụ naanị na arụtụ aka na akụkọ ifo ịma mma nke ụmụ nwanyị mma anọ ahụ nke obodo China. Akpaala okwu ahụ bụ 沉魚落雁,閉月羞花. Ma'na enwere ike ikwu akụkụ abụọ ahụ iche iche.

  • Bao Si

Ntụrụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 Woo (2016). Love Tales of Ancient China. Algora, 1–4. ISBN 978-1-62894-204-0.