Gambo Sawaba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gambo Sawaba
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereGambo Dezie
aha ezinụlọ yaAmartey Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Febụwarị 1933 Dezie
Ebe ọmụmụZaria Dezie
Ụbọchị ọnwụ yaỌktoba 2001 Dezie
nwaOtu Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Hausa Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịGreat Nigeria People's Party, Northern Elements Progressive Union Dezie

 

Hajia Gambo Sawaba (15 February 1933 - October 2001) bu onye na agba mbo ihu na enyere umu nwanyi ikike n'ala Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye n'enyere ndi obodo aka [1] [2] Ọ jere ozi dị ka osoto onye isi oche nke Great Nigeria People Party. Ahọpụtakwara ya dika onye ndú nke umu nwanyi na Northern Element Progressive Union (NEPU). [3]

Mbido Ndu[dezie | dezie ebe o si]

Nne Na Nna[dezie | dezie ebe o si]

Haji Sawaba bu nwa Isa Amartey Amarteifio (Onye ana akpo Theophilus Wilcox) bụ onye si Ghana na Fatima Amarteifio bụ nwanyị Nupe nke ochici ime obodo Avun, Niger State . Amarteifo bu onye gụsịrị akwụkwọ na Ghana School of Survey, tupu okwaga Naijiria na 1910 ma chọta oru na ulo ọrụ ụgbọ okporo ígwè Nigeria . Nna nna ukwu nke Fatima bu onye okpu uzu na onye agha nke muru Mamman Dazu, nna ukwu ha. E kwuru Mamman Dazu na ọ bụ ezigbo onye agha ana aju ese ya. [1]

Omụmụ[dezie | dezie ebe o si]

Isa Amartey Amarteifio kpewara uka Islam dika o banyere Zaria ma zute Fatima dika ufodu aro gara ma lukwa ya. Fatima bu nwanyi di ya nwuru, nwere umu ato omuuru Mohammedu Alao tupu onwu o. Alum di na nwuye Fatima na Isa Amartey Amarteifio muputara umu isii nke Sawaba bu nwa nke ise. A na-akpọ ya Hajaratu, kpokwa ya Gambo nke bu aha ana akpo nwa ọ bụla a mụrụ mgbe a mụsịrị ụmụ ejima. [1]

Mmalite Ndụ Na Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

O guru akwụkwọ na Native Primary School na Tudun, Wada. Otú ọ dị, ọ ghaghị ịkwụsị ịga akwụkwọ mgbe nna ya nwụsịrị na 1943, bụ onye nwụrụ ka omechara mkpesa nke isi ọwụwa. Nne ya nwukwara ka afo ato gasiri. [1] Ọ lụrụ di bu onye agha Agha Ụwa nke Abụọ bụ Abubakar Garba Bello mgbe ọ dị afọ iri na atọ na, bụ onye hapụrụ ma ghara ịlaghachi mgbe ọ mụsịrị ime. [3] Ihe a maara nke ọma banyere ya mgbe ọ bụ nwatakịrị, ọ bụ mmasị o nwere na ndị na-agba ara. Ya na ha na-ekwurịta okwu, na-abanye ụfọdụ ma nye ndị ọ nwere ike ịnweta ego, uwe na nri [1] Mgbe ọ bụ nwatakịrị, a na-ekwukarị okwu ya dịka onye isi ike na ọnye o fọrọ nke nta ka ọ banye ogu n'okporo ámá. Dị ka ya si kwuo "Enweghị m ike iguzo iji lelee ebe ana emegide enyi ma obu nwanne na-adịghị ike." O kwuru na aluchitere ndi di otu a agha. Mgbe obula o rutere n 'agha a, o ga - ekwu ozugbo "Ngwa, azurula m, gi agha" nye onye na - adighi ike na agha. [1]

Ọrụ Ndọrọ Ndọrọ Ochịchị Na Ime Ihe Ike[dezie | dezie ebe o si]

Sawaba tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe ọ dị afọ 17. N'oge ahụ, ndị Northern People's Congress bụ ndi nwere nkwado nke ndi Emir na British Colonial Authority nọ na-achị Northern Nigeria, ma Sawaba sonyere òtù Northern Element Progressive Union (NEPU). Ọ bụ onye na agbaso alụm di na nwunye nke ndị nʻetozughi etozu, ndị ọrụ mmanye na onye kwadoro maka agụmakwụkwọ bekee n'ebe ugwu. [4] Gambo meere onwe ya aha mgbe ọ na-ekwu okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ na-arụ ọrụ nʻugwu, bu mgbe ọ rịgoro ma kwuo okwu n'ime ụlọ jupụtara na ụmụ nwoke. [4] Funmilayo Ransome-Kuti kwadoro ya. Ogakwara izute ya na Abeokuta afọ ole na ole. [3] A na-ele ya anya dịka onye ọsụ ụzọ na-alụ ọgụ maka ntọhapụ nke ụmụ nwanyị dị n'ebe ugwu. [4]

Ndụ Onwe Onye Na Ihe Nketa[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ dị afọ iri na atọ, Ọ lụrụ onye agha Agha Ụwa nke Abụọ bụ Abubakar Garba Bello, bụ onye hapụrụ ma ghara ịlaghachi mgbe ọ mụsịrị ime . [3] Alum di na nwunye ndị ozo oluru eteghi aka. Alụm di na nwunye ya na Hamidu Gusau kwụsịrị n'ihi ọgụ ike n'etiti ha abụọ. Ndị ọzọ arukwaghi ọrụ. [3] A kpọrọ ụlọ ọgwụ na Kaduna aha ya. [5]

Ebe Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 THE GAMBO SAWABA STORY. 
  2. Nigeria's Unsung Heroes (10). Feminism As a Prowess: The Profile of Chief (Mrs.) Margaret Ekpo and Hajiya Gambo Sawaba. Retrieved on 19 September 2017.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Hajia Gambo Sawaba. Retrieved on 19 September 2017.
  4. 4.0 4.1 4.2 A Brief History Of Hajiya Gambo Sawaba -The Fearless Politician Who Fought For The Freedom Of Northern Women In Spite Of Several Imprisonments. Archived from the original on 3 November 2017. Retrieved on 19 September 2017.
  5. Hajia Gambo Sawaba General Hospital. Archived from the original on 31 December 2016. Retrieved on 19 September 2017.