Gbemisola Oke

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gbemisola Oke
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
ụdị ọrụ yaperiodontology Dezie
onye were ọrụMahadum nke Ibadan Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of California, Mahadum nke Ibadan Dezie

 

Gbemisola Oke (a mụrụ Gbemisola Aderemi Aderinokun ) bụ prọfesọ nke Naịjirịa nke Piriọdọntọlọji na Kọminiti Dentistirị na Mahadum nke Ibadan . Ọ bụ osote onye isi n'etiti afọ 2015 na 2017. O nweela ọrụ nchịkwa dịka diin, Ngalaba Dentistịrị na Daịrektọ, Center for Entrepreneurship and Innovation na Mahadum nke Ibadan.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Oke gụrụ akwụkwọ nzere bachelọ ya na Mahadum nke Ibadan n’agbata afọ 1976 na 1981. Ọ gaziri Amerịka gụọ maka ahụ ike ọhaneze, were nweta nzere masta na Public Health n'afọ 1985. E mechaa, ọ laghachitere Naịjirịa iji bido ma mezue edemede ya na Epidemịọlọji n’agbata afọ 1987 na 1997. Ọ bụ onye otu ọtụtụ ndị ọkachamara gụnyere Nigerian Medical Association, Nigerian Dental Association, International Association of Dental Research, Society of Women and AIDS in Africa n'etiti ndị ọzọ. [1]

Mbiputa na ọrụ nhazi[dezie | dezie ebe o si]

N'etiti afọ 2007 na 2010, Oke bụ diin, Ngalaba Dentistịrị na Mahadum nke Ibadan . Ruo mgbe a họpụtara ya dịka osote onye isi ọchịchị n'afọ 2015, ọ bụbu onye isi, Center for Entrepreneurship and Innovation. [1] N'ọnwa Jenụwarị afọ 2015, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye isi, nọchiri onye mechara bụrụ onye isi n’ọdịnihu,bụ Abel Idowu Olayinka . Ọ bụ nwanyị nke abụọ nwetara ọkwa dị otú ahụ. [2]

N'afọ 2015, ọ chọpụtara na ire ere ezé pere mpe na Naịjirịa, ma e jiri ya tụnyere mba ndị mepere emepe n'ihi na anyị anaghị atụkwasịkarị menu ndị nwere shuga obi. O kwusiri ike mkpa iji ncha ezé nwere flọriid n'ihi na nke ahụ ga-ebelata ire ere. [3]

N’ikwu okwu n’otu n’ime ụlọ ọrụ ime obodo na-ahụ maka eze o guzobere, Oke kwusiri ike mkpa nke ụdị ya dị iche iche, ebe ọ na-akọwapụta nkwenkwe ụgha banyere nlekọta ahụike ọnụ na ibu ego iji mee ka ọnụ ahịa dị ọnụ ala dị ka isi mbibi na mmezu nke ebumnuche ya iji hazigharịa. sistemụ na-ahụ maka eze na Naijiria. [4]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]