Gcina Mhlophe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Gcina Mhlophe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereNokugcina Dezie
aha ezinụlọ yaMhlope Dezie
aha pseudonymGcina Mhlophe Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Ọktoba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụDurban Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, odee uri, Odee akwụkwọ Dezie
Ihe nriteBBC 100 Women Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Nokugcina Elsie Mhlophe (amụrụ 24 Ọktoba 1958), amakwaara dị ka Gcina Mhlophe, [1] bụ onye na-akwado ịkpa ókè agbụrụ na South Africa, onye na-eme ihe nkiri, onye na- akọ akụkọ, Ode abụ ,onye na-ede ihe omume ejije, onye nduzi na onye ode akwụkwọ.

Ịkọ akụkọ bụ ihe omume ọdịnala miri emi na South Africa, ma Mhlophe bụ otu n'ime ụmụ nwanyị ole na ole na-akọ akụkọ na mba ụmụ nwoke na-achị. Ọ na-arụ ọrụ ya site n'ịrụ ọrụ mmasi, na-arụ ọrụ ichekwa ọkụkọ akụkọ dịka ụzọ isi mee ka akụkọ ihe mere eme nogide ma gbaa ụmụaka South Africa ume ịgụ akwụkwọ. Ọ na-akọ akụkọ ya n'asụsụ anọ nke South Africa: Bekee, Afrikaans, Zulu na Xhosa .

Ndụ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Gcina Mhlope na 1958 na KwaZulu-Natal nye nne si Xhosa na nna si Zulu. Ọ malitere ndụ ọrụ ya dị ka onye ọrụ ụlọ, mechaa rụọ ọrụ dị ka onye na-agụ akụkọ na Press Trust na BBC Radio, mgbe ahụ dị ka onye edemede maka Mụta na Ịkụzi, akwụkwọ akụkọ maka ndị na-agụ akwụkwọ ọhụrụ.

Ọ malitere ịghọta mkpa akụkọ mgbe ọ nọ na Chicago na 1988. Ọ rụrụ ọrụ n'ọbá akwụkwọ dị n'akụkụ agbata obi na-enwekarị ndi oji, ebe ndị na-ege ntị na-eto eto nọgidere na-akpọghachi ya azụ. N'agbanyeghị nke ahụ, Mhlophe malitere iche echiche ịkọ akụkọ dị ka ọrụ mgbe ọ zutere Imbongi, otu n'ime ndị na-ede uri nke akụkọ ifo Africa, na mgbe agbamume sitere n'aka Mannie Manim, onye na-eduzi Ụlọ ihe nkiri Market, Johannesburg .

Kemgbe ahụ Mhlophe apụtala na ihe nkiri site na Soweto ruo London ma asụgharịwo ọtụtụ ọrụ ya na German, French, Italian, Swahili na Japanese. Mhlophe agaala ọtụtụ njem na Africa na mpaghara ụwa ndị ọzọ na-enye nkuzi akụkọ.

Akụkọ Mhlophe na-abụ̀ nchịkọta akụkọ ifo, ozi, ihe na-eme ugbu a, egwu na akpaalaokwu . Nghọta nke nrọ ya bụ ihe na-akpali akpali nke visceral maka ya na ọ na-agafe mmasị ya na-efe efe site n'ịzụlite nkà na-eto eto na-aga n'ihu na-arụ ọrụ nke ịkọ akụkọ site na Zanendaba (nchepụta nke Bring me Story). Atụmatụ a, nke e guzobere na 2002, bụ mmekorita ya na Ụlọ ihe nkiri Ahịa na Read, òtù na-agụ akwụkwọ na mba.

Mhlophe na-eje ozi ugbu a dị ka onye na-elekọta ASSITEJ South Africa, .Otu ụlọ ihe nkiri nke Mba ụwa gbasara ndị n'eto eto na ụmụaka

Mhlophe na-eje ozi ugbu a dị ka onye na-elekọta ASSITEJ South Africa, Otu mba ụwa nke bụ gbasara ụlọ ihe nkiri ụmụaka na ndị n'eto eto

Ọrụ ahọpụtara[dezie | dezie ebe o si]

  • 1983, bụ onye ndu na Umongikazi: The Nurse, nke Maishe Maponya
  • 1984, na Black Dog: Inj'emnyama
  • 1986, place of Weeping (ihe nkiri)
  • 1986, Ha e You seen Zandile? (Ihe omume nke onwe, na Market Theatre, Johannesburg, Mhlophe dị ka Zandile)
  • 1987,Born in RSA (New York)
  • 1989, ememme akụkọ na Market Theatre
  • 1989, ɠụrụ 77uri na nsọpụrụ nke Albert Luthuli, 1960 Nobel Peace Prize onye meriri.
  • 1990, gosipụtara na Zandile? na Emume Edinburgh jehariana Europe na USA
  • 1989–1990, onye ntụzịaka onye obibi na Ụlọ ihe nkiri Ahịa
  • onye nhazi na READ, otu mba mmuta
  • 1991, Ashoka Fellowship (onye na-eme nchọpụta mmekọrịta ọha na eze)
  • 1993, music for Little peopleịrị (CD)
  • 1993, olu onye na-agụ Ọ bụghị ngwa ngwa, Songololo (ndekọ vidiyo), Weston Woods, Weston CT, Scholastic
  • 1994, The gift of the Tortoise (nnyere aka na album Ladysmith Black Mambazo)
  • 1997, Poetry Africa, ngosi onye na-ede uri
  • 1999, ọkà okwu ọbịa na Perth Writers Festival
  • Ndị Orchestra Philharmonic London
  • Ụlọ Nzukọ Royal Albert, London
  • Cologne Philharmonie, Africa na Opera
  • 2000, rụrụ na Peter und der Wolf na Komische Oper (Berlin)
  • Odere egwu maka usoro SABC TV Gcina and friends
  • 2002, Fudukazi's Magic screened na Durban na African Union Film Festival
  • 2002, The Bones of memory (arụmọrụ, ịkọ akụkọ sitere na South Africa ochie na nke ọhụrụ)
  • 2003, ọ kụziri gbasara ịkọ akụkọ n'ihe ọmụmụ Eye of the Beholder
  • 2003, Mata Mata (arụmọrụ, egwu ezinụlọ)
  • 2006, FIFA World Cup emume inyefe South Africa, Germany

Nkwenye[dezie | dezie ebe o si]

  • 1999, NSọpụrụ doctorate si na Open University, UK
  • 1999, nzere doctorate sitere na Mahadum Natal
  • 2014, nzere doctorate sitere na Mahadum Rhodes

Mmekọrịta[dezie | dezie ebe o si]

  • Pops Mohamed, onye egwu na onye nchekwa egwu agbụrụ
  • Ladysmith Black Mambazo, òtù ukwe, The Gift of the tortoise (CD), 1994 na Music for Little people in America' (CD), 1993
  • Bheki Khoza, guitarist, Animated Tales of the World (usoro ihe onyonyo onyonyo maka Angulụ aka nri na UK maka SABC)
  • Anant Singh, onye na-emepụta vidiyo, Fudukazi's Magic (CD na vidiyo maka ndị na-ege German)
  • Biblionef South Africa, ụlọ ọrụ na-enye onyinye akwụkwọ ụmụaka, na-enye ngwugwu akwụkwọ maka ogbako Mhlophe, 2003

Mpụta akwụkwọ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Emere ma kọwaa n'ime egwu njem
  • 1990, gụrụ uri na Songololo: Voices of Change (otu akụkụ nke omenala South Africa si bụrụ akụkụ nke ọgụ megide ịkpa ókè agbụrụ) [2]
  • 1993, Abụ Njegharị (usoro nchịkọta akụkọ nke oge a)
  • Pụtara na mwuli mmuta
  • Pụtara n'ọrụ nka

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • Nhọpụta maka ihe nrite Noma maka Queen of the Tortoises, 1991
  • Onyinye nkata akwụkwọ maka Molo Zoleka
  • Onyinye ihe nkiri OBIE (New York) maka amuru na RSA [3]
  • Fringe First Award (Edinburgh) maka Have you seen Zandile?
  • Joseph Jefferson Award maka Best Actress (Chicago) maka Have You seen Zandile?
  • Sony Award nke Radio Drama nke redio BBC nke Afrika maka Have You seen Zandile?
  • Na 2016 a họpụtara ya ka otu n'ime ụmụ nwanyị otu narị [4]

Akwụkwọ akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Mhlophe, Gcina. Molo Zoleka New Africa Education, 1994. (Akwụkwọ ụmụaka)
  • MaZanendaba (akwụkwọ ụmụaka)
  • Mhlophe, Gcina. The Snake with seven Heads . Johannesburg, Ndị mbipụta Skotaville, 1989. (Akwụkwọ ụmụaka, nke a sụgharịrị n'asụsụ Africa ise, achọrọ mbipụta Bekee n'ọbá akwụkwọ ụlọ akwụkwọ South Africa niile)
  • Mhlophe, Gcina. Have you seen Zandile? . Portsmouth, NH: Heinemann, 1990. (Mmepụta dabere na nwata ya, achọrọ na ọba akwụkwọ mahadum South Africa)
  • Mhlophe, Gcina. Queen of the Tortoises . Johannesburg: Skotaville, 1990. (Akwụkwọ ụmụaka)
  • Mhlophe, Gcina. The singing Dog . Erica Maritz na Andries Maritz gosipụtara ya. Johannesburg: Skotaville, 1992. (Akwụkwọ ụmụaka)
  • Mhlophe, Gcina. Nalohima,The deaf Tortoise. Gamsbek, 1999.
  • Mhlophe, Gcina. Fudukazi 's Magic. Cambridge: Mbiputa Mahadum Cambridge, 1999. (CD - egwu na abụ, arụmọrụ)
  • Mhlophe, Gcina. Ime Fudukazi 's Magic. Mbiputa Mahadum Cambridge, 2000 (CD - egwu na egwu, arụmọrụ, maka ndị German na-ege ntị)
  • Mhlophe, Gcina. Nozincwadi, mother of Books Maskew Miller Longman, 2001. (CD na akwụkwọ, ihe ngosi ụzọ South Africa na ụlọ akwụkwọ ime obodo)
  • Mhlophe, Gcina. African Mother of Christmas . Maskew Miller Longman, 2002. (CD na akwụkwọ)
  • Mhlophe, Gcina. Love Child . Durban: Mahadum nke Natal Press, 2002. (Ncheta, nchịkọta akụkọ)
  • Margaret Daymond et al. (eds). Women writing Africa: The southern region . Johannesburg: Witwatersrand University Press, 2002.
  • Mhlophe, Gcina. Stories ofAfrica . Mahadum nke Natal Press, 2003. (Akwụkwọ ụmụaka)
  • Mhlophe, Gcina. Queen of Imbiri . Maskew Miller Longman. (Akwụkwọ ụmụaka)
  • Mhlophe, Gcina Stories and Songs Africa – South African Music Awards 2010 maka ezi albọm bekee ụmụaka nke African Cream Music

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị odee Africa
  • Ndị ama ama South Africa
  • Abụ Africa

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. This Day in History | South African History Online
  2. Phil Johnson, "Songololo: the sound of freedom". The Globe and Mail, November 3, 1990.
  3. The New York Obies Awards. Archived from the original on 25 March 2015.
  4. "BBC 100 Women 2016: Who is on the list?", BBC News, 21 November 2016. Retrieved 24 November 2016.