Grace Anozie

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Grace Anozie
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereGrace Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1977 Dezie
Ebe ọmụmụEnúgwu Dezie
Ọrụ ọ na-arụpowerlifter Dezie
ụdị egwuregwuParalympic powerlifting Dezie
so na2004 Summer Paralympics, 2012 Summer Paralympics, 2008 Summer Paralympics Dezie

Grace Ebere Anozie (a mụrụ n'ụbọchị nke 16 n'ọnwa Julaị nke afọ 1977) bụ nwaafọ Naịjirịa nke na-eme egwuregwu i bu igwe dị arọ nke ndị akụkụ ahụ ha ezughi oke. Ihe nrite mbụ Anonzie nwetara n'asọmpi ndị akụkụ ahụ ha ezughi oke bụ ọla nchara na 2004 Summer Paralympics n'ihe omume 82.5 kg. N'asọmpi ndị sochirinụ, Anozie nwetara nrite ọla ọcha n'afọ 2008 na ọlaedo n'afọ 2012. N'oge ọrụ ya, Anonzie setịpụrụ ọtụtụ ihe ndekọ na-emetụta nke gụnyere ihe ndekọ asọmpi ndị akụkụ ahụ ha ezughi n'ihe omume karịrị 86 kg nke 2008 Summer Paralympics .

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Anozie nwere mkpọnwụ ahụ n’ihi polio mgbe ọ dị afọ abụọ. [1] Ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum n'afọ 1998 ma gbanwee ọrụ ya gaa egwuregwu mgbe ọ na-enweghị ike ịchọta ọrụ. [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Anozie bidoro bulitewa igwe n'afọ 1998 were banye ọtụtụ asọmpi Paralimpik . N'ibu igwe dị arọ, ọ gbatara onye nke anọ n'ihe omume 82.5 kg na 2000 Summer Paralympics . [3] N'igbanwe banye n'ihe omume karịrị 82.5 kg, Anozie nwetara ọla nchara na 2004 Summer Paralympics . O mechara rite ọla ọcha na 2008 Summer Paralympics na ọla edo na 2012 Summer Paralympics . [1] Na mpụga nke Paralimpik, Anozie nwetara ọla edo na 2013 Powerlifting Asia Open Championship . [4]

N'oge ọrụ ya, Anozie ejiriwo ndekọ ụwa n'ibu igwe dị arọ. Na Beijing Paralympics n'afọ 2008, o mebiri ndekọ Paralimpik n'ihe omume karịrị 86 kg . [5] Emechaa, Anozie setịpụrụ ihe ndekọ ụwa na katigori karịrị 82.5 n'oge Fazza International Powerlifting Championships nke afọ 2012. [1] Ka otu afọ gachara, o jidere ihe ndekọ ụwa n'ihe omume karịrị 86 kg na 2013 Asia Open Championship, nke Precious Orji mechara mebie. [6]

Nrite na mmezu[dezie | dezie ebe o si]

A hoputara Anozie maka ndi n’egwuregwu nke Paralympic International Committee nke ọnwa n’ọnwa Maachị n’afọ 2012. [7]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Anozie biri na Benin,dị n'Edo Steeti, na Naijiria [3] tupu ọ kwaga Amerịka n'afọ 2014. O bu ụzọ gaa Chicago maka ọzụzụ njegharị maka 2014 Commonwealth Games, mana o biriziri na Shreveport,nke Louisiana mgbe ya na onye na-azụ ya nwere esemokwu. [1]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]