Jump to content

HIV/AIDS na Zimbabwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mgbasawanye nke ọrịa HIV / AIDS n'Afrịka, ngụkọta (% nke ndị bu ya dị n'àgbàtà afọ 15-49)

Njé HIV na AIDS bụ nsogbu ahụike ọhaneze bụ isi sekpụ ntị na Zimbabwe. A na-akọ na mba ahụ nwere otu n'ime ọnụ ọgụgụ ndị bu nje a nke kachasị ukwuu e dekọrọ na Sub-Saharan Africa. [1]Dị ka akụkọ si kwuo, nje ahụ anọwo na mba ahụ kemgbe ihe dị ka afọ iri anọ gara aga.[2] Otú ọ dị, ihe akaebe na-egosi na mgbasa nke nje ahụ nwere ike imelarị n'oge gara aga.[3] N'ime afọ ndị na-adịbeghị anya, gọọmentị mba ahụ ekwekọrịtala ime ihe ma tinye usoro ọgwụgwọ iji dozie mgbasa nke ọrịa ahụ na-efe efe.[4] Enweela ọganihu dị ịrịba ama ebe emeela ka ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ndị maara ọnọdụ HIV/AIDS ha, na-anatakwa ọgwụgwọ na-abawanye ụba, ewee na-enwekwa mbịatu nke nje ahụ na ndụ ndị mmadụ. N'ihi nkea, akụkọ ọganihu nke mba ahụ na-egosi na ọrịa ahụ na-efe efe na-agbatuzi agbari, wee na-erute ógó kachasị dị ala. Ụlọ ọrụ ndị si mba ọzọ na gọọmenti mba ahụ ejikọọla ọganihu a enwetara na mmụba n'ọnụ ọgụ nke ndị mmadụ na-eji okpu nnabụenyi ma hà na-enwe mmekọ, mbelata n'ọnụ ọgụ nke ndị na-enwe mmekọ nwoke na nwanyị, nakwa mmụba nke amamihe ndị mmadụ nwere maka nje a na nkwado dị ukwuu sitere n'aka gọọmenti n'inye ọgwụgwọ maka nje a. Ndị kacha nọrọ n'ihe ize ndụ ndị butere la nje HIV/AIDS na Zimbabwe gụnyere ụmụ nwaanyị na ụmụaka, ndị akwụna na ndị na-eme mmekọ nwoke na nwoke nakwa nwanyị na nwanyị.

Mmalite na Ntọala Ya

[dezie | dezie ebe o si]

Mmalite nke ọrịa HIV / AIDS na Zimbabwe malitere n'etiti afọ 1980 mgbe ndekọ nke ndị bu ya rịrị elu site n'ihe karịrị pasentị iri isii.[2] Ndị mbụ butere ya kpatara ịchọ enyemaka maka ọrịa ndị ọzọ dịka ọrịa iku ume siri ike, ma ọ bụ afọ ọsịsa ya na ịta ahụ na-agakọ, yana ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ. Tụkwasị na nke a n'oge a, ụmụaka nwere ọnọdụ mmekọrịta ọha na eze dị elu na-egosi ihe ịrịba ama nke nsogbu adịghị eri ezigbo nri nke metụtara ịda ogbenye, mana achọtabeghị ihe kpatara nsogbu a.   [citation needed] Uto na mmụba n'ọnụ ọgụ nke ọrịa a na mbido nwere njikọ na adịghị ọgwụ dịnụ yana mmụba nke omume mmekọahụ dị oke egwu.[1] Ka ọ na-erule afọ 2000, e mere atụmatụ na pasentị iri abụo na ise nke ndị bi na mba ahụ na-arịa nje ahụ.[5] Taa, a na-ewere na ọnụ ọgụgụ ndị mbụ na-arịa ọrịa n'oge a bụ nke belatara nke ukwuu. Nke a bụ n'ihi ihe mgbochi dịgasị iche iche nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ịkọ akụkọ, yana eziokwu ahụ bụ na ndị mmadụ nwere ike ghara inwe mgbaàmà nje ahụ ruo afọ iri abụọ tupu ha enwee mgbaàmà ndị ga-akpata nchọpụta na ọgwụgwọ.[3]

Mgbasawanye

[dezie | dezie ebe o si]

Ndekọ Mgbasa Nje ahụ

[dezie | dezie ebe o si]
Ndị butere Ọrịa HIV / AIDS ọhụrụ nakwa ndị nwụrụ site na nje ahụ na-eme n'afọ ọ bụla na Zimbabwe site na 1990-2015; data sitere na UNAIDS

N'agbanyeghị ka ọdịdị nke ọrịa a na-efe efe siri sie Ike, mgbasawanye na ofufe nke nje a bụ HIV/AIDS na Zimbabwe bụ nke na-ebelata n'aga n'ihu.[1] Dr. Peter Piot, onye isi nke UNAIDS, kwuru na na Zimbabwe, "Ọdịda nke ógó nke nje HIV nọ na ya bụ nke mgbanwe n'akparamagwa ndị mmadụ kpatara, nke gụnyere mmụbawanye nke ọnụ ọgụgụ ndị na-eji okpu nnabụenyi enwe mmekọahụ, ndị mmadụ igbutu oge tupu ha enwewa mmekọahụ nwoke na nwanyị, nakwa ndị mmadụ inwe ọnụọgụgụ ndị òtù mmekọahụ belatara ebelata."[6] Ebe akụkọ sitere n'òtù ndị dịka UNAIDS na WHO na-egosi mbelata na mmụbawanye nke njé HIV/AIDS na Zimbabwe, ọtụtụ ndị obodo n'ihi ụdị ébé há nọ ka nọkwa n'ihe ize ndụ nke ịkesa njé a.[1] Dịka ihe ọmụmụ emere gazuo na Sub-Saharan Africa siri gosi, ihe mkpata ibute njé HIV/AIDS a, nke nwekwa nhuku kacha sie Ike na nje a gụnyere ọtụtụ ndị òtù mmekọahụ nwoke na nwanyị, ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị akwụna, nakwa ọdịdị nke njé nyitere dịka ọrịa HSV-2 nakwa ọrịa ndị ọzọ na-esite na mmekọ nwoke na nwanyị .[7] Kaosinadị, a na-ekwubi na ije kacha ekesa njé HIV/AIDS n'etiti ndị Zimbabwe bụ mmekọahụ nwoke na nwoke nakwa nwanyị na nwanyị nke dị na-aga, nke a na-anaghị eji okpu nnabụenyi eme.[1]

Ọnụ ọgụgụ Ndị Na-anwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ na Zimbabwe nke a na-ekwu na ọ bụ ọrịa HIV/AIDS na-akpata ya na-aga n'ihu na-ebelata yana ọrịa ndị ọzọ achọpụtara. Ka ọ na-erule n'afọ 2018, UNAIDS kọrọ na e nwere mbelata dị n'ógó pasentị iri isii na ọnwụ ndị ọrịa AIDS kpatara kemgbe afọ 2010, yana mbelata dị n'ọnụ ọgụ puku iri abụọ na anọ bụ ndị mmadụ ọhụrụ na-erute njé HIV.[8] N'otu afọ a, ozi sitere n'ụlọ ọrụ Centers for Disease Control and Prevention na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nwụrụ site na nje a dị puku iri na itoolu, bụ mbelata dị ịrịba àmà site n'ọnụ ọgụ nke afọ ndị gara aga. Ihe kacha akpata ọnwụ ndị bu nje HIV/AIDS a na Zimbabwe bụ njikọ aka nje a yana ọrịa ụkwara nta. Ndetu esi na ọnwụ ndị naanị nje HIV/AIDS na-akpata nweta pere mpe n'ihi na o megidere iwu ịrụ ọrụ akwụna maọbu nwee mmekọahụ MSM.

Nchịkwa na Mgbochi

[dezie | dezie ebe o si]

Ọgwụgwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Mgbalị ndị si n'ime mba nakwa nke mba ụwa ndị ọzọ iji lụso mgbasa nke nje ahụ ọgụ nke sitere na ịnweta ọgwụgwọ antiretroviral n'ọtụtụ ebe enyela aka belata mmụbawanye nke nje ahụ.[9] Nnyocha e mere n'oge na-adịbeghị anya banyere ọganihu gọọmentị nwere n'itinye n'ọrụ iwu ọgwụgwọ nke mba nke si na mba ndị ọzọ bịa na usoro mmejuputa iwu chọpụtara na Zimbabwe enweela ọganihu siri ike na nkwa ya.[10] Ka ọ na-erule afọ 2018, e nwere ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ achịkọtara ọnụ dị otu ǹdè, puku iri asatọ na isii na narị isii na ịrị asaa na anọ (1,086,674) na-anata ọgwụgwọ antiretroviral.[11] Otú ọ dị, ịnweta ọgwụgwọ eruchabeghị ụfọdụ ìgwè na ọnụọgụ mmadụ aka, nakwa ndetu gbasara ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-enweta ọgwụgwọ mgbe obụla dị ụkọ n'ihi ihe mgbochi iwu.[1] The Zimbabwe 2018 Human Rights Report nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke US tinyere na-ekwu na n'oge kemgbe nje ahụ malitere, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ amaala na-arịa HIV / AIDS na-aga n'ihu na-enwe ịkpa ókè ọha na eze taa site na ihere na ọrụ, nke na-eje ozi dị ka ihe mgbochi dị ike maka ịnweta ọgwụgwọ. [12]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 HIV and AIDS in Zimbabwe (en). Avert (2015-07-21). Retrieved on 2020-05-03.
  2. 2.0 2.1 Chingwaru (2018-02-01). "Culture, myths and panic: Three decades and beyond with an HIV/AIDS epidemic in Zimbabwe". Global Public Health 13 (2): 249–264. DOI:10.1080/17441692.2016.1215485. ISSN 1744-1692. PMID 27685780. 
  3. 3.0 3.1 Levy (November 1993). "HIV pathogenesis and long-term survival" (in en-US). AIDS 7 (11): 1401–1410. DOI:10.1097/00002030-199311000-00001. ISSN 0269-9370. PMID 8280406. 
  4. 90-90-90: treatment for all (en). UNAIDS. Retrieved on 2020-05-03.
  5. Terceira (2003-01-01). "The contribution of HIV to fertility decline in rural Zimbabwe, 1985-2000". Population Studies 57 (2): 149–164. DOI:10.1080/0032472032000097074. ISSN 0032-4728. PMID 12888411. 
  6. Department Of State. The Office of Electronic Information. Country Profile: Zimbabwe (en). 2001-2009.state.gov. Retrieved on 2020-05-11.
  7. Chen (2007-10-03). "Sexual Risk Factors for HIV Infection in Early and Advanced HIV Epidemics in Sub-Saharan Africa: Systematic Overview of 68 Epidemiological Studies". PLOS ONE 2 (10): e1001. DOI:10.1371/journal.pone.0001001. ISSN 1932-6203. PMID 17912340. 
  8. Zimbabwe (en). UNAIDS. Retrieved on 2020-05-03.
  9. HIV and AIDS in Zimbabwe (en). Avert (2015-07-21). Retrieved on 2020-05-08.
  10. Tlhajoane (2018-09-21). "A longitudinal review of national HIV policy and progress made in health facility implementation in Eastern Zimbabwe". Health Research Policy and Systems 16 (1). DOI:10.1186/s12961-018-0358-1. ISSN 1478-4505. PMID 30241489. 
  11. Zimbabwe Country Profile (en-us). Centers for Disease Control and Prevention (2019-08-29). Retrieved on 2020-05-04.
  12. Zimbabwe (en-US). United States Department of State. Retrieved on 2020-03-27.