Helen Asemota

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Helen Asemota
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Jamaikạ Dezie
Aha enyereHelen Dezie
aha ezinụlọ yaAsemota Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
onye were ọrụUniversity of the West Indies Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello, Mahadum nke Benin Dezie
webụsaịtịhttps://www.mona.uwi.edu/bms/staff/asemoto.htm Dezie

Helen Nosakhare Asemota bụ onye Biochemist na onye ọrụ ugbo biotechnologist nke bi na obodo Jamaica. Ọ bụ Prọfesọ nke Biochemistry na Molecular Biology na Director nke Biotechnology Centre na Mahadum nke West Indies na obodo Mona, nke di na obodo Jamaica. Nnyocha ya na-emepe usoro biotechnology maka mmepụta na imeziwanye ihe ọkụkụ tuberical. Ọ bụ onye a ma ama maka iduzi nnukwu mmekọrịta biotechnology mba ụwa, yana maka ịrụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ biotechnology nke mba ụwa maka mba ndi UN Nations (UN).

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Asemota na obodo Naijiria. [1]Ọ nwetara nzere bachelọ nke sayensị na Mahadum Benin, nakwa Master of Science na Mahadum Ahmadu Bello na Doctor of Philosophy(PhD) na Mahadam Benin, Nigeria / Mahadum Frankfurt.[1][2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1990, Asemota kwagara obodo Jamaica iji were ọnọdụ dị ka onye nkuzi na-asọpụrụ na Mahadum nke West Indies. [3][4]A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nkuzi n'afọ 1996, e buliri ya ka ọ bụ onye nkuzi dị elu na Biochemistry na Biotechnology n'afọ 1998. N'afọ 2003, e buliri Asemota ka ọ bụrụ Prọfesọ nke Biochemistry na Molecular Biology. [5]Ọ bụ Full Professor na Mahadum Shaw, North Carolina site n'afo 2005 ruo n'afo 2012. [6]N'oge a ọ bụ Onye isi nke ngalaba Nanobiology nke Shaw Nanotechnology Initiative na Nanoscience and Nanotechnology Research Centre (NRC) site n'afo 2005 ruo n'afo 2009, Onye nhazi mmemme nke Nature Sciences Biological Sciences site n'afo 2009 ruo n'afo 2010, na Onye isi oche nke Shaw University Institutional Review Board (IRB) site na 2006 ruo 2009, Senator maka Shaw Faculty Senate n'etiti afo 2007 na n'afo 2012, Onye isi nchịkwa nke Faculty Research Development na NIH- Research Infrastructure for Minority Institutions na dị ka onye nchịkwa IRB n'etiti afo 2010 ruo afo 2012.[6]

Nnyocha[dezie | dezie ebe o si]

Asemota mere nnyocha PhD na Mahadum Benin, Naijiria na Mahadim Frankfurt, ebe ọ mụrụ mkpụrụ ndụ ihe nketa na metabolism nke browning nke yam tubers na nchekwa.[7]

Ọrụ mgbasa ozi[dezie | dezie ebe o si]

Asemota emeela nchọpụta na ndị ọrụ ugbo nke Jamaica, na-anwale ihe ndị a na-akụ na-emepụta na mpaghara ha, ma na-eme ka ụdị ji 'na-eyi egwu' nke Jamaica dịghachi ndụ.[4]

Nkwado mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Asemota nwere ogologo akụkọ ihe mere eme nke ndụmọdụ mba ụwa n'ihe gbasara nchekwa nri na biotechnology. Ọ bụ ọkachamara na teknụzụ mba ụwa maka European Union (site n'afo 1994 ruo 1995), ma jee ozi na United Nations Technical Cooperation among Developing Countries (TCDC) Programs dị ka International Technical Cooperations Programs (TCP). [5][8][9]Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ International Biotechnology na United Nations Food na Agriculture Organisation site n'afo 2001. [10]Nke a gụnyere ndụmọdụ maka International Technical Cooperation nke Syria na mmemme mba ndị na-emepe emepe n'afo 2001 na dị ka onye ndu teknụzụ na nri zuru ezu maka National Seed Potato Production Programme na Republic of Tajikistan n'etiti afọ 2003 na 2007. [9]Ọ na-eje ozi oge ụfọdụ na UN-FAO Seed Production Programs dị ka onye ndụmọdụ mba ụwa.[5]

Eensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "UWI yam research poised to boost bioeconomic Growth", The Jamaica Gleaner, 6 August 2007.
  2. UWI Mona Research Engine [beta]. mord.mona.uwi.edu. Archived from the original on 2019-01-19. Retrieved on 2018-11-09.
  3. Department of Basic Medical Sciences, The University of West Indies, Mona. www.mona.uwi.edu. Retrieved on 2018-11-09.
  4. 4.0 4.1 Professor Helen Asemota | Mona Library (en). www.mona.uwi.edu. Retrieved on 2018-11-09.
  5. 5.0 5.1 5.2 Helen Asemota Promoted to Professor. The University of West Indies at Mona (23 July 2003). Retrieved on 2018-11-09.
  6. 6.0 6.1 Members | Instrumentation & Measurement Society (en). ieee-ims.org. Archived from the original on 2019-03-27. Retrieved on 2018-11-09.
  7. Gleaner. UWI yam research poised to boost bioeconomic growth. Retrieved on 2018-11-09.
  8. Professor Helen N. Asemota | Biotechnology Centre | The University of the West Indies at Mona, Jamaica. www.mona.uwi.edu (2010-08-25). Retrieved on 2018-11-10.
  9. 9.0 9.1 Professor Helen Asemota. www2.sta.uwi.edu. Archived from the original on 2013-06-10. Retrieved on 2018-11-09.
  10. A. (2010). The physics queen : authorized biography of Dr. Elvira Louvenia Williams. ISBN 9781441538574. OCLC 755708994.