Jump to content

Helen Newell Garfield

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Helen Newell Garfield
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereHelen Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya12 Febụwarị 1867, 12 Febụwarị 1866 Dezie
Ebe ọmụmụChicago Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya20 Ọgọọst 1930, 26 Ọgọọst 1930 Dezie
Ebe oliliMentor Municipal Cemetery Dezie
ŃnàJohn Newell Dezie
Dị/nwunyeJames Rudolph Garfield Dezie
nwaRudolph Hills Garfield, Newell Garfield, John Newell Garfield, James A. Garfield II Dezie
Helen Newell Garfield
Garfield in 1911
BornFebruary 12, 1866
Died20 Ọgọstụ 1930(1930-08-20) (aged 64)
OccupationSocialite, advocate for deaf education
Known forFounded the Cleveland Association for the Hard of Hearing and the Lake Erie School of Speech Reading (now the Cleveland Hearing & Speech Center)
Spouse(s)
(m. 1890)
Children4
RelativesJames A. Garfield (father-in-law)

Helen Newell Hills Garfield (February 12, 1867 - August 20, 1930) bụụrụ onye mba America na-eme ihe nkiri na onye na-akwado agụmakwụkwọ ndị ntị chiri. O naara esiri ya n'onwe ya ike ịnụ ihe mgbe o toro. N'oge Agha Ụwa Mbụ, ọ rụrụ ọrụ na òtù American Red Cross ma nakọta ego maka nlekọta ụmụ mgbei nke France.

Mmalite Ndụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Helen Newell Hills na Chicago, Illinois, nwa nwanyị nke John Newell na Judith Poore Hills. A mụrụ nne na nna ya abụọ na Massachusetts. Nna ya bụ onye isi oche nke ụgbọ okporo ígwè.[1]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Helen Newell Garfield nwere ụmụ anọ ọ mụrụ n'afọ 1890, ọ bụkwa onye ama ama na Washington, DC, site n'afọ 1902 ruo afọ 1909, ebe di ya James Rudolph Garfield nọọrọ arụ ọrụ ya na Onye isi ala Theodore Roosevelt n'ógó dị iche iche, gụnyere dị ka odeakwụkwọ nke ime obodo.[2] Mgbe ọ nọ na Washington, o nyere aka guzobe Ngalaba Ụmụ nwanyị nke National Civic Federation mgbe ọ nọ na British Columbia

Mgbe ezinụlọ Garfield laghachiri Ohio n'afọ 1909, o guzobere ụlọ akwụkwọ ọmụmụ ikwu okwu bụ Lake Erie School of Speech Reading nakwa Cleveland Association for the Hard of Hearing n'afọ 1921, [3] ma sonyekwa na American Federation of Organizations for the Hard of Hearing.[4] Ọ rụkwara ọrụ maka ịmepụta klas ịgụ ihe n'egbugbere ọnụ n'ụlọ akwụkwọ gọọmenti niile nke Cleveland [5] Helen Newell Garfield n'onwe ya bụ onye ntị ike mgbe o toro.[6]

Maka ọrụ ya n'ịchụ nta ego maka ụmụ enwe nne enwe nna sitere n'Agha Ụwa Mbụ, ọ natara ihe ịchọ mma site n'aka Eze na Eze Nwanyị nke Belgium. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye nlekọta na Bureau of Supplies, American Red Cross, na-enyocha ihe ndị e nyere maka ógó na iru eru ya.

Ndụ onwe onye na ihe ncheta Ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1890, Helen Newell lụrụ onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị James Rudolph Garfield, nwa nke Onye isi ala James A. Garfield . [7][8] Ha nwere ụmụ nwoke anọ, John, James nke Abụọ, Newell, na Rudolph. A na-akpọ ụlọ ha na Mentor, Ohio, "Hollycroft". Ụmụ ya nwoke James na John jere ozi na ndị agha mba United States n'oge Agha Ụwa Mbụ. [9]

Helen Garfield nwụrụ n'afọ 1930, mgbe ọ gasịrị afọ iri isii na atọ, site na mmerụ ahụ o nwere n'ihe mberede ụgbọala na New Hampshire.[10] A na-edebe akwụkwọ ya na akwụkwọ di ya na Ọ́bá Akwụkwọ nke Congress.[11] Ụfọdụ n'ime ihe nkuzi ya dị na akwụkwọ nwa ya nwoke James A. Garfield nke Abụọ na Western Reserve Historical Society . [12] Ụlọ akwụkwọ Garfield nke ịgụ okwu bụzi Cleveland Hearing & Speech Center ugbua, nke ejikọtara ya na Mahadum Case Western Reserve . [13]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Mrs. Helen N. Garfield" Daily Boston Globe (August 21, 1930): 3.
  2. Margaret B. Downing, "Mrs. James R. Garfield, Wife of the Secretary of the Interior, Is the Youngest Matron in the Boudoir Cabinet, and One of the Most Dignified Figures in the High Official Set" The Washington Post (September 1, 1907): E8.
  3. Cleveland Hearing and Speech Center, Case Western Reserve University.
  4. About CHSC. www.chsc.org. Retrieved on 2024-05-24.
  5. Lucia Johnson Bing, Social Work in Greater Cleveland (Welfare Federation of Cleveland 1938): 184.
  6. Finding Aid, Helen Newell Garfield Papers, Western Reserve Historical Society, OhioLINK Finding Aid Repository.
  7. "Young Garfield Weds Miss Newell" The Washington Post (December 31, 1890): 4.
  8. The Generosity of James Rudolph Garfield (U.S. National Park Service) (en). www.nps.gov. Retrieved on 2024-05-24.
  9. "James Garfield, Ex-President's Grandson, 75" Boston Globe (July 4, 1969): 29.
  10. "Mrs. J. R. Garfield Dies of Injuries in Crash" New York Times (August 21, 1930): 13.
  11. James Rudolph Garfield Papers, Manuscripts Division, Library of Congress.
  12. James A. Garfield II Family Papers, Western Reserve Historical Society.
  13. Cleveland Hearing and Speech Center, University Circle Inc.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]