Helen Oyeyemi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Helen Oyeyemi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereHelen Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Disemba 1984 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ Dezie
ụdị ọrụ yaliterature written by women Dezie
ebe agụmakwụkwọCorpus Christi College, The Cardinal Vaughan Memorial RC School Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Onye òtù nkeRoyal Society of Literature Dezie
Ihe nriteFellow of the Royal Society of Literature, Somerset Maugham Award Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie
Photo of author Helen Oyeyemi, taken in January 2021

Helen Olajumoke Oyeyemi (a mụrụ n'abalị iri n'ọnwa nke iri na abụọ (Disemba) n'afọ 1984) bụ onye ojii,nke Briten bụ onye ode akwụkwọ na-ede akwụkwọ nkpirikpi. Kemgbe afọ 2014 ụlọ ya dị na Prague . [1] [2]

Ndụ onwe Onye[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Helen Oyeyemi n'afọ 1984 na Naijiria mana o toro na Lewisham,na Saụt Lọndọn ma nna ya bụ onye nnọchi anya onye nkuzi ma nne na-arụ ọrụ na London Underground. [3] Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Cambridge. [4] Ọ bi na Prague ugbu a.

Ndụ na edemede[dezie | dezie ebe o si]

Oyeyemi dere akwụkwọ mbụ ya, The Icarus Girl, mgbe ọ na-agụ akwụkwọ A-level ya [5] na Kadịnal Vaughan Memorial School . Ka ọ na-agụ akwụkwọ sayensị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Corpus Christi College, Cambridge, Oyeyemi hụrụ egwuregwu abụọ ya, Juniper's Whitening na Victimese, nke ụmụ akwụkwọ ibe ya mere iji too ya, na nke Methuen mechara bipụta.

N'afọ 2007, Bloomsbury bipụtara akwụkwọ nke abụọ nke Oyeyemi, The Opposite House, nke sitere n’akụkọ ọdịnala ndị Kuba . [6] Akwụkwọ nke atọ ya, White Is for Witching, nke akọwapụtara na o nwere "mgbọrọgwụ na Henry James na Edgar Allan Poe ", nke Picador bipụtara n'ọnwa Mee afọ 2009. Akwụkwọ nke anọ, Mr Fox ("ntụgharị uche nke gbasara odide ihe nke jupụtara navignettes nke n'akowa otu asụsụ si atọhapụ ma ọ bụ amachi", Anita Sethi bụ onye dere nke a), [7] bụ Picador bipụtara n'ọnwa Juun afọ 2011, na nke ise, Boy, Snow, Bird, in 2014 . [3]

Oyeyemi bipụtara nchịkọta akụkọ What Is Not Yours Is Not Yours, n'afọ 2016 [8] mana ọrụ ya kachasị ọhụrụ, akwụkwọ akụkọ akpọrọ Gingerbread, ka e bipụtara n'ụbọchị nke ise n'ọnwa Maachị afọ 2019. [9]

Otu n’ime ọtụtụ ihe e dere n’edemede Oyeyemi bụ agbụrụ na ị cha ọcha, ọkachasị na 'Boy, Snow, Bird'. Oyeyemi na-ekwu na ọ metụtara ya site n'akwụkwọ ọ gụrụ na nwata ebe a kọwara ndị isi ojii n'ụzọ nleda anya. [10]

Onyinye ọkachamara na mmata[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ akụkọ ya bụ White Is for Witching ruruogo nke ikpeazụ nke Shirley Jackson Award nke afọ 2009 ma[11] wee nweta akara ugo mmụta Somerset Maugham Award nke afọ 2010. [12] N’afọ 2009 ka a mara Oyeyemi dịka otu n’ime ụmụ nwanyị nọ na ndepụta nke “25 under 25” nke Venus Zine . [13] N'afọ 2013, e tinyere ya na ndepụta Granta Best of Young British Novelists . Boy, Snow, Bird ruru agba nke ikpeazụ na Los Angeles Times Book Prize n'afọ 2014. [14] Boy, Snow, Bird nwetara PEN Open Book Award : maka ọrụ akwụkwọ pụrụ iche nke onye edemede nke abụghị onye ọcha e bipụtara n'afọ 2016. [15]

Oyeyemi bụ onye ọka ikpe na Booktrust Independent Foreign Fiction Prize for 2015, [16] wee rụọ ọrụ ka onye ọka ikpe maka 2015 Scotiabank Giller Nrite . [17]

A họpụtakwara Oyeyemi ka ọ bụrụ onye otu ndị Royal Society of Literature n'afọ 2013. [18]

Ihe omuma akwukwo[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ agụmagụ[dezie | dezie ebe o si]

Ejije[dezie | dezie ebe o si]

  • Juniper's Whitening (2004) [24]
  • Victimese (2005) [25]

Nchịkọta akụkọ dị mkpirikpi[dezie | dezie ebe o si]

  • What Is Not Yours Is Not Yours (2016) [26]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Helen Oyeyemi: 'I'm interested in the way women disappoint one another'", The Guardian, 2 March 2014. Retrieved on 20 November 2016.
  2. What is Not Yours is Not Yours by Helen Oyeyemi. The London Magazine (16 March 2016). Retrieved on 20 November 2016.
  3. 3.0 3.1 3.2 Quinn, Annalisa (7 March 2014). The Professionally Haunted Life of Helen Oyeyemi. NPR.
  4. Helen Oyeyemi - Biography. British Council Literature.
  5. Jordan, Justine (11 June 2011). Mr Fox by Helen Oyeyemi – review. The Guardian. Retrieved on 30 January 2012.
  6. D'Erasmo, Stacey (27 February 2014). Helen Oyeyemi's 'Boy, Snow, Bird' turns a fairy tale inside out. The Los Angeles Times.
  7. "Mr Fox by Helen Oyeyemi – review", The Observer, 13 May 2012.
  8. Oyeyemi, Helen. What Is Not Yours Is Not Yours (in English). 
  9. Charles, Ron. Review | Helen Oyeyemi's 'Gingerbread' recipe: Fairy tales with a dash of surrealism (en).
  10. Quinn, Annalisa. The professionally haunted life of Helen Oyeyemi.
  11. The Shirley Jackson Awards " 2009 Shirley Jackson Awards Winners.
  12. Helen Oyeyemi - Literature.
  13. You'll Want To Get Helen Oyeyemi's New Book 'What is Not Yours is Not Yours' After Reading These Reviews. Archived from the original on 2020-10-29. Retrieved on 2020-12-04.
  14. "L.A. Times Book Prize Finalists Announced".
  15. "2017 PEN America Literary Awards Winners", Pen America, 22 February 2017.
  16. Irvine, Lindesay. "Jenny Erpenbeck Wins Independent Foreign Fiction Prize", 27 May 2015.
  17. Medley, Mark. "The Giller Prize expands its jury to five people", 14 January 2015.
  18. Helen Oyeyemi | The Booker Prizes. Archived from the original on 2020-06-08. Retrieved on 2020-12-04.
  19. Downer, Lesley. "'The Icarus Girl': The Play Date From Hell", 2005-07-17.
  20. Shamsie, Kamila. "Review: The Opposite House by Helen Oyeyemi", 2007-05-12.
  21. Ervin, Andrew. "Miri's Hunger", 2009-09-08.
  22. Bender, Aimee. "A Writer of Slasher Books Finds More Than a Muse", 2011-10-28.
  23. Gingerbread by Helen Oyeyemi.
  24. "Juniper's Whitening by Helen Oyeyemi", Methuen.
  25. Brown, Helen. "A writer's life: Helen Oyeyemi", 2005-01-09. (in en-GB)
  26. Berg, Laura Van Den. "'What Is Not Yours Is Not Yours,' by Helen Oyeyemi", 2016-03-18.

Nrụtụaka dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]