Helen Ukpabio

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Helen Ukpabio
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereHelen Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1969 Dezie
Ebe ọmụmụImo State Dezie
Ọrụ ọ na-arụpastor Dezie

Helen Ukpabio bụ onye nchoputa na onye isi African Evangelical franchise Liberty Foundation Gospel Ministries nke di na Calabar, Cross River State, Nigeria. [1] A na-ebo ya ebubo na ọ na-akpata mkpagbu zuru ebe niile, ịta ahụhụ na ọnwụ ike nke ụmụaka ndị eboro ebubo amoosu .

A mụrụ Ukpabio na obodo Mbent, Imo State, Nigeria, ma o luru Dr. Elijah Ukpabio. O muru ụmụ atọ. [2]

N'oge ọ bụ nwata ọ gụrụ akwụkwọ na St. George's Catholic School dị na Falomo, ụlọ akwụkwọ Jinadu Anglican dị na Obalende na ụlọ akwụkwọ Methodist Girls' School na Ikot Ekpene, Akwa Ibom State, ha niile di na ndịda-ọwụwa anyanwụ Nigeria. [3]

N'afọ 1992, Ukpabio guzobere Liberty Foundation Gospel Ministries ,nwee ebumnobi igbasa nkowa akwukwo nso n'uzo nke ya nye ndi obodo West Africa[4]

Ukpabio na ndi otu ya kwenyere na ekwensu nwere ike igosipụta onwe ya n'ime ahụ ụmụaka site n'iji mmụọ ọjọọ mee ka ha bụrụ ndị otu ya n'ụdị 'amoosu ndi nwanyima ọ bụ amksu ndi nwoke [5] [6] [7]

Na-ichoputa nkwenye ụgha, okachasi ndị metụtara mmụọ ma ọ bụ mmụọ ọjọọ ma ọ bụ amoosu, [8] Nzuko Helen Ukpabio etoola nke ukwuu na Nigeria na West Africa kemgbe ntọala ya.Ugbuq enwere nnukwu ụka Liberty Gospel na Cameroon, Ghana na South Africa nakwa Nigeria. Ụkpabio ebipụtala echiche ya n'akwụkwọ dị iche iche. Ọmụmaatụ bụ 'Ikpughe Ihe omimi nke Amoosu', nke o kwuru na: [2]

Tupu maobu na afo abuo , nwatakịrị ahụ na-eti mkpu n'abalị, na-ebe ákwá,nwekwa iba mberede na-akawanye njọ na ahụ ike, na-etinye àgwà nke egwu, o nwekwara Ike anaghiberi nri ofuma

Ọ na-emepụtakwa, site na ụlọ ọrụ mmepụta ihe nkiri ya, Liberty Films, otu ngalaba nke Liberty Foundation Gospel Ministries ọtụtụ ihe nkiri iji gbasaa echiche na ụmụaka nwere ike ịnwe mmụọ ọjọọ. Nke kacha ewu ewu n'ime ihe ndị a bụ njedebe nke ndị ajọ omume nke gosiri na ụmụaka na-eme ihe nkiri na-eri anụ mmadụ na-egbu ndị mụrụ ha. [9] [10] Ihe omume ya abụghị naanị Naijiria. Ukpabio kwuputara na ya ga-ekwusa ozi ọma na Limbe, Cameroon, iji kwalite mmemme ọ kpọrọ "Nnwere Onwe Site n'ọchịchịrị Ezinụlọ siri ike", Ọktoba 18–22, 2017. [11]

Ọ na-akpalite ogbaghara megide ndị amoosu a nke n abukari ụmụaka , umuwanyi na ndi okenye. Ndị Cameroon kwesịrị iguzogide Ukpabio. Ha kwesịrị ịjụ 'ozi ọma' ya nke ịkpọasị na nkewa n'ezinụlọ na obodo. - Leo Igwe

N'afọ 2007 otu akwụkwọ akụkọ Observer kwuru na Ukpabio na ndị ụkọchukwu ozioma ndị ọzọ na-agba ume ka ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-ebo ebubo amoosu na ndị nne na nna na ndị obodo na emegide ma na-akparị ha n'ihi ya. [12]

N'afọ 2008, akwụkwọ akụkọ TV Dispatches Saving Africa's Witch Children nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi UK Channel 4 kwuru na echiche nke ọ na-ekwupụta ebutela nnukwu mmụba na ụmụaka ndị ezinaụlọ ha na-emegide ma na agbahapụ na West Africa, okachasi na steeti Akwa Ibom, Nigeria. [13] Akụkọ abụọ ahụ gbaadoro ukwu na ọrụ ndị ọrụ ebere abụọ, CRARN na Stepping Stones Nigeria, nke a na-akpọ ugbu a dị ka nchekwa Child Africa, nke bu n'obi ilekọta ụmụaka ndị nne na nna ha jụrụ maka igosi ihe ha kwenyere na ọ bụ akara amoosu, nkwupụta nke ndị Associated Press kwukwara. The Telegraph Tọzdee 14 Eprel 2011. [14] A kọwo ebubo ahụ na ịgbachitere ya megide ha na New York Times .

Ogbako 2009 na Naijiria nke na-akatọ nzukọ ya bụ ndị otu ya mebiri nke ukwuu. [15]

Na 2014, Ukpabio wetara ikpe nkwutọ megide British Humanist Association (BHA) na Witchcraft and Human Rights Information Network (WHRIN) na-achọ ugwo mmezi nke £ 500,000,000. Ukpabio na-ekwu na ndị BHA kwutoro ya site n'ikwu na ọ kwuru na omume ụfọdụ ụmụaka na-enwe bụ ihe nke ekwensu mgbe ọ na-ekwu na ọ bụ 'ndị mmụọ amoosu' nwere. BHA kọwara ikpe a dị ka njem nlegharị anya nkwutọ . [16] Ka o zigachara ndị mmadụ ka ha kpasasịa ọgbakọ onye mmadụ Leo Igwe duziri n'afọ 2009, ọ gbara akwụkwọ maka $1.3m megide gọọmentị maka inye ndị uwe ojii ka ha chekwa ndị otu Igwe. E wepuru uche na qkukwo ahi ogbarq[7] [17] Ukpabio jikwara nkwuto megide otu ndị ọzọ nke omume ya, ọkachasị otu na-abụghị gọọmentị Stepping Stones Nigeria . [7] Ndị Home Office egbochila ya ịbanye Great Britain site n'ịkagbu visa ya mgbe oku sitere n'aka ndị mgbasa ozi na 2014 ka amachibio ya na Britain n'ihi ihe nchebe ụmụaka . [1]

  1. 1.0 1.1 "Nigerian witch-finder Helen Ukpabio threatens legal action against", The Independent, 2014-09-01. Retrieved on 2017-12-05. (in en-GB)
  2. 2.0 2.1 This Christian preacher should not have been allowed to bring her 'witch hunt' into this country | From the Observer | Observer.co.uk. theguardian.com. Retrieved on 17 April 2014.
  3. Biography. www.sodasandpopcorn.com. Retrieved on October 14, 2017.
  4. "Call to ban 'witch hunter' Helen Ukpabio who poses risk to children – UK Politics – UK – The Independent", independent.co.uk. Retrieved on 17 April 2014.
  5. Harrison. "'Child-witches' of Nigeria seek refuge", The Telegraph, Telegraph Media Group Limited, November 8, 2008. Retrieved on October 14, 2017.
  6. Mungai. "Americans Should Protest Nigerian Witch-Hunter’s Visit", Huffington Post, March 12, 2012. Retrieved on October 14, 2017.
  7. 7.0 7.1 7.2 Robbins. "The dangerous fight for the 'child witches' of Nigeria", The Guardian, Guardian News and Media Limited, January 11, 2011. Retrieved on October 14, 2017.
  8. International Humanist and Ethical Union (23 November 2007). Superstition and Witchcraft in Africa | International Humanist and Ethical Union. Iheu.org. Archived from the original on 16 April 2012. Retrieved on 9 July 2012.
  9. End of the Wicked (Video 1999). IMDb.com. Retrieved on 25 November 2012.
  10. Reidel (2012). Children in African Witch-Hunts: An Introduction for Scientists and Social Workers. www.whrin.org. Witchcraft and Human Rights Information Network. Retrieved on October 14, 2017.
  11. Igwe. "Ukpabio’s Witch Hunting Mission Must Stop", News Ghana, September 15, 2017. Retrieved on October 14, 2017.
  12. Tracy McVeigh in Esit Eket. "Children are targets of Nigerian witch hunt | World news | The Observer", Guardian, 10 December 2007. Retrieved on 9 July 2012.
  13. Homepage – Channel 4 News. Channel4.com. Retrieved on 9 July 2012.
  14. Harrison. "'Child-witches' of Nigeria seek refuge", Telegraph, 8 November 2008. Retrieved on 25 November 2012.
  15. CFI Representative Assaulted by Christians at Children's Rights Conference. Center for Inquiry (5 August 2009). Retrieved on 25 November 2012.
  16. BHA. Libel tourist and Nigerian 'witch hunter' (the self styled) 'Lady Apostle' Helen Ukpabio attempts to stifle critics by suing BHA for half a billion pounds. Retrieved on 1 September 2014.
  17. Igwe (December 13, 2010). Court rules against Helen Ukpabio and the Liberty Gospel Church. Butterfly and Wheels. Retrieved on October 14, 2017.