Hellen Adoa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Hellen Adoa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Jenụwarị 1977 Dezie
Ebe ọmụmụSerere Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nkuzi, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda, State Minister for Fisheries Dezie
Mpaghara ntuli akaSerere District Dezie
ebe agụmakwụkwọUganda Martyrs University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2001 Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

Hellen Adoa (amụrụ na 25 Jenụwarị 1977), bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ugandan nke na-eje ozi dị ka onye omeiwu na-anọchite anya ụmụ nwanyị na Serere District na 10th Ugandan Parliament (2016 ruo 2021).[1]

Site na uboch 14 Disemba na afo 2019, ọ na-eje ozi n'otu oge ahụ dị ka Minista na-ahụ maka ịkụ azụ, na Kọmitii Ugandan.[2]

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Serere District, na mpaghara Teso, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Uganda, na 25 Jenụwarị 1977. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Kelim . Ọ gụrụ akwụkwọ na Ngora Girls Secondary School, maka ọmụmụ O-Level ya, gụsịrị akwụkwọ na Uganda Certificate of Education, na 1992. N'afọ 1995, ọ gụsịrị akwụkwọ A-Level na Ngora High uloakwukwo, gụsịrị akwụkwọ na Uganda Advanced Certificate of Education.[1]

O nwere diplọma abụọ; otu bụ Diploma na Business Studies, nke Victoria Business Institute, Tororo nyere, nke ọzọ bụ Diploma na Education Management, site na Mahadum Uganda Martyrs. Degree mbụ ya, Bachelor of Democracy and Development Studies na ogo nke abụọ ya, Master of Local Governance and Human Rights, bụ nke Mahadum Uganda Martyrs nyere.[1]

Ọrụ tupu ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ruo oge afọ iri na ise, site na mbido na afọ 2001 ruo na ngwụcha na afọ 2015, Hellen Adoa jere ozi dị ka onye nduzi n'ụlọ akwụkwọ dị iche iche nke ụmụaka na ụlọ akwụkwọ elementrị, ụfọdụ n'ime ha bụ nke ya. Ọ bụkwa onye nduzi na Halcyon High School.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ọ banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ntuli aka nke Uganda site na ịsọ mpi maka oche ndị omeiwu nke Serere District Women Constituency na afo 2016. A họpụtara ya, ọ bụkwa onye otu ndị omeiwu ugbu a maka mpaghara Serere. Ọ debanyere aha na pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Resistance Movement na-achị.[1]

N'abalị iri na anọ n'ọnwa Disemba n'afọ 2019, a kpọrọ aha ya na kọmitii nke Uganda dị ka minista nke steeti maka ịkụ azụ; ọkwá onye isi ala nke Uganda Yoweri Kaguta Museveni họpụtara ya.[2] A ṅụrụ ya iyi dị ka Minista na-ahụ maka ịkụ azụ na 13 Jenụwarị 2020.[3]

Hụkwa nka[dezie | dezie ebe o si]

  • Margaret Lamwaka Odwar
  • Molly Nawe Kamukama
  • Ógbè Serere
  • Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
  • Nzukọ omeiwu nke Uganda
  • Patrick Okabe
  • Ịlaịja Okupa

Ebesidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Parliament of Uganda (2016). Parliament of Uganda Members of the 10th Parliament: Adoa Hellen. Parliament of Uganda. Archived from the original on 27 April 2021. Retrieved on 6 February 2020.
  2. 2.0 2.1 Daily Monitor (14 December 2019). Museveni Shuffles Cabinet, Drops Muloni, Appoints Magyezi. Retrieved on 6 February 2020.
  3. New Vision (13 January 2020). New ministers take office. Retrieved on 6 February 2020.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]