Henry Askeli

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Philip Henry Askeli (March 24, 1886 na March 13, 1962) bụ onye FINnish American draftsman, onye na esokwunye na ihe Ana eme na onye na enye ndụmọdụ

A mụrụ Askeli n'àgwàetiti Hailuoto na North Ostrobothnia, Finland; ndị mụrụ ya bụ John (Juho) Askeli Jr. (1861 Xi1934) na Kaisa Stiina (née Kallsten; 1848 Xi1923) si Hailuoto.[1][2][3] Ọ gara ụlọ akwụkwọ elementrị wee kwaga United States na afọ 1900.[4] Ọ gụrụ akwụkwọ na Lockwood School of Art na Kalamazoo, Michigan site na 1908 ruo 1909, New York College of Art and Design site na 1915 ruo 1916, na Chicago Academy of Art na 1918. Site na 1916 ruo 1917 ọ rụrụ ọrụ maka Duluth News Tribune .[1]

Askeli sonyeere òtù ndị ọrụ mgbe ọ dị obere.[4] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nta akụkọ maka Toveri site na 1912 ruo 1915, dị ka ode na njikota akụkọ ukwu nke Finnish Socialist Federation of America site na 1917 ruo 1922, na dị ka onye odeakụkọ maka Työmies site na 1924 ruo 1927 (ọ bụkwa onye nchịkọta akụkọ akwụkwọ akụkọ ruo 1925).[1] Site na 1922 ruo 1923, Askeli rụrụ ọrụ na Petrozavodsk, Karelia[5] ma site na 1927 ruo 1929 ọ bụ onye isi ngalaba agụmakwụkwọ nke Co-operative Trading Association na Brooklyn.[1] N'afọ 1920, Askeli so na Communist Party nke United States, nke a chụpụrụ ya na ndị mmegide ya na 1928. O mechara bụrụ onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Finnish American League for Democracy.[4]

Mgbe ọrụChara oru ndọrọ ndọrọ ọchịchị .Askeli rụrụ ọrụ dị ka physiotherapist na Boston, Rhode Island, na Hyannis, o nwekwara ụlọ ọgwụ na West Yarmouth, Massachusetts. Ọ natara nzere doctorate ya na ọgwụ sitere n'okike na Mahadum Taylor dị na Chattanooga na 1939. O dekwara akwụkwọ ndị metụtara ubi ahụ.[1][4]

Askeli nwụrụ na Hyannis, Massachusetts mgbe ọ dị afọ 76.[6]

Ọrụ nkịtị[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 (1949) Who's Who Among Finnish Americans. Fitchburg: Raivaaja Publishing Company, 12–13. 
  2. Hailuoto Communion Book 1891-1900, page 450. (in Finnish)
  3. Hailuoto Children’s Book 1891-1900, page 450. (in Finnish)
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 Elis Sulkanen (1951). Amerikan suomalaisen työväenliikkeen historia (in fi). Fitchburg, Massachusetts: Amerikan Suomalainen Kansanvallan Liitto, Raivaaja Publishing Company, 486–487. 
  5. Auvo Kostiainen (1978). The Forging of Finnish-American Communism 1917-1924. Turku: The Migration Institute. 
  6. Albuquerque Journal (November 16, 1962), p. 107.