Herbert Wigwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Herbert Wigwe
Born
Herbert Wigwe

(1966-08-15) 15 Ọgọstụ 1966 (age 57)
Lagos State, Nigeria
CitizenshipNigeria
OccupationMD/CEO of Access Bank plc
Herbert Wigwe
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoHerbert Wigwe Dezie
Aha ọmụmụHerbert Onyewumbu Wigwe Dezie
Aha enyereHerbert Dezie
aha ezinụlọ yaWigwe Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Ọgọọst 1966 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan, Isiokpo Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya9 Febụwarị 2024 Dezie
Ebe ọ nwụrụNipton Dezie
Ụdị ọnwụaccidental death Dezie
ihe kpatara ọnwụhelicopter crash Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụeconomist, onye ọrụ ụlọ akụ Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London, Mahadum nke Nigeria Dezie
affiliationUlọ ọba ego nke Access Dezie
affiliation stringAccess Bank Plc Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
so naWorld Economic Forum Annual Meeting 2015, World Economic Forum Annual Meeting 2017 Dezie
Ihe nriteOrder of the Federal Republic Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Herbert Onyewumbu Wigwe CON (bụ onye a mụrụ n'ubochi nke iri na ise n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1966 na Legọs) nne na nna bụ ndị Ikwerre sitere na Omueke Isiokpo. Herbert bụ onye na-echekwa ego na onye ọchụnta ego Naijiria. Ọ bụ onye isi oche nke Access Holdings Plc ugbu a, nke a na-ere dị ka Access Corporation. Herbert bụ onye isi nchịkwa/onye isi oche nke Access Bank plc, otu n'ime ụlọ akụ ise kachasị elu na Naịjirịa, mgbe ọ nọchiri onye mmekọ azụmahịa ya, Aigboje Aig-Imoukhuede na ọnwa Jenụwarị n'afọ 2014 rue n'ọnwa Eprel nke afọ 2022.[1]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Wigwe nwere nzere na ndekọ ego na Mahadum Naịjirịa, nzere mastas na Banking na Finance na College Mahadụm of North Wales (nke bụzi Bangor), nzere mastas na Financial Economics na Mahadim London, ọ bụkwa Alumnus nke Harvard Business Skulu Executive Management Program.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Wigwe malitere ọrụ ya na Coopers & Lybrand, Legosị dị ka onye ndụmọdụ nchịkwa, mgbe o mesịrị ruo ogo dị ka onye na-ahụ maka ego n'ụlọ ọrụ ahụ. Mgbe ọ nọrọ na Capital Bank, ọ sonyeere GTBank ebe ọ nọrọ ihe karịrị afọ iri na-arụ ọrụ na ụlọ akụ, na-arịgo ịghọ onye isi nchịkwa na-ahụ maka ụlọ ọrụ ahụ bụ ụlọ akụ.

N'afọ 2002, Wigwe na onye mmekọ azụmahịa ya, Aigboje Aig-Imoukhuede zụrụ ihe bụ obere ụlọ akụ azụmahịa n'oge ahụ. Access Bank n'oge ahụ bụ ụlọ akụ nke iri isii na ise kachasị n'ime ụlọ akụ iri asato na iteghite dị na mba Naịjirịa.[3]

N'ime afọ iri atọ gara aga, ụlọ ọrụ Access Corporation agbanweela site na ụlọ akụ Naịjirịa a na-amaghị ama gaa na ụlọ ọrụ ego Afrịka dị elu n'ụwa. Taa, ụlọ ọrụ ahụ bụ otu n'ime ndị kasị ukwuu na Naịjirịa n'ihe gbasara ihe onwunwe, mbịnye ego, nkwụnye ego na netwọk alaka; ihe a rụzuru site na usoro siri ike nke ogologo oge iji nye ndị ahịa ngwọta na-enye ọrụ ndị na-arụsi ọrụ ike na ọrụ ọhụrụ site na Banking, Payments, Lending, na Insurance na Pension Assets.

Access Bank bụ ugbu a otu n'ime ụlọ akụ ise kachasị elu na Naịjirịa ma nọrọ n'etiti ụlọ akụ narị ise kachasị elu n'ụwa dịka akụkọ 2015 nke magazin The Banker si kwuo ma na-achọ ịbụ ụlọ akụ kachasị elu n"Africa. Ọ na-ejere ihe karịrị mmadụ isi isii nde ise ozi ugbu a, site na alaka narị atọ na iri ise na ihe karịrị ATM otu puku na narị ise na nnukwu ebe gafee Naịjirịa, Sub-Saharan Africa na UK.[4]

Dị ka otu n'ime ndị isi ụlọ akụ ụlọ ọrụ Naịjirịa, o nyere aka mepụta ụfọdụ nnukwu ụlọ ọrụ nke Afrịka na iwu ụlọ, nkwukọrịta, ọkụ eletriki na mmanụ ọkụ site na ihe nlereanya pụrụ iche, nke na-gụnye nghọta na inye nkwado ego na nka. Ọrụ ya na ọrụ ego gafere ihe karịrị afọ iri abụọ na ise gụnyere ihe karịrị afọ zomi dị ka osote onye isi nchịkwa.

Wigwe jere ozi dị ka Onye isi oche nke Access Bank Ghana Limited, Access Investment & Securities Limited, Central Securities and Clearing System (CSCS) ma bụrụkwa Onye isi oche ugbu a nke Access Bank (UK) Limited.[5] Ọ bụ onye otu ụlọ ọrụ Nigerian Mortgage Refinance Company na onye otu ndụmọdụ maka ndị enyi Africa. Ọ bụ onye otu Institute of Chartered Accountants of Nigeria (ICAN ̆ FCA), onye otu Institute nke Credit Administration, na onye otu nsọpụrụ nke Chartered Institute of Bankers of Nigeria.

Herbert Wigwe n'ọfịs ya na isi ụlọ akụ Access, Lagos

Kemgbe onwa Jenụwarị nke afọ 2014, ọ bụ onye isi oche na onye isi nchịkwa nke Access Bank.

O nweela okwu mkparịta ụka n'ụwa niile gụnyere n'oge na-adịbeghị anya na Silicon Valley na Financial Times Summit na Mozambique.[6][7][8]

N'afọ 2016, Wigwe guzobere 'The HOW Foundation', otu na-enweghị uru.[9]

Onyinye na ihe ndị ọ rụzuru[dezie | dezie ebe o si]

N'okpuru Wigwe, Access Bank enwetala ọtụtụ onyinye. N'afọ 2016, ọ meriri Ụlọ akụ kachasị Mma nke afọ ahụ na Onye isi ụlọ ọrụ kachasị mma nke afọ ahụ n'ihe nrite BusinessDay Ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ akụ na Legos.[10] O nwetakwara ihe nrite atọ dị elu nke ndị na-arụ ọrụ n'ụlọ akụ n'Afrika kwa afọ maka "Ịdịgide Azụmahịa Pụrụ Ịche" n'afọ 2016, ihe nrite nke Karlsruhe Sustainable Finance na Germany, nke mbụ maka ụlọ ọrụ ego Afrịka. Access Bank Plc kwughachiri arụmọrụ ahụ n'afọ 2017 Karlsruhe Sustainable Finance Awards na Germany site n'inweta "Outstanding Business Sustainability Achievement Award".

A kpọrọ Wigwe n'onwe ya Onye ọrụ ụlọ akụ kacha mma n'afọ 2016 iche site na akwụkwọ akụkọ The Sun na Vanguard, abụọ n'ime akwụkwọ akụkọ kachasị ukwuu na Naịjirịa.[11][12]

Ndị Brigade Ụmụ nwoke Naịjirịa[dezie | dezie ebe o si]

Na-iji kwanyere ya ugwu ma kele ya na "ọrụ nlereanya ya na ọha mmadụ na onyinye maka mmepe ndị ntorobịa", Boys' Brigade (BB), wepụtara Herbert Wigwe, dị ka onye nlekọta steeti maka Kansụl steeti Legos n'afọ 2016.[13][14]

N'ọnwa Ọktoba n'afọ 2022, Onye isi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nyere ya nsọpụrụ mba Naijiria nke bụ Commander of the Order of the Niger (CON).[15]

Nzukọ Nzukọ Access[dezie | dezie ebe o si]

Wigwe sonyere n'ịmepụta usoro ndị isi nke a maara dị ka Nzukọ Nweta.[16] Ihe omume a na-eme mgbe ọbụla afọ abụọ gasịrị bụ nzaghachi Access Bankī maka oku zuru ụwa ọnụ maka itinye aka n'ụlọ ọrụ maka ndozi ọtụtụ ihe ịma aka chere ndị mmadụ n'ihu. Kemgbe emeghere ya n'afọ 2013, Nzukọ Access anọgidewo na-etinye ndị isi ụwa site n'ịkpali arụmụka banyere nsogbu nke egwu na ohere dị n'ụwa. Na mbipụta 2013 nke isiokwu ya bụ "Ọchịchị na-adịgide adịgide" , Wigwe gwara George W. Bush, Nicolas Sarkozy na John Kufuor okwu, na-ekwughachi mkpa idu ndú dị na ihe ịga nke ọma mba na ụlọ ọrụ.[17]

Na mbipụta nke afọ 2015, Wigwe kwadoro ndị isi ụwa dịka Steve Wozniak, N. R. Narayana Murthy na José María Figueres, Muhammad Yunus na Ted Souder (Onye isi, Ụlọ ọrụ (Nkọwa) na Google[18][19] maka mkparịta ụka banyere isiokwu ahụ bụ 'Ịbụ Isi n'ime Uwa na-Agbanwe Agbanwe – Ihe dị mkpa na-irụpụta ihe ohụrụ'.

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Wigwe, Access Bank na UNICEF nwere njikọ aka iji nye nkwado maka ụmụaka, ụmụ mgbenye na ndị mba ụwa gbara ọsọ ndụ bata n'akụkụ ugwu nke Naịjirịa. Iji mee ka a mara maka ebumnuche a, ụlọ akụ ahụ na-ahazi asọmpi Access Bank / UNICEF Charity Shield Polo kwa afọ.[20]

N'ọnwa Febụwarị n'afọ 2017, a họpụtara ya dịka onye isi oche nke Nigerian Business Coalition against AIDS (NiBUCCA), atụmatụ nke onwe iji nyere aka kpochapụ HIV / AIDS na Naịjirịa ma kwado ndị bi na ọnọdụ ahụ.[21]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Jenụwarị n"afọ 2015, akwụkwọ akụkọ Naijiria The Punch kọwara ya dị ka "otu n'ime ndị isi ụlọ ọrụ Naijiria". Ọ lụrụ Chizoba Wigwe (née Nuba) ma nwee ụmụ anọ: Chizi, Tochi, Hannah na David.[22][23] Ọ si Ikwerre Local Government Area nke Rivers State, mana ọ na-ebi ma na-arụ ọrụ na Legos. O nwere ụmụnne nwanyị atọ na otu nwanne nwoke: Joyce, Peggy, Stella na Emeka yana ụmụ nwanne nwanyị abụọ: Aleruchi na Zara gụnyere ụmụ nwanne nwanyị anọ: Ruchi, Oj, Chinweike na Obumneke..

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Stocks. Bloomberg.com. Retrieved on 1 August 2017.
  2. Editorial. Officer Profile - Quotes - Reuters.co.in. Reuters India. Archived from the original on 1 August 2017. Retrieved on 1 August 2017.
  3. Thisday Awards 2011 | Thisday Live. Archived from the original on 23 December 2014. Retrieved on 2015-04-03.
  4. From 65th to 4th: how Access Bank climbed the ranks of Nigeria's banks - World Finance. Retrieved on 1 August 2017.
  5. Board Chairman of Access Bank Ghana appointed Group MD/CEO. Retrieved on 1 August 2017.
  6. Herbert Wigwe, Access Bank CEO, Addresses Fintech Audience at Silicon Valley – Financial Technology. Archived from the original on 1 August 2017. Retrieved on 1 August 2017.
  7. Access Bank GMD Herbert Wigwe to speak at Financial Times Summit in Mozambique - BellaNaija. www.bellanaija.com. Retrieved on 1 August 2017.
  8. Access Bank GMD Herbert Wigwe to speak at Financial Times Summit in Mozambique - Bella Naija - Financial News. mozambique.financialsweb.com. Archived from the original on 1 August 2017. Retrieved on 1 August 2017.
  9. Meet Antonia Ally, the Young Founder & CEO of 'The How Foundation' (en-US). onobello.com. Archived from the original on 2021-01-16. Retrieved on 2020-09-04.
  10. Access Bank is Nigeria's Best Bank, Herbert Wigwe is Bank CEO of the year (11 September 2016). Retrieved on 1 August 2017.
  11. The Sun award'll keep me going –Wigwe, Banker of the Year 2016 - The Sun News. sunnewsonline.com. Retrieved on 1 August 2017.
  12. Banker of the year Wigwe: Thriving in adverse circumstances - Vanguard News (1 January 2017). Retrieved on 1 August 2017.
  13. Wigwe's leadership qualities earn him patron Boys' Brigade — Daily Times Nigeria (7 December 2016). Retrieved on 2 August 2017.
  14. Amuche (7 December 2016). Access Bank boss becomes Boy's Brigade patron. Retrieved on 2 August 2017.
  15. FULL LIST: 2022 National Honours Award Recipients The Nation Newspaper (en-US) (2022-10-09). Retrieved on 2022-12-04.
  16. Adiele. Access Conference 2015: Steve Wozniak, Aliko Dangote, Herbert Wigwe, Aigboje Aig-Imoukhuede, Jose-Maria Figueres others attend the second edition. Retrieved on 2 August 2017.
  17. alexsamade (23 April 2014). 2013 Access confab: World leaders unite, set agenda for sustainable leadership. Retrieved on 2 August 2017.
  18. Steve Wozniak, Herbert Wigwe, Governor Ambode, others step out for Access Conference 2015 (PHOTOS) » YNaija (11 December 2015). Retrieved on 2 August 2017.
  19. Herbert Wigwe, Ambode, Steve Wozniak and others step out for Access Conference 2015. Retrieved on 2 August 2017.
  20. Access Bank MD, Herbert Wigwe promises more support for UNICEF, vulnerable children (21 July 2016). Retrieved on 1 August 2017.
  21. Wigwe, Terraz emerge NiBUCCA co-chairman. Retrieved on 1 August 2017.
  22. Herbert Wigwe: Excellence and the Banker extraordinaire - BusinessDay : News you can trust (17 July 2016). Archived from the original on 1 August 2017. Retrieved on 1 August 2017.
  23. Herbert Wigwe's stylish disposition. Archived from the original on 12 May 2015. Retrieved on 1 May 2015.