Hetta Empson

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Hetta Empson
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereHester Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1915, 18 Septemba 1915 Dezie
Ebe ọmụmụKroonstad Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1996, 22 Disemba 1996 Dezie
Dị/nwunyeWilliam Empson Dezie
nwaJacobus Arthur Calais Empson, [William Hendrick] Mogador Empson Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-akpụ ihe ọkpụkpụ, activist, onye ese Dezie
ụdị ọrụ yaart of sculpture Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of the Free State Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Hester Henrietta (Hetta) Crouse Empson (afọ 1915 rụọ afọ 1996) bụ onye South Africa na-akpụ ihe. A kọwara ya dị ka "onye na-ese ihe, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye na-eme njem na onye na-elekọta mmadụ" na akụkọ ọnwụ ya na Times .[1] Ya na di ya William Empson sonyere na otu London bohemian nke gụnyekwara George Orwell, Louis MacNeice, Jill Neville, Fay Weldon, Lewis Wolpert na Kathleen Raine.[2]

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Crouse na Kroonstad, South Africa n'ubochí iri na asatọ n'ọnwa Septemba n'afọ 1915.[1][3] Ọ gara Mahadum Bloemfontein ma gụọ nka na Germany.[1]

Ọ laghachiri South Africa ebe ọ rụrụ ọrụ na akwụkwọ akụkọ. Crouse laghachiri Europe ya na onye ọlụlụ ya n'oge ahụ bụ Rene Graetz [de]. Ógè ọ gara mbà France na Switzerland, ọ gara n'ihu, n'onwe ya gaa England. Ọ nọrọ n'ebe ahụ n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, na-arụ ọrụ dị ka onye ọkwọ ụgbọ oloko wee na British Broadcasting Corporation (BBC). Na BBC, ọ zutere di ya n'ọdịnihu bụ William Empson, onye nkatọ edemede, onye ya na ya nwere ụmụ nwoke abụọ.[1]

Di na nwunye ahụ lụrụ ma kwaga China n'afọ 1947. Ha nọrọ ebe ahụ ruo afọ 1952, ógè ha laghachiri England. William Empson kwagara Sheffield iji kụziere Bekee na Mahadum Sheffield ebe Hetta Empson bi na London.[1]

N'afọ 1956, ọ mụrụ nwa nwoke nke atọ ya na onye ọ hụrụ n'anya, onye na-ede uri bụ Peter Duval Smith .[1][2]

N'afọ 1979, e mere William Empson onye isi ma Hetta ghọrọ Lady Empson.[1] Ọ nwụrụ n'ubochí irí abụọ na abụọ n'ọnwa Disemba n'afọ 1996.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 Papers of Sir William Empson and Hetta, Lady Empson. Archives Hub. Jisc Manchester. Retrieved on 1 July 2018. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "ArchivesHub" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Thorpe. Empson and his several types of infidelity. The Observer. Retrieved on 1 July 2018. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Observer" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 Hetta Empson. RKDartists&. Retrieved on 1 July 2018. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "RKD" defined multiple times with different content