Ibife Alufohai

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ibife Alufohai
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya29 Ọgọọst 1986 Dezie
Ebe ọmụmụCalabar Dezie

Ibife Eugene Alufohai (amụrụ n'abalị iri abụọ na iteghete n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1986) bụ onye Naijiria na-ese onyinyo, onye ọrụ ebere na onye na-eme asọmpi ịma mma nke e chiri okpueze Miss Valentine International n’afo 2010.[1] Ọ bụ onye guzobere Miss Polo International.[2][3]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Alufohai si Abonnema, Rivers Steeti. A mụrụ ya na Calabar, Cross River Steeti ma bụrụ nwa ikpeazụ n'ime ụmụ asaa nke nne na nna ya. Ezinne ụlọ ya kwagara ọtụtụ ebe n'ihi ọrụ nna ya dị ka onye agha, si Kaduna Steeti kwaga Port Harcourt, Rivers Steeti. Site n’afo 1993 ruo afo 1997 ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị, na agụmakwụkwọ sekọndrị na Tantua International Group of Schools site na 1997 ruo 2003. N'afọ 2003, ọ gara Mahadum Madonna, Okija maka agụmakwụkwọ mahadum ya wee gaa Mahadum Port Harcourt, Rivers Steeti n'afọ 2008, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na 2012 na nzere na Clinical psychology. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum, ọ rụrụ ọrụ National Youth Service Corps na Federal Medical Centre Yenagoa, Bayelsa Steeti, ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọkà n'akparamàgwà mmadụ na dịka onye na-arụ ọrụ na ECG site na 2013 ruo 2014.[4]

Egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

Miss Valentine International 2010[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2010, e chiri Alufohai okpueze onye mmeri nke mbipụta 2010 nke Miss Valentine International.

Miss Polo International[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2018, Alufohai malitere Miss Polo International.[5][6] N'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2018, e mere mbipụta mbụ ya na Abuja, Naịjirịa.[7][8] Na 14 Septemba 2019, e mere mbipụta nke abụọ na Dubai, United Arab Emirates.[9][10]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Alufohai lụrụ di ma nwee nwa nwanyị.[11] Dị ka akụkụ nke ọrụ ebere ya, ọ malitere Polo International Relief Foundation.[12]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Abraham (19 April 2019). World Fashion Festival Awards Honours Director of Polo International. Leadership Newspaper. Retrieved on 18 November 2019.
  2. Abuja hosts 2018 ‘Miss Polo International’. Vanguard Newspaper (16 August 2018). Retrieved on 18 November 2019.
  3. Oyeyemi (28 August 2018). Nigeria fast becoming destination of choice for tourists- Minister. Federal Ministry of Information and Culture. Retrieved on 18 November 2019.
  4. About The President – Polo International. Polointernational.org. Archived from the original on 12 August 2020. Retrieved on 18 November 2019.
  5. Opoola (28 August 2018). FG moves to attract tourists with new policies. Daily Trust. Archived from the original on 11 August 2019. Retrieved on 18 November 2019.
  6. Nwanne (1 September 2018). Visa on arrival policy is making Nigeria destination of choice. The Guardian Nigeria. Retrieved on 18 November 2019.
  7. Nigeria safe and hospitable – Polo Pageants. P.M. News (27 August 2018). Retrieved on 18 November 2019.
  8. Uti Nwachukwu and Pooja to host the Miss Polo International in Abuja. BellaNaija (27 August 2018). Retrieved on 18 November 2019.
  9. Precious Okoye set to represent Nigeria at Miss Polo International 2019. Punch Newspapers (11 September 2019). Retrieved on 18 November 2019.
  10. Oyeyemi (27 August 2018). PHOTO NEWS: COURTESY CALL ON HMIC ALH. LAI MOHAMMED BY ORGANISERS AND BEAUTY QUEEN OF MISS POLO INTERNATIONAL TV SHOW. Federal Ministry of Information and Culture. Retrieved on 18 November 2019.
  11. About The Founder – Pir Foundation. Pirfoundation.org. Archived from the original on 2 March 2021. Retrieved on 18 November 2019.
  12. Idhe (17 November 2019). Miss Polo International Queens Arrive Nigeria Ahead of Charity Fund Raising. Talk of Naija. Retrieved on 18 November 2019.