Ibrahim Eltayeb

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ibrahim Eltayeb
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
aha n'asụsụ obodoEltayeb Dezie
aha ezinụlọ yaIbrahim Dezie
Ebe ọmụmụSudan Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Bekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeArabic, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụmathematician Dezie
ụdị ọrụ yaapplied mathematics Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie

Ibrahim Abdelrazzak Eltayeb (Àtụ:Lang-ar) bụ onye Sudan gụrụ mgbakọ na mwepụ na ọkammụta nke applied mathematics na Mahadum Nizwa na Oman. Ọ bụ onye òtù African Academy of Sciences, Royal Astronomical Society, The World Academy of Sciences (TWAS) na Royal Society of Edinburgh.

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Eltayeb n'obodo nta dị n'osimiri Nile, ihe dị ka kilomita 500 n'ebe ugwu Khartoum na Sudan, bụ ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ gọọmentị.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ na United Kingdom n'usoro Agụmakwụkwọ n'efu wee nweta nzere BSc n'isi ọmụmụ mgbakọ na mwepụ site na Mahadum London n'afọ 1968. N'afọ 1972, o nwetara nzere PhD na mgbakọ na mwepụ na Mahadum Newcastle on Tyne.[2][1]

Ọrụ na Ime Nnyocha Ya[dezie | dezie ebe o si]

Eltayeb malitere dị ka onye nkuzi na Mahadum Khartoum n'afọ 1972, e wee bugoo ya n'ọ́kwá ka ọ bụrụ ọkammụta n'afọ 1980. Ọ jere ozi dị ka onye isi ngalaba mgbakọ na mwepụ nke Mahadum ahụ site na 1982 ruo 1984. Na 1986, ọ gafere na Mahadum Sultan Qaboos na Oman, bụ ebe o guzobere Ngalaba Mathematics and Computing ma duzie ya site na 1988 ruo 1998. Mgbe nke a gasịrị, ọ jere ozi dịka Ọkammụta nke mgbakọ na mwepụ na Mahadum Nizwa na Oman.[3]

Eltayeb ebipụtala ihe karịrị akwụkwọ iri ise n'akwụkwọ akụkọ, ọkachasị na ngalaba geophysics, geomagnetism, na aeronomy. O mebekwara ụdị mgbakọ na mwepụ na ụzọ maka ịmụ Ime ime ụwa.[2]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Eltayeb dịka onye òtù African Academy of Sciences n'afọ 1986, Royal Astronomical Society nke London n'afọ 1988, The World Academy of Sciences (TWAS) n'afọ 1996, na Royal Society of Edinburgh n'afọ 2012.[1] O nwetara ihe nrite TWAS Prize n'isi ọmụmụ mgbakọ na mwepụ n'afọ 1995 nakwa ihe nrite COMSTECH Award n'isi ọmụmụ mgbakọ na mwepụ Mathematics n'afọ 2007.[2][4][1] Ọ rụrụ ọrụ na kọmitii ezege nke International Association of Geomagnetism and Aeronomy (IAGA) site n'afọ 1991 ruo 1999 ma bụrụ onyeisi ndị ọkà mmụta sayensị nkewa I nke IAGA na internal fields na secular variation site n'afọ 1999 ruo 2003. Ọ bụ onye otu kansụl nke Study of the Earth's Deep Interior (SEDI) kemgbe 1987 ma nọrọ na kọmitii n'ahụ maka ihe nrite n'isi ọmụmụ mgbakọ na mwepụ mba nke TWAS site na 1998 ruo 2006.[2]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Template error: argument title is required.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  3. Prọfesọ Ibrahim Eltayeb.
  4. Àtụ:Cite webụ

External links[dezie | dezie ebe o si]