Ibukun Awosika

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ibukun Awosika
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereIbukun Dezie
aha ezinụlọ yaAwosika Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Disemba 1962 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
Dị/nwunyeAbiodun Dezie
Asụsụ obodoNdi Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego, motivational speaker, onye ọrụ ụlọ akụ, Odee akwụkwọ Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Ụlọ akwụkwọ Lagos Business School, University of Navarre, IESE Business School, Methodist Girls' High School Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1989 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
webụsaịtịhttp://ibukunawosika.org Dezie

Ibukunoluwa Abiodun Awosika (nee Bilkisu Abiodun Motunrayo Omobolanle Adekola onye nke a mụrụ na ụbọchị iri abụọ na anọ na ọnwa nke Disemba na aho 1962) bu nwanyi Nigeria onye na azu ahia, onye nekwu okwu na agba ume ya'na onye edemede akwukwo . Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka Onye isi oche nke ụlọ akụ First Bank of Nigeria . [1]

Mmalite ndu na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya dịka nwa nke atọ n'ime ụmụ asaa na Ibadan isi obodo Oyo State. Ibukun gụsịrị agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị na St. Pauls African Church Primary School, Lagos na Methodist Girls 'High School, Yaba tupu ya aga University nke Ife (nke akpọgharịrị aha Obafemi Awolowo University ) ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nweta asambodo B.Sc na kemistri . [2] O nwekwara asambodo elu maka ndi gụsịrị akwụkwọ mahadum nke mbụ na nke abụọ, ya na asambodo MBA nke ọnwetara mgbe ọmechara ọtụtụ agụmakwụkwọ gbasara azụmaahịa na Lagos Business School na IESE Business School - Mahadum nke Navarra . [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ na-arụ ọrụ mmanye otu afọ iji ijere obodo ya ozi - National Youth Service Corps Ibukun rụrụ ọrụ dị ka onye na amụ ọrụ nyocha na Akintola Williams & Co. N'ihi ịhụnanya o nwere maka ije ịhazi ụlọ ọbido kwara ọrụ na Alibert Nigeria Ltd. dị ka onye njikwa ihe ngosi. [4] [5] N’ịchọ ịnọrọ onwe ya, o hibere ụlọ ọrụ na-arụpụta ngwa ahia oche, akwa na ihe ndi ọzọ ana-akpọ Quebees Limited n’afọ 1989 tupu ebe ọrụ ahụ agbanwe aha za wa The Chair Center Limited ma mechaa gbanwe aha ọzọkwa buru zia SOKOA Chair Center Limited. Nke mere mgbe ejikọrọ ya na SOKOA SA [6] site na Guaranty Trust Bank na afọ 2004. [7]

Ibukun bụ otu onye Otu African Leadership Initiative na Aspen Global Leadership Network. Ọ bụ kwa onye otu ndi Economic Summit Group, kọmitii nke Nigerian Sovereign Wealth Fund na onye isi oche mbụ, ma buru kwa onye otu ndị nlekọta Women in Management, Business and Public Service . [8] [9] Na afọ 2011, o guzobere ebe a na-azụ ndị gụchara mahadum ka ha wee nweta ọrụ akpọrọ Afterschool Graduate Development Centre na Nigeria. [7]

Na ọnwa Septemba, ụbọchị nke asaa na afọ 2015, Ibukun ghọrọ nwanyị izizi nke a họpụtara dịka onye isi oche nke First Bank of Nigeria mgbe Prince Ajibola Afonja tinyere akwụkwọ arụkwaghịm. [8] [10]

Ibukun Awosika bu onye otu ndị nlekọta IESE’s International Advisory Board (IAB). [11] Ọ sokwa na otu ndị nlekọta Digital Jewel Limited na Cadbury Nig Plc. [12]

Onye ama ama site n'aka ndị mgbasa ozi[dezie | dezie ebe o si]

Igwe onyonyo[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2008, Ibukun so na mmadụ ise ndị na-achụ nta ego na Naịjirịa ndị pụtara na mbipụta mbụ nke usoro ihe omume nke Dragon Den na Africa. Ọ na-ewube ihe mmemme TV a na-akpọ Business His Way. O tinyekwara aka ma sokwa mee ihe nkiri "Citation" na afọ 2020 n'akụkụ Temi Otedola. Kunle Afolayan bukwa onye mepụtara ihe nkiri ahụ. [13]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

  • The "Girl" Entrepreneurs
  • Business His Way

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ibukun Awosika luru Abiodun Awosika nke ya na ya nwere umu ato.